Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 83:1-18

Abụ. Abụ olu ụtọ Esaf.+ 83  Chineke, biko, agbala nkịtị;+ Emechila ọnụ, anọla jụụ, gị Chineke.+   N’ihi na, lee! ndị iro gị nọ n’ọgba aghara;+ Ndị kpọrọ gị asị nke ukwuu eweliwo isi ha elu.+   Ha ji aghụghọ na-agbara ndị gị izu;+ Ha na-agbakwara ndị gị e zobere ezobe izu.+   Ha asịwo: “Bịanụ ka anyị kpochapụ ha ka ha ghara ịbụkwa mba,+ Ka a gharakwa icheta aha Izrel ọzọ.”+   N’ihi na ha ejiriwo otu obi gbaa izu;+ Ha wee gbaa ndụ imegide gị,+   Ụlọikwuu Idọm+ na ndị Ishmel, Moab+ na ndị Hega,+   Gibal na Amọn+ na Amalek, Filistia+ tinyere ndị bi na Taya.+   Asiria esonyewokwara ha;+ Ha aghọworo ụmụ Lọt ogwe aka.+ Sila.   Mee ha ihe i mere Midian,+ ihe i mere Sisera,+ Ihe i mere Jebin+ n’iyi ndagwurugwu Kaịshọn.+ 10  A lara ha n’iyi n’En-dọọ;+ Ha ghọrọ nri ala.+ 11  Mee ndị ha a ma ama ihe i mere Oreb na Zieb,+ Meekwa ndị isi ha niile ihe i mere Ziba na Zalmọna,+ 12  Bụ́ ndị sịrị: “Ka anyị weghara ebe obibi Chineke.”+ 13  Chineke m, biko, mee ka ha dị ka ogwu nke ifufe bu na-agba gburugburu,+ Dị ka ahịhịa nke ifufe na-ebugharị.+ 14  Dị ka ọkụ nke na-agba oké ọhịa+ Nakwa dị ka ire ọkụ nke na-ere ugwu,+ 15  Si otú ahụ jiri oké ifufe chụọ ha ọsọ,+ Jirikwa ifufe mmiri gị kowe ha obi n’elu.+ 16  Jehova, biko, mee ka ihere ju ha ihu,+ Ka ndị mmadụ wee chọọ aha gị.+ 17  Biko, ka ihere mee ha, ka obi gharakwa iru ha ala mgbe ọ bụla,+ Ka e mechuo ha ihu, ka ha laakwa n’iyi;+ 18  Ka ndị mmadụ wee mara+ na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova,+ Ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu+ n’ụwa niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji