Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 18:1-50

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma Devid, bụ́ ohu Jehova, bụ́ onye gwara Jehova okwu dị n’abụ a n’ụbọchị Jehova napụtara ya n’ọbụ aka ndị iro ya niile nakwa n’aka Sọl.+ O wee sị: 18  M ga-ahụ gị n’anya nke ukwuu, Jehova bụ́ ike m.+   Jehova bụ nkume m dị elu na ebe m e wusiri ike na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ.+ Chineke m bụ oké nkume m. M ga-agbaba n’ime ya,+ Ọta m na mpi nzọpụta m, bụ́ ebe m dị elu nke e wusiri ike.+   M ga-akpọku Jehova, bụ́ onye e kwesịrị inye otuto,+ A ga-azọpụtakwa m n’aka ndị iro m.+   Ụdọ ọnwụ gbara m gburugburu;+ Oké idei mmiri nke ndị na-abaghị n’ihe nọkwa na-emenye m ụjọ.+   Ụdọ Shiol gbara m gburugburu;+ Ọnyà ọnwụ chere m ihu.+   N’oge m nọ n’ahụhụ, m nọ na-akpọku Jehova, Ọ bụkwa Chineke m ka m nọ na-etiku maka enyemaka.+ O wee nọrọ n’ụlọ nsọ ya nụ olu m,+ Mkpu enyemaka m tiri n’ihu ya wee ruo ya ntị.+   Ụwa wee malite ịṅagharị na ịma jijiji,+ Ntọala nke ugwu dị iche iche mekwara mkpatụ,+ Ha nọkwa na-aṅagharị ihu na azụ n’ihi na a kpasuru ya iwe.+   Anwụrụ ọkụ si n’oghere imi ya kwụgoo, ọkụ nke si ya n’ọnụ nọkwa na-erepịa ihe;+ Icheku ọkụ sikwa n’ebe ọ nọ na-apụta.   O wee bịada eluigwe gbadata.+ Oké ọchịchịrị dịkwa n’okpuru ụkwụ ya. 10  Ọ nọkwa n’elu cherọb fere bịa,+ Ọ nọkwa n’elu nku otu mmụọ fere bịa ọsọ ọsọ.+ 11  O wee mee ka ọchịchịrị bụrụ ebe ọ na-ezo,+ Meekwa ka mmiri rujuru eruju na ígwé ojii Gbaa ya gburugburu dị ka ụlọ ndò ya.+ 12  Ígwé ojii ya sikwa n’ìhè dị n’ihu ya gafere,+ Akụ́ mmiri ígwé na icheku ọkụ sikwa n’ígwé ojii zoo.+ 13  Jehova wee nọrọ n’eluigwe malite ibigbọ,+ Onye Kasị Elu malitekwara ime ka a nụ olu ya,+ Akụ́ mmiri ígwé na icheku ọkụ wee na-ezo. 14  O wee na-agbapụ akụ́ ya, ka o wee chụsaa ha;+ O mekwara ka àmụ̀mà gbuo, ka o wee tinye ha n’ọgba aghara.+ 15  E wee malite ịhụ ala mmiri anya,+ E kpughekwara ntọala nke elu ala+ Site n’ịba mba gị, Jehova, site n’ume nke si n’oghere imi gị.+ 16  O si n’elu matịa aka ya kpọrọ m,+ Ọ dọpụtara m ná nnukwu mmiri.+ 17  Ọ napụtara m n’aka onye iro m dị ike,+ Nakwa n’aka ndị kpọrọ m asị; n’ihi na ha ka m ike.+ 18  Ha nọ na-emegide m n’ụbọchị m nwere ọdachi,+ Ma Jehova ghọrọ onye na-akwado m.+ 19  O wee kpọpụta m kpọba m n’ebe sara mbara;+ Ọ napụtara m, n’ihi na ihe m masịrị ya.+ 20  Jehova na-akwụ m ụgwọ dị ka ezi omume m si dị;+ Ọ bụkwa dị ka aka m si dị ọcha ka ọ na-akwụ m ụgwọ.+ 21  N’ihi na edebewo m ụzọ Jehova,+ Emeghịkwa m omume ọjọọ nke bụ́ ịhapụ Chineke m.+ 22  N’ihi na mkpebi ikpe ya niile dị n’ihu m,+ M gaghịkwa ewepụ ụkpụrụ ya n’ebe m nọ.+ 23  M ga-abụ onye na-enweghị ntụpọ n’ebe ọ nọ,+ Mụ onwe m ga-ezerekwa njehie.+ 24  Ka Jehova kwụọ m ụgwọ dị ka ezi omume m si dị,+ Dị ka aka m si dị ọcha n’ihu ya.+ 25  Onye na-eguzosi ike n’ihe ka ị ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe;+ Ị ga-emeso onye na-enweghị ntụpọ, bụ́ dimkpa, ihe n’ụzọ na-enweghị ntụpọ;+ 26  Ị ga-egosi onye na-edebe onwe ya ọcha na ị dị ọcha;+ Ị ga-egosikwa onye gbagọrọ agbagọ na ị dị akọ;+ 27  N’ihi na gị onwe gị ga-azọpụta ndị nọ n’ahụhụ;+ Ma ị ga-eweda anya dị mpako ala.+ 28  N’ihi na gị onwe gị, Jehova, ga-amụnye oriọna m;+ Ọ bụ Chineke m ga-eme ka ìhè nwuo n’ọchịchịrị m.+ 29  N’ihi na site n’enyemaka gị, m pụrụ ịchụ ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ọsọ;+ Site n’enyemaka gị Chineke m, m pụrụ ịrịgo mgbidi.+ 30  Ezi Chineke, ụzọ ya zuru okè;+ Okwu Jehova bụ okwu a nụchara anụcha.+ Ọ bụụrụ ndị niile na-agbaba n’ime ya ọta.+ 31  N’ihi na ònye bụ Chineke ma e wezụga Jehova?+ Ònyekwa bụ oké nkume ma e wezụga Chineke anyị?+ 32  Ọ bụ ezi Chineke kere m ike n’úkwù,+ Ọ ga-emekwa ka ụzọ m zuo okè,+ 33  Meekwa ka ụkwụ m na-awụ ọsọ dị ka ụkwụ nne ele,+ Ọ na-emekwa ka m guzoro n’ebe dịịrị m elu.+ 34  Ọ na-akụziri aka m otú e si ebu agha,+ Ogwe aka m ekwewo ụta ọla kọpa.+ 35  Ị ga-enyekwa m ọta nzọpụta gị,+ Aka nri gị ga-akwado m,+ Ịdị umeala n’obi gị ga-emekwa ka m dị ukwuu.+ 36  Ị ga-emere m ohere sara mbara nke ga-aba ụkwụ m,+ Nkwonkwo ụkwụ m agaghịkwa ama jijiji.+ 37  M ga-achụ ndị iro m ọsọ wee chụkwuru ha; M gaghịkwa alaghachi azụ ruo mgbe e kpochapụrụ ha.+ 38  M ga-etipịasị ha ka ha wee ghara inwe ike ibili;+ Ha ga-ada, mụ azọọ ha ụkwụ.+ 39  Ị ga-eke m ike n’úkwù maka ibu agha; Ị ga-eme ka ndị na-ebili imegide m daa n’okpuru m.+ 40  Ị ga-eme ka ndị iro m gbaa ọsọ;+ M ga-ebibi ndị kpọrọ m oké asị.+ 41  Ha na-eti mkpu enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha,+ Ha na-etiku Jehova, ma ọ dịghị aza ha.+ 42  M ga-asụri ha ka ha dị ka uzuzu nke ifufe na-ebu;+ M ga-awụpụ ha dị ka apịtị okporo ámá.+ 43  Ị ga-emere m ụzọ m ga-esi gbanahụ nkatọ ndị mmadụ.+ Ị ga-eme m onyeisi nke mba dị iche iche.+ Ndị m na-amaghị ga-ejere m ozi.+ 44  Ha ga-erubere m isi site n’ihe ha nụrụ naanị n’akụkọ;+ Ndị mba ọzọ ga-eji egwu bịakwute m.+ 45  Ike ga-agwụ ndị mba ọzọ, Ha ga-esi ná mgbidi ha siri ike mara jijiji pụta.+ 46  Jehova dị ndụ,+ ka Oké Nkume m+ bụrụ onye a gọziri agọzi, Ka e buliekwa Chineke nke nzọpụta m elu.+ 47  Ezi Chineke bụ Onye na-abọrọ m ọbọ;+ Ọ na-ewedakwa ndị dị iche iche n’ala n’okpuru m.+ 48  Ọ na-eme ka m gbapụ n’aka ndị iro m iwe ji;+ Ị ga-ebulikwa m elu ka m karịa ndị na-ebili imegide m,+ Ị ga-anapụta m n’aka onye na-eme ihe ike.+ 49  Ọ bụ ya mere m ga-eji too gị, Jehova, n’etiti mba dị iche iche,+ M ga-abụkukwa aha gị abụ olu ụtọ.+ 50  Ọ na-eme ka eze ya nwee nzọpụta dị ukwuu,+ Na-egosikwa onye o tere mmanụ, bụ́ Devid, na mkpụrụ ya, obiọma,*+ Ruo mgbe ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 18:50*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”