Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 6:1-10

Ntụziaka e nyere onye nduzi. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya n’ụda dị ala.+ Abụ olu ụtọ Devid. 6  Jehova, biko, abarala m mba n’iwe,+ Ejikwala ọnụma gbazie m.+   Jehova, biko, meere m amara, n’ihi na ike na-agwụ m.+ Jehova, gwọọ m,+ n’ihi na ọkpụkpụ m na-ama jijiji.   Ee, mkpụrụ obi m ezughị ike ma ọlị;+ Jehova—ọ̀ bụ ruo ole mgbe?+   Jehova, biko, laghachite+ napụta mkpụrụ obi m;+ Zọpụta m n’ihi obiọma* gị.+   N’ihi na onye nwụrụ anwụ adịghị akpọ aha gị;+ Ònye ga-eto gị n’ime Shiol?+   Ude m na-asụ emewo ka ike gwụ m;+ N’ogologo abalị dum, m na-eme ka ihe ndina m dee mmiri;+ M na-eme ka ihe ndina m jupụta n’anya mmiri m.+   Anya m adịkwaghị ahụcha ụzọ n’ihi iru uju,+ Ọ kawo nká n’ihi ndị niile na-ebuso m iro.+   Pụọnụ n’ebe m nọ, unu niile ndị na-eme ihe ọjọọ,+ N’ihi na Jehova ga-anụ olu ákwá m.+   Jehova ga-anụ arịrịọ m na-arịọ ka o meere m amara;+ Jehova ga-anabata ekpere m.+ 10  Ihere ga-emegbu ndị iro m niile,+ ha ga-amakwa jijiji; Ha ga-alaghachi azụ, ihere ga-eme ha ozugbo.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 6:4*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”