Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Nehemaya 12:1-47

12  Ndị a bụ ndị nchụàjà na ndị Livaị so Zerọbabel+ nwa Shieltiel+ na Jeshụa+ lọta: Seraya, Jeremaya, Ezra,  Amaraya,+ Malọk, Hatọsh,  Shekanaya, Rihọm, Meremọt,  Ido, Ginetọị, Abaịja,  Mijamin, Meadaya, Bilga,  Shemaya,+ Joyarib, Jedeya,+  Salu, Emọk,+ Hilkaya, Jedeya.+ Ndị a bụ ndị isi ndị nchụàjà na ụmụnne ha n’ụbọchị Jeshụa.+  Ndị Livaị bụ Jeshụa,+ Binuaị,+ Kadmiel,+ Sherebaya, Juda, Matanaya,+ bụ́ onyeisi ndị na-abụ abụ ekele, ya na ụmụnne ya.  Ha na Bakbọkaya na Ọnaị bụ́ ụmụnne ha cherịtara ihu n’ebe ha na-eche nche. 10  Jeshụa mụrụ Joyakim,+ Joyakim amụọ Elayashib, Elayashib+ amụọ Joyada.+ 11  Joyada mụrụ Jọnatan, Jọnatan amụọ Jadua.+ 12  N’ụbọchị Joyakim, e nwere ndị nchụàjà, ndị isi nke ọnụmara+ niile: nke Seraya,+ Meraya; nke Jeremaya, Hananaya; 13  nke Ezra,+ Meshọlam; nke Amaraya, Jehohenan; 14  nke Malọkaị, Jọnatan; nke Shebanaya,+ Josef; 15  nke Herim,+ Adna; nke Mereyọt, Helkaị; 16  nke Ido, Zekaraya; nke Ginetọn, Meshọlam; 17  nke Abaịja,+ Zikraị; nke Minayamin,——; nke Moadaya, Piltaị; 18  nke Bilga,+ Shamua; nke Shemaya, Jehọnatan; 19  nke Joyarib, Matinaị; nke Jedeya, Ọzaị;+ 20  nke Salaị, Kalaị; nke Emọk, Iba; 21  nke Hilkaya, Hashabaya; nke Jedeya,+ Netanel. 22  E dere aha ndị Livaị nọ n’ụbọchị Elayashib,+ Joyada+ na Johenan na Jadua+ dị ka ndị isi ọnụmara dị iche iche, nakwa ndị nchụàjà, ruo n’ọbụbụeze Darayọs onye Peshia. 23  E dere aha ụmụ Livaị n’akwụkwọ ihe ndị mere n’oge ahụ dị ka ndị isi ọnụmara+ dị iche iche, ruo ọbụna n’ụbọchị Johenan nwa Elayashib. 24  Ndị isi ndị Livaị bụ Hashabaya, Sherebaya+ na Jeshụa nwa Kadmiel+ na ụmụnne ha bụ́ ndị ha na ha cherịtara ihu inye otuto na inye ekele dị ka Devid onye nke ezi Chineke nyere n’iwu,+ ìgwè ndị nche nọkwa n’akụkụ ìgwè ndị nche. 25  Matanaya+ na Bakbọkaya, Obedaya, Meshọlam, Talmọn, Akọb,+ nọ na-eche nche dị ka ndị nche ọnụ ụzọ ámá,+ ya bụ, otu ìgwè ndị nche na-anọ n’akụkụ ụlọ nkwakọba ihe nke ọnụ ụzọ ámá. 26  Ndị a nọ n’ụbọchị Joyakim+ nwa Jeshụa+ nwa Jozadak+ nakwa n’ụbọchị Nehemaya+ bụ́ gọvanọ na Ezra+ onye nchụàjà, bụ́ ọkà n’idepụta ihe.+ 27  Mgbe a na-arara mgbidi Jeruselem nye,+ ha chọrọ ndị Livaị, ime ka ha si n’ebe niile ha nọ bịa Jeruselem ime ememme nraranye na iji ọṅụ na-enye ekele,+ na iji ájà, ụbọ akwara+ na une+ na-abụ abụ.+ 28  Ụmụ nke ndị na-abụ abụ wee si n’Ógbè Jọdan+ nakwa gburugburu Jeruselem nakwa n’ógbè niile nke ndị Netofa+ zukọọ, 29  tinyere Bet-gilgal+ nakwa ala Giba+ na Azmavet,+ n’ihi na e nwere ógbè dị iche iche+ ndị na-abụ abụ wuuru onwe ha gburugburu Jeruselem. 30  Ndị nchụàjà na ndị Livaị wee mee onwe ha ka ha dị ọcha,+ meekwa ka ndị Izrel+ na ọnụ ụzọ ámá+ na mgbidi+ dị ọcha. 31  M wee kpọgote ndị isi+ Juda n’elu mgbidi ahụ. M họpụtakwara nnukwu ìgwè abụọ na-ekwe ukwe ekele+ na ndị na-aga n’ahịrị n’ahịrị, otu ìgwè nọ na-aga n’aka nri n’elu mgbidi e si aga n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ikpo Ntụ.+ 32  Hoshaya na ọkara ndị isi Juda wee malite iso ha n’azụ, 33  nakwa Azaraya, Ezra na Meshọlam, 34  Juda na Benjamin na Shemaya na Jeremaya; 35  ndị bụkwa ụmụ ndị nchụàjà ndị ji opi+ bụ Zekaraya nwa Jọnatan nwa Shemaya nwa Matanaya nwa Mịkaya nwa Zakọ+ nwa Esaf,+ 36  na ụmụnne ya Shemaya na Azarel, Milalaị, Gilalaị, Meaị, Netanel na Juda, Hanenaị, bụ́ ndị ji ngwá egwú+ Devid onye nke ezi Chineke na-eji abụ abụ; Ezra+ bụ́ ọkà n’idepụta ihe nọkwa ha n’ihu. 37  N’Ọnụ Ụzọ Ámá Isi Iyi+ nakwa kpọmkwem n’ihu ha, ha gbagoro n’Ebe E Si Arịgo+ Obodo Devid+ site n’ebe e si agbago mgbidi dị n’elu Ụlọ Devid ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri+ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. 38  Ìgwè nke ọzọ na-ekwe ukwe ekele+ nọ na-aga n’ihu ha, mụ onwe m wee na-eso ha, ọkara ndị ọzọ ana-esokwa ha n’elu mgbidi nke dị elu karịa Ụlọ Elu Ekwú Ighe Ihe+ nakwa n’elu Mgbidi Sara Mbara,+ 39  nakwa n’elu Ọnụ Ụzọ Ámá Ifrem+ wee gaa n’Ọnụ Ụzọ Ámá Obodo Ochie+ ruokwa Ọnụ Ụzọ Ámá Azụ̀+ nakwa n’Ụlọ Elu Hananel+ nakwa n’Ụlọ Elu Mia+ ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Atụrụ;+ ha wee guzoro n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ndị Nche. 40  E mesịa, ìgwè abụọ ahụ nke na-ekwe ukwe ekele+ guzoro n’ụlọ+ ezi Chineke, tinyere mụ onwe m na ọkara ndị osote onye na-achị achị mụ na ha so,+ 41  nakwa ndị nchụàjà ji opi,+ bụ́ Elayakim, Measaya, Minayamin, Mịkaya, Elio-inaị, Zekaraya, Hananaya, 42  nakwa Measaya na Shemaya, na Elieza na Ọzaị na Jehohenan na Malkaịja na Ilam na Iza. Ndị na-abụ abụ, bụ́ ndị ha na Izrahaya onye nlekọta so, nọ na-eme ka a nụ olu ha.+ 43  Ha wee chụọ àjà+ dị ukwuu n’ụbọchị ahụ, ṅụrịakwa ọṅụ,+ n’ihi na ezi Chineke mere ka ha ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu.+ Ndị inyom+ na ụmụntakịrị+ ṅụrịkwara ọṅụ, nke mere na a pụrụ ịnọ n’ebe dị anya nụ ọṅụ Jeruselem na-aṅụrị.+ 44  N’ụbọchị ahụ, a họpụtakwara ndị ikom ga na-elekọta ụlọ+ a na-akwakọba ihe+ e nyere n’onyinye,+ mkpụrụ mbụ+ na otu ụzọ n’ụzọ iri.+ N’ime ụlọ ndị ahụ ka ha ga na-akwakọba ihe e si n’ubi ndị dị n’obodo dị iche iche wepụta, bụ́ ihe iwu+ kwuru ka a na-enye ndị nchụàjà na ndị Livaị;+ n’ihi na ọṅụ Juda na-aṅụrị bụ n’ihi ndị nchụàjà na ndị Livaị+ ndị nọ na-eje ozi. 45  Ha wee malite ịrụ ọrụ+ Chineke ha, na-arụkwa ọrụ ime ka a dị ọcha,+ ha na ndị na-abụ abụ+ na ndị nche ọnụ ụzọ ámá,+ dị ka Devid na Sọlọmọn nwa ya nyere n’iwu. 46  N’ihi na n’ụbọchị Devid na Esaf n’oge gara aga, e nwere ndị isi nke ndị na-abụ abụ,+ a na-abụkwara Chineke abụ otuto ma na-enye ya ekele.+ 47  Izrel dum n’oge Zerọbabel+ nakwa n’oge Nehemaya+ na-enye ndị na-abụ abụ+ na ndị nche ọnụ ụzọ ámá+ òkè ha dị ka mkpa ha nwere kwa ụbọchị si dị, ha na-edokwa ihe ndị ahụ nsọ maka ndị Livaị;+ ndị Livaị na-edokwa ihe ndị ahụ nsọ maka ụmụ Erọn.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji