Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 132:1-18

Abụ Nrịgo. 132  Jehova, biko, cheta mweda niile+ E wedara Devid+ n’ala;   Otú o si ṅụọrọ Jehova iyi,+ Otú o si kwe Dike+ nke Jekọb nkwa, sị:+   “Agaghị m abanye n’ụlọikwuu bụ́ ụlọ m.+ Agaghị m arịgoro n’ihe ndina bụ́ nnukwu ihe ndina m,+   Agaghị m ekwe ka ụra gaa m n’anya,+ Agaghịkwa m ekwe ka anya m nke na-enwu gbaa roo ụra,+   Ruo mgbe m chọtaara Jehova otu ebe,+ Mgbe m chọtaara Dike nke Jekọb nnukwu ụlọikwuu.”+   Lee! Anyị anụwo ya n’Efrata,+ Anyị ahụwo ya n’oké ọhịa.+   Ka anyị bata n’ụlọikwuu ya dị ebube;+ Ka anyị kpọọ isiala n’ebe mgbakwasị ụkwụ ya.+   Jehova, biko, bilie baa n’ebe izu ike gị,+ Gị na Igbe+ nke ike gị.+   Ka ndị nchụàjà gị yiri ezi omume dị ka uwe,+ Ka ndị na-eguzosi ike n’ebe ị nọ tiekwa mkpu ọṅụ.+ 10  Ajụla ige onye i tere mmanụ ntị,+ N’ihi Devid bụ́ ohu gị.+ 11  Jehova aṅụworo Devid iyi,+ N’ezie, ọ gaghị ahapụ imezu ya:+ “M ga-eme ka mkpụrụ nke afọ gị+ Nọkwasị n’ocheeze gị.+ 12  Ọ bụrụ na ụmụ gị edebe ọgbụgba ndụ m+ Na ihe ncheta m ga-akụziri ha,+ Ụmụ ha kwa ga-anọkwasị n’ocheeze gị+ Ruo mgbe ebighị ebi.”+ 13  N’ihi na Jehova ahọrọwo Zayọn;+ Ọ gụsiwo ya agụụ ike ka ọ bụrụ ebe obibi ya, ọ sịrị:+ 14  “Nke a bụ ebe izu ike m ruo mgbe ebighị ebi;+ N’ebe a ka m ga-ebi, n’ihi na ọ gụsiwo m agụụ ike.+ 15  Aghaghị m ịgọzi ihe oriri ya.+ M ga-emekwa ka ihe oriri ju ndị ogbenye bi n’ime ya afọ.+ 16  M ga-eyiwe ndị nchụàjà ya nzọpụta dị ka uwe;+ Ndị ya na-eguzosi ike n’ihe aghaghịkwa iti mkpu ọṅụ. 17  M ga-eme ka mpi Devid pulite n’ebe ahụ.+ Edoworo m onye m tere mmanụ oriọna n’usoro.+ 18  M ga-eyiwe ndị iro ya ihere dị ka uwe;+ Ma okpueze ya+ ga-enwe ihe ịga nke ọma.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji