Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 114:1-8

114  Mgbe Izrel si n’Ijipt pụọ,+ Mgbe ụlọ Jekọb sikwa n’etiti ndị na-ekwu ihe a na-adịghị aghọta aghọta pụọ,+   Juda ghọrọ ebe nsọ ya,+ Izrel ghọkwara ọmarịcha ala ọ na-achị.+   Oké osimiri hụrụ ya gbaa ọsọ;+ Jọdan malitere ịgbaghachi azụ.+   Ugwu ukwu wụliri elu dị ka ebule,+ Ugwu nta wụlikwara elu dị ka ụmụ atụrụ.   Oké osimiri, gịnị mere gị, i ji gbaa ọsọ,+ Jọdan, gịnị mere gị, i ji malite ịgbaghachi azụ?+   Ugwu ukwu, gịnị mere unu, unu ji wụlie elu dị ka ebule;+ Ugwu nta, gịnị mere unu, unu ji wụlie elu dị ka ụmụ atụrụ?+   Ụwa, nọrọ n’oké ihe mgbu n’ihi Onyenwe anyị,+ N’ihi Chineke Jekọb,   Bụ́ onye na-eme ka oké nkume ghọọ ọdọ mmiri nke ahịhịa amị jupụtara,+ Na-emekwa ka oké nkume siri ike ghọọ isi mmiri.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji