Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 142:1-7

Maskil. Abụ ọma Devid, mgbe ọ nọ n’ime ọgba.+ Ekpere. 142  Eji m olu m kpọkuo Jehova ka o nyere m aka;+ Eji m olu m malite itiku Jehova ka o meere m amara.+   M nọ na-awụpụ nchegbu m n’ihu ya dị ka mmiri.+ M nọ na-akọ nhụjuanya m n’ihu ya,+   Mgbe ike gwụrụ mmụọ m+ n’ime m. Mgbe ahụ, gị onwe gị maara okporo ụzọ m.+ Ha siiri m ọnyà+ N’ụzọ m si agafe.+   Lee anya n’aka nri hụ Na ọ dịghị onye na-eme ka ọ̀ ma onye m bụ.+ Enwekwaghị m ebe mgbaba;+ Ọ dịghị onye na-ajụ ase mkpụrụ obi m.+   Jehova, akpọkuru m gị ka i nyere m aka.+ Asịrị m: “Ị bụ ebe mgbaba m,+ Bụrụkwa òkè m+ n’ala ndị dị ndụ.”+   Ṅaa ntị n’ákwá m na-ebesara gị,+ N’ihi na ike agwụla m kpamkpam.+ Napụta m n’aka ndị na-akpagbu m,+ N’ihi na ha ka m ike.+   Mee ka mkpụrụ obi m si n’ụlọ mkpọrọ pụta+ Ka m wee too aha gị.+ Ka ndị ezi omume zukọta gburugburu m,+ N’ihi na ị na-emeso m ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji