Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 87:1-7

Abụ ọma ụmụ Kora. Abụ olu ụtọ, abụ. 87  Ntọala ya dị n’ugwu nsọ.+   Jehova hụrụ ọnụ ụzọ ámá niile nke Zayọn n’anya+ Karịa ụlọikwuu niile nke Jekọb.+   A na-ekwu okwu otuto banyere gị, gị obodo ezi Chineke.+ Sila.   M ga-agụnye Rehab+ na Babịlọn+ ná ndị maara m; Lee Filistia+ na Taya, ha na Kush: “A mụrụ nke ọ bụla n’ime ha n’ebe ahụ.”+   A ga-ekwukwa banyere Zayọn, sị: “N’ime ya ka a mụrụ nke ọ bụla n’ime ha.”+ Onye Kasị Elu+ ga-emekwa ka o guzosie ike.+   Mgbe Jehova ga na-edeba aha ndị dị iche iche n’akwụkwọ, ọ ga-ekwu, sị:+ “A mụrụ nke ọ bụla n’ime ha n’ebe ahụ.”+ Sila.   A ga-enwekwa ndị na-agụ egwú na ndị na-ete egwú a na-agba gburugburu na-ete,+ bụ́ ndị na-asị: “Isi iyi m niile dị n’ime gị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji