Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Zekaraya 12:1-14

12  Ozi gbara ọkpụrụkpụ: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru banyere Izrel,” ka Jehova kwuru, bụ́ Onye setịrị eluigwe,+ onye tọkwara ntọala ụwa+ ma mee mmụọ+ nke dị n’ime mmadụ.  “Lee, ana m eme ka Jeruselem+ bụrụ ọkwá nke na-eme ka ndị niile gbara ya gburugburu ṅagharịa;+ a ga-anọchibido Juda, nọchibidokwa Jeruselem.+  Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ+ na m ga-eme ka Jeruselem bụrụ nkume dị arọ+ nye ndị niile. Ọ ghaghị ịkawasị ndị niile buliri ya ahụ́; mba niile nke ụwa ga-ezukọta imegide ya.+  N’ụbọchị ahụ,”+ ka Jehova kwuru, “m ga-eme ka ịnyịnya+ ọ bụla nọrọ ná mgbagwoju anya, meekwa ka onye na-agba ya gbaa ara;+ m ga-eme ka anya m dị n’ebe Juda nọ,+ m ga-emekwa ka ịnyịnya niile nke ndị dị iche iche kpuo ìsì.  Ndị isi+ Juda ga-ekwu n’obi ha, sị, ‘Ndị bi na Jeruselem bụ ike anyị nke sitere n’aka Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ́ Chineke ha.’+  N’ụbọchị ahụ, m ga-eme ka ndị isi Juda dị ka ite nke ọkụ juru n’ime ya n’ọhịa,+ meekwa ka ha dị ka ọwa na-enwu ọkụ nke e sonyere n’ùkwù ọka* e gbutere ọhụrụ,+ ha ga-erepịa ndị niile nọ n’aka nri nakwa n’aka ekpe gbaa gburugburu;+ ndị Jeruselem ga-ebikwa n’obodo ha bụ́ Jeruselem.+  “Jehova ga-ebukwa ụzọ zọpụta ụlọikwuu nke Juda, ka ịma mma nke ụlọ Devid na ịma mma nke ndị bi na Jeruselem wee ghara ịdị ukwuu karịa nke Juda.  N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-abụ ihe nchebe gburugburu ndị bi na Jeruselem;+ onye ọ bụla n’ime ha nke na-ada ada ga-esi ike n’ụbọchị ahụ dị ka Devid,+ ụlọ Devid ga-adịkwa ike dị ka chi;+ dị ka mmụọ ozi Jehova nke na-ebutere ha ụzọ.+  Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na m ga-ahụ na m lara mba niile na-ebuso Jeruselem agha n’iyi.+ 10  “M ga-awụsa ụlọ Devid, wụsakwa ndị bi na Jeruselem mmụọ amara+ na nke arịrịọ,+ ha ga-elegide anya n’Onye ahụ ha mara ube,+ ha ga-etikwara Ya mkpu arịrị otú a na-eti n’ihi ọnwụ nke nwa nwoke a mụrụ naanị ya; ha ga-akwara ya ákwá arịrị dị ilu dị ka mgbe a na-akwa ákwá arịrị dị ilu n’ihi ọnwụ nke nwa e bu ụzọ mụọ.+ 11  N’ụbọchị ahụ, mkpu arịrị a ga-eti na Jeruselem ga-adị ukwuu, dị ka mkpu arịrị e tiri na Hedadrimọn nke dị na ndagwurugwu* Megido.+ 12  Ala ahụ ga-akwa ákwá arịrị,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ; ezinụlọ Devid naanị ya, ndị inyom ya naanị ha;+ ezinụlọ Netan+ naanị ya, ndị inyom ya naanị ha; 13  ezinụlọ Livaị+ naanị ya, ndị inyom ya naanị ha; ezinụlọ Shimiaị+ naanị ya, ndị inyom ya naanị ha; 14  ezinụlọ niile fọdụrụnụ, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, na ndị inyom ha naanị ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali
Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mbara ala nke dị na ndagwurugwu.”