Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Obedaya 1:1-21

 Ọhụụ Obedaya: Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru banyere Idọm:+ “E nwere ozi anyị nụrụ nke si n’ebe Jehova nọ, e nwekwara onye ozi e zigara n’etiti mba dị iche iche, ‘Bilienụ, ka anyị biliekwa buso ya agha.’”+  “Lee! Emewo m ka ị dị ntakịrị n’etiti mba+ dị iche iche. A na-eleda gị anya nke ukwuu.+  Ọ bụ mpako+ nke obi gị duhiere gị, gị onye bi n’ebe mgbaba nke nkume+ dị elu, n’ebe dị elu o bi na ya, na-asị n’obi ya, ‘Ònye ga-akwatu m n’ala?’  Ọ bụrụ na i mee ka ebe ị nọ dị elu dị ka nke ugo, ma ọ bụ, ọ bụrụ n’ebe kpakpando dị ka i debere akwụ́ gị, m ga-esi n’ebe ahụ kwatuo gị,”+ ka Jehova kwuru.  “Ọ bụrụ na ọ bụ ndị ohi batara+ n’ime gị, ọ bụrụ na ndị na-akwakọrọ ihe batara n’abalị, olee otú a gaara ebibiru gị? Ọ́ bụghị otú ha chọrọ ka ha ga-ezuru ihe? Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ bụ ndị na-aghọ mkpụrụ vaịn batara n’ime gị, ọ̀ bụ na ha agaghị aghọfọ mkpụrụ?+  Lee ókè e nyocharuworo+ ụmụ Isọ! Lee ka a chọpụtaworo akụ̀ ya ndị e zoro ezo!  Ha achụpụwo gị ruo n’ókè nke ala ha. Ndị niile gị na ha gbara ndụ aghọgbuwo+ gị. Ndị gị na ha dị n’udo emeriwo gị.+ Ndị gị na ha na-erikọ nri ga-eji ụgbụ siere gị ọnyà dị ka onye na-enweghị nghọta.+  Ọ́ gaghị abụ n’ụbọchị ahụ?” ka Jehova kwuru. “M ga-ebibi ndị maara ihe n’Idọm,+ laakwa nghọta n’iyi n’ógbè Isọ bụ́ ugwu ugwu.  Ụjọ+ ga-ejidekwa ndị dike gị, gị Timan,+ n’ihi na a ga-ebipụ+ onye nke ọ bụla n’ógbè Isọ bụ́ ugwu ugwu, site n’igbu ya egbu.+ 10  N’ihi imeso nwanne gị bụ́ Jekọb+ ihe ike, ihere+ ga-emegbu gị, a ga-ebipụkwa gị ruo mgbe ebighị ebi.+ 11  N’ụbọchị i guzopụrụ iche, n’ụbọchị ndị ala ọzọ dọọrọ ndị agha ya n’agha+ nakwa mgbe ndị mba ọzọ banyere n’ọnụ ụzọ ámá+ ya, ha efeekwa nza+ maka Jeruselem, gị onwe gị kwa dị ka otu n’ime ha. 12  “I kwesịghị ịnọ na-ekiri ihe mere n’ụbọchị nwanne+ gị, ya bụ, n’ụbọchị ihe ọjọọ dakwasịrị ya; i kwesịghịkwa ịṅụrị ọṅụ n’ihe mere ụmụ Juda n’ụbọchị a lara ha n’iyi;+ i kwesịghịkwa ịnọ na-etu ọnụ n’ụbọchị ahụhụ ha. 13  I kwesịghị ịbata n’ọnụ ụzọ ámá nke ndị m n’ụbọchị ọdachi+ dakwasịrị ha. Gị onwe gị ekwesịghị ịnọ na-ekiri nhụjuanya ya n’ụbọchị ọdachi dakwasịrị ya; i kwesịghịkwa isetịpụ aka metụ akụ̀ ya n’ụbọchị ọdachi+ dakwasịrị ya. 14  I kwesịghịkwa iguzo n’ebe ụzọ nwere ngalaba, iji gbuo ndị ya gbapụrụ agbapụ;+ i kwesịghịkwa ịkpọrọ ndị ya lanahụrụnụ nyefee n’aka ndị iro ha n’ụbọchị ahụhụ.+ 15  N’ihi na ụbọchị+ Jehova nke ga-abịakwasị mba niile dị nso. Otú i si mee ya ka a ga-eme gị.+ Ụdị mmeso i mesoro ya ga-alọghachi n’isi gị.+ 16  N’ihi na otú unu si ṅụọ ihe ọṅụṅụ n’ugwu nsọ m ka mba niile ga na-aṅụ+ mgbe niile. Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma loda ya wee dịrị ka ndị na-adịtụbeghị adị. 17  “Ọ bụkwa n’Ugwu Zayọn ka ndị gbapụrụ agbapụ+ ga-anọ, ọ ga-aghọkwa ihe dị nsọ;+ ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe dịịrị ha inweta.+ 18  Ụlọ Jekọb ga-aghọ ọkụ, ụlọ Josef aghọọkwa ire ọkụ,+ ụlọ Isọ ga-adịkwa ka ahịhịa ọka;+ ha ga-esunye ha ọkụ wee laa ha n’iyi. A gaghịkwa enwe onye si n’ụlọ Isọ+ ga-alanahụnụ; n’ihi na Jehova ekwuwo ya. 19  Ha ga-enwetakwa Negeb, ọbụna ógbè Isọ+ bụ́ ugwu ugwu, nwetakwa Shefila na ala ndị Filistia.+ Ha ga-enweta ala Ifrem,+ nwetakwa ala Sameria;+ Benjamin ga-enwetakwa Gilied.+ 20  Ma ndị a dọọrọ n’agha n’ékpè a,+ ihe ndị Kenan+ nwe ruo Zarefat+ ga-aghọ nke ụmụ Izrel. Ndị a dọọrọ n’agha na Jeruselem, bụ́ ndị nọ na Sefarad, ga-enweta obodo ndị dị na Negeb.+ 21  “Ndị nzọpụta+ ga-agbagokwa n’Ugwu Zayọn,+ iji kpee ógbè Isọ+ bụ́ ugwu ugwu ikpe; ọbụbụeze ga-abụkwa nke Jehova.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji