Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 63:1-11

Abụ olu ụtọ Devid, mgbe ọ nọ n’ala ịkpa Juda.+ 63  Chineke, ị bụ Chineke m, m na-achọsi gị ike.+ Agụụ gị na-agụ mkpụrụ obi m.+ Agụụ gị emewo ka ike gwụ anụ ahụ́ m N’ala kpọrọ nkụ nke ihe na-adịghị, n’ebe mmiri na-adịghị.+   N’ihi ya, ahụwo m gị n’ebe nsọ,+ Mgbe m hụrụ ike gị na ebube gị.+   N’ihi na obiọma gị dị mma karịa ndụ,+ Egbugbere ọnụ m ga-aja gị mma.+   N’ihi ya, m ga-agọzi gị ụbọchị ndụ m niile;+ M ga-agbasa ọbụ aka m n’aha gị.+   Afọ ejuwo mkpụrụ obi m dị ka à ga-asị na o riri ihe kasị mma, nke makwara abụba,+ Ọnụ m ji egbugbere ọnụ nke na-eti mkpu ọṅụ na-eto gị.+   Mgbe m chetara gị n’elu ihe ndina m,+ N’oge nche abalị, m na-atụgharị uche banyere gị.+   N’ihi na i nyeworo m aka,+ Ọ bụkwa na ndò nku gị ka m na-eti mkpu ọṅụ.+   Mkpụrụ obi m na-esochi gị anya;+ Aka nri gị jidesiri m ike.+   Ma ndị na-achọ mkpụrụ obi m ka ha bibie ya,+ Ha ga-aba n’ime ala.+ 10  A ga-enyefe ha n’aka mma agha;+ Ha ga-aghọ òkè e kenyere nkịta ọhịa.+ 11  Eze ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Chineke.+ Onye ọ bụla nke na-eji ya aṅụ iyi ga na-anya isi,+ N’ihi na a ga-emechi ọnụ ndị na-ekwu okwu ụgha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji