Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 4:1-8

Ntụziaka e nyere onye nduzi. A ga-eji ụbọ akwara+ kpọọ ya. Abụ olu ụtọ Devid. 4  Mgbe m kpọkuru gị, biko, za m, Chineke m bụ́ onye ezi omume.+ N’oge ahụhụ, meere m ohere sara mbara. Meere m amara,+ nụkwa ekpere m.   Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga na-akpụ ùgwù m+ n’ala, Ebe unu nọ na-ahụ ihe efu n’anya, Ebe unu nọ na-achọ okwu ụgha? Sila.   Ya mere, maranụ na Jehova ga-emeso onye na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ+ mmeso pụrụ iche; Jehova ga-anụ mgbe m kpọkuru ya.+   Weenụ iwe, ma unu emehiela.+ Kwuonụ ihe unu chọrọ ikwu n’ime obi unu, n’elu ihe ndina unu,+ ma gba nkịtị. Sila.   Chụọnụ àjà ezi omume,+ Tụkwasịkwanụ Jehova obi.+   E nwere ọtụtụ ndị na-ajụ, sị: “Ònye ga-eme ka anyị hụ ihe ọma?” Jehova, biko, mee ka ìhè si n’ihu gị nwukwasị anyị.+   Mee ka obi m ṅụrịa ọṅụ+ Karịa ọṅụ ha na-enwe mgbe ọka* na mmanya ọhụrụ ha dị ukwuu.+   M ga-edina ala hie ụra n’udo,+ N’ihi na ọ bụ naanị gị, Jehova, na-eme ka m nọrọ n’obi iru ala.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 4:7*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.