Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 16:1-11

Miktam nke Devid. 16  Chineke, biko, chebe m, n’ihi na agbabawo m n’ime gị.+   Asịwo m Jehova: “Ị bụ Jehova; ịdị mma m agaghị abara gị uru,+   Kama ọ ga-abara ndị nsọ nọ n’ụwa uru. Ọ bụ naanị n’ebe ha nọ, ya bụ, n’ebe ndị dị ebube nọ, ka m nwere mmasị.”+   Ndị ọ na-abụ ha hụ chi ọzọ ha esowe ya na-enwe ọtụtụ ihe mgbu.+ M gaghị awụpụ àjà ihe ọṅụṅụ ha ji ọbara achụ,+ Aha ha agaghịkwa adị n’ọnụ m.+   Jehova bụ òkè e kenyere m+ nakwa iko e nyere m.+ Ị na-ejidesiri m òkè m ike.   Ihe ị tụrụ atụ̀ inye m ka ọ bụrụ ihe nketa m dị mma.+ N’ezie, ihe m nwetara dị m mma.   M ga-agọzi Jehova, bụ́ onye nyeworo m ndụmọdụ.+ N’ezie, akụrụ m agbaziwo m n’abalị.+   Emewo m ka Jehova nọrọ n’ihu m mgbe niile.+ N’ihi na ọ nọ m n’aka nri, a gaghị eme ka m maa jijiji.+   Ya mere, obi m na-aṅụrị ọṅụ, ihe niile dị ebube n’ime m na-enwe aṅụrị.+ Anụ ahụ́ m ga-ezukwa ike.+ 10  N’ihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m n’ime Shiol.+ Ị gaghị ekwe ka onye na-eguzosi ike n’ebe ị nọ banye n’olulu.+ 11  Ị ga-eme ka m mara ụzọ ndụ.+ Ịṅụrịju ọṅụ afọ dị n’ihu gị;+ Ịdị mma dị n’aka nri gị ruo mgbe ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji