Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 104:1-35

104  Mkpụrụ obi m, gọzie Jehova.+ Jehova Chineke m, ị dị nnọọ ukwuu.+ I yiriwo ebube na ịma mma dị ka uwe,+   I jikwa ìhè kpuchie onwe gị dị ka ákwà,+ I setịkwara eluigwe dị ka ákwà ụlọikwuu,+   Onye wukwasịrị ọnụ ụlọ ya nke dị n’elu n’ogidi e gwunyere na mmiri,+ Onye ji ígwé ojii mere ụgbọ ịnyịnya,+ Onye na-eje ije n’elu nku ifufe,+   Onye mere ka ndị mmụọ ozi ya bụrụ mmụọ,+ Meekwa ka ndị na-ejere ya ozi bụrụ ọkụ na-erepịa ihe.+   Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o sie ike;+ Ọ gaghị ama jijiji ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ruo mgbe niile ebighị ebi.+   I ji ogbu mmiri kpuchie ya dị ka ákwà.+ Mmiri tochiri ugwu niile.+   Ị bara mba, o wee gbalaga;+ Ọ nụrụ ụda égbè eluigwe gị, o wee jiri ụjọ gbaa ọsọ—   Gbaga n’ebe ị tọọrọ ya ntọala. Ugwu wee nulite,+ Ndagwurugwu* wee gbadaa.   Ị kpaara ya ókè, bụ́ ebe ọ na-agaghị agabiga,+ Ka o wee ghara itochi ụwa ọzọ.+ 10  Ị na-eme ka isi iyi niile na-asọba na ndagwurugwu dị iche iche;+ Ha na-asọ n’agbata ugwu. 11  Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ha na-aṅụ mgbe niile;+ Ịnyịnya ọhịa+ na-aṅụ ya mgbe niile ka akpịrị kwụsị ịkpọ ha nkụ. 12  Anụ ufe nke eluigwe na-akpa akwụ́ ha n’elu ha;+ Ha na-anọ n’alaka osisi nke akwụkwọ jupụtara na-ebe ubé.+ 13  Ị na-esi n’ọnụ ụlọ gị dị elu agba ugwu mmiri.+ Ihe ị rụpụtara na-eme ka afọ ju ụwa.+ 14  Ị na-eme ka ahịhịa ndụ puoro anụmanụ,+ Meekwa ka ihe ọkụkụ puo bụ́ nke ga-abara ụmụ mmadụ uru,+ Ka e wee si n’ala nweta ihe oriri,+ 15  Na mmanya nke na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa ọṅụ,+ Iji mee ka ihu mmadụ na-egbu maramara n’ihi mmanụ,+ Nakwa nri nke na-enye obi mmadụ ume.+ 16  Afọ na-eju osisi Jehova kụrụ, Bụ́ osisi sida nke Lebanọn ndị ọ kụrụ,+ 17  Ebe nnụnụ na-akpa akwụ́.+ Ọ bụ osisi junipa bụ ụlọ ụgbala.+ 18  Ugwu ndị dị elu+ bụ ebe ewu ọhịa na-anọ;+ Nkume dị elu bụ ebe ewi nkume na-agbaba.+ 19  O mere ọnwa ka e jiri ya na-amata oge a kara aka;+ Anyanwụ maara nke ọma ebe ọ na-ada.+ 20  Ị na-eme ka ọchịchịrị gbaa, ka o wee bụrụ abalị;+ Ọ bụ mgbe ahụ ka anụ ọhịa niile bi n’oké ọhịa na-akpagharị. 21  Ụmụ ọdụm tojuru etoju na-ebigbọ ka ha nweta anụ oriri,+ Ka ha chọtakwa ihe oriri ha n’aka Chineke.+ 22  Anyanwụ malite ịcha+—ha na-alaghachi, Ha na-aga makpuru n’ebe ha na-ezo. 23  Mmadụ na-apụ gawa ọrụ ya,+ Gaa rụwa ọrụ ya ruo anyasị.+ 24  Jehova, lee ka ọrụ gị si dị ọtụtụ!+ I ji amamihe rụọ ha niile.+ Ụwa jupụtara n’ihe ị rụrụ.+ 25  Oké osimiri nke buru ibu ma saa mbara,+ Ihe na-agagharị agagharị, ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, nọ n’ime ya,+ Bụ́ ihe e kere eke dị ndụ, ma ndị nta ma ndị ukwu.+ 26  Ụgbọ mmiri na-aga na ya;+ I kere Levayatan+ ka ọ na-egwuri egwu n’ime ya.+ 27  Ha niile nwere nchekwube n’ebe ị nọ+ Ka i nye ha ihe oriri ha n’oge ya.+ 28  Ihe i nyere ha ka ha na-ewere.+ Ị saghee aka gị—ihe ọma na-eju ha afọ.+ 29  Ọ bụrụ na i wepụ ihu gị, ha na-ama jijiji.+ Ọ bụrụ na i wepụ mmụọ ha, ha na-ekubi ume,+ Ha na-alaghachikwa n’ájá ha si pụta.+ 30  Ọ bụrụ na i zipụ mmụọ gị, a na-eke ha;+ Ị na-emekwa ka ihu ala dị ọhụrụ. 31  Ebube Jehova ga-adịru mgbe ebighị ebi.+ Jehova ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ọrụ ya.+ 32  O lee ụwa anya, ụwa amaa jijiji;+ O metụ ugwu aka, ha akwụọ anwụrụ.+ 33  M ga-abụku Jehova abụ n’oge niile m dị ndụ;+ M ga-abụku Jehova abụ olu ụtọ n’oge ndụ m niile.+ 34  Ka ihe m na-atụgharị n’uche banyere ya na-atọ ya ụtọ.+ Mụ onwe m ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova.+ 35  A ga-ekpochapụ ndị mmehie n’ụwa;+ Ndị ajọ omume agaghị adịkwa.+ Mkpụrụ obi m, gọzie Jehova. Toonụ Jaa!+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 104:8*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mbara ala nke dị na ndagwurugwu.”