Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 84:1-12

Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Gitit.+ Abụ ọma ụmụ Kora. Abụ olu ụtọ. 84  Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ Lee ka m si hụ ụlọikwuu gị dị ebube n’anya!+   Agụụ ogige ụlọ Jehova agụkatala mkpụrụ obi m ike gwụ ya.+ Mkpụrụ obi m na anụ ahụ́ m na-etiku Chineke dị ndụ mkpu ọṅụ.+   Jehova nke ụsụụ ndị agha, Eze m na Chineke m, Ọbụna nnụnụ enwetawo ebe obibi, Elekentịọba kpakwara akwụ́, Ná nnukwu ebe ịchụàjà gị, bụ́ ebe o debeworo ụmụ ya!   Obi ụtọ na-adịrị ndị bi n’ụlọ gị!+ Ha ka na-eto gị.+ Sila.   Obi ụtọ na-adịrị ndị ị bụ ike ha,+ Ndị obi ha dị n’ụzọ e si aga n’ụlọ gị.+   Mgbe ha na-agabiga na ndagwurugwu osisi beka,+ Ha na-eme ka ọ ghọọ isi iyi; Onye ozizi ha+ ji ngọzi na-ekpuchi onwe ya.   Ha ga na-eje ije ma na-enwewanye ike;+ Onye nke ọ bụla na-abịa n’ihu Chineke n’ime Zayọn.+   Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, biko, nụrụ ekpere m;+ Ṅaa ntị, Chineke Jekọb.+ Sila.   Chineke, bụ́ ọta anyị, biko, hụrụ,+ Lee onye i tere mmanụ anya n’ihu.+ 10  N’ihi na otu ụbọchị n’ogige gị dị mma karịa otu puku ụbọchị n’ebe ọzọ.+ Ahọrọwo m iguzo n’ọnụ ụzọ ụlọ Chineke m+ Karịa ịgagharị n’ụlọikwuu ajọ omume.+ 11  N’ihi na Jehova Chineke bụ anyanwụ+ na ọta;+ Ọ na-emekwa ka mmadụ nweta ihu ọma na ebube.+ Jehova agaghị ajụ inye ndị na-eje ije n’enweghị ntụpọ ihe ọ bụla bụ́ ihe ọma.+ 12  Jehova nke ụsụụ ndị agha, obi ụtọ na-adịrị onye tụkwasịrị gị obi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji