Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Nehemaya 10:1-39

10  Ndị bịanyere aka na ya+ bụ: Nehemaya+ onye bụ́ Tesheta,+ nwa Hakalaya,+ Na Zedekaya,  Seraya,+ Azaraya, Jeremaya,  Pash-họ, Amaraya, Malkaịja,  Hatọsh, Shebanaya, Malọk,  Herim,+ Meremọt, Obedaya,  Daniel,+ Ginetọn, Barọk,  Meshọlam, Abaịja, Mijamin,  Meazaya, Bilgaị na Shemaya, bụ́ ndị nchụàjà.  Ndị Livaị bụ: Jeshụa+ nwa Azanaya, Binuaị nwa Henadad,+ Kadmiel 10  na ụmụnne ha bụ́ Shebanaya,+ Hodaya, Kelaịta, Peleya, Henan, 11  Maịka, Rihọb, Hashabaya, 12  Zakọ, Sherebaya,+ Shebanaya, 13  Hodaya, Benaị na Benaịnu. 14  Ndị isi ndị Izrel bụ: Perọsh, Pehat-moab,+ Ilam, Zatu, Benaị, 15  Bọnaị, Azgad, Bibaị, 16  Adọnaịja, Bigvaị, Edin, 17  Eta, Hezekaya, Azọ, 18  Hodaya, Heshọm, Bizaị, 19  Herif, Anatọt, Nibaị, 20  Magpiash, Meshọlam, Hiza, 21  Meshezabel, Zedọk, Jadua, 22  Pelataya, Henan, Anaya, 23  Hoshia, Hananaya, Hashọb, 24  Halohesh, Pilha, Shobek, 25  Rihọm, Hashabna, Measaya, 26  nakwa Ahaịja, Henan, Enan, 27  Malọk, Herim, Beana. 28  Ma ndị anyị ndị ọzọ, ndị nchụàjà,+ ndị Livaị,+ ndị nche ọnụ ụzọ ámá,+ ndị na-abụ abụ,+ ndị Netinim+ na ndị niile kewapụrụ onwe ha n’ebe ndị ala a nọ+ ka ha wee debe iwu+ ezi Chineke, ndị nwunye ha, ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom, onye ọ bụla nke maara ihe ma nwee nghọta,+ 29  ha na-arapara n’ahụ́ ụmụnne ha,+ bụ́ ndị ukwu ha,+ na-aṅụ iyi+ nke pụrụ iwetara ha ọbụbụ ọnụ+ na ha ga na-eje ije n’iwu ezi Chineke, nke e nyere site n’aka Mozis bụ́ ohu ezi Chineke,+ na ha ga na-edebekwa+ ma na-eme ntụziaka niile nke Jehova bụ́ Onyenwe anyị+ nakwa mkpebi ikpe ya na ụkpụrụ ya;+ 30  nakwa na anyị agaghị ekenye ndị ala a ụmụ anyị ndị inyom, anyị agaghịkwa alụtara ụmụ anyị ndị ikom ụmụ ha ndị inyom.+ 31  Anyị agaghị azụ ndị ala a+ ihe n’ụbọchị izu ike+ ma ọ bụ n’ụbọchị dị nsọ,+ bụ́ ndị na-ebute ngwá ahịa na ụdị ọka niile n’ụbọchị izu ike ka ha ree, anyị ga-ahapụ afọ nke asaa+ na ụgwọ onye ọ bụla ji.+ 32  Anyị manyekwara onwe anyị, onye ọ bụla n’ime anyị, inye otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ego shekel kwa afọ maka ozi a na-eje n’ụlọ Chineke anyị,+ 33  maka achịcha a na-edo n’usoro+ na àjà ọka* a na-achụ mgbe niile+ na àjà nsure ọkụ a na-esure mgbe niile n’ụbọchị izu+ ike nakwa n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ,+ maka oriri a kara aka+ na ihe ndị dị nsọ+ nakwa maka àjà mmehie+ a ga-eji kpuchie mmehie Izrel nakwa ọrụ niile a na-arụ n’ụlọ Chineke anyị.+ 34  Anyị fekwara nza+ maka nkụ+ ndị nchụàjà, ndị Livaị na ndị ọzọ ga na-ebute n’ụlọ Chineke anyị, dị ka ụlọ nna nna anyị hà si dị, n’oge a kara aka, kwa afọ, nke a ga-eji mee ka ọkụ na-ere n’elu ebe ịchụàjà Jehova bụ́ Chineke anyị,+ dị ka ihe e dere n’iwu ahụ si dị;+ 35  na iwebata mkpụrụ mbụ kara aka nke ala mepụtara+ nakwa mkpụrụ mbụ niile chara acha nke ụdị osisi niile mịrị,+ kwa afọ, n’ụlọ Jehova; 36  kpọtakwa ọkpara+ anyị ma weta anụ e bu ụzọ mụọ n’anụ ụlọ+ anyị, dị ka ihe e dere n’iwu+ ahụ si dị, nakwa anụ e bu ụzọ mụọ n’etiti ìgwè ehi anyị na ìgwè ewu na atụrụ+ anyị, iweta ha n’ụlọ Chineke anyị, inye ha ndị nchụàjà na-eje ozi n’ụlọ Chineke+ anyị. 37  Ntụ ọka+ nke si ná mkpụrụ mbụ anyị na onyinye+ anyị na mkpụrụ nke ụdị osisi niile,+ mmanya ọhụrụ+ na mmanụ+ ka anyị ga-ebutekwara ndị nchụàjà n’ebe a na-eri ihe+ n’ụlọ Chineke anyị, nyekwa ndị Livaị+ otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ala anyị mepụtara, ebe ọ bụ na ha, bụ́ ndị Livaị, bụ ndị na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri n’obodo anyị dị iche iche a na-akọ ugbo. 38  Onye nchụàjà, bụ́ nwa Erọn, na ndị Livaị ga na-anọ mgbe ndị Livaị ga na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri; ndị Livaị ga-ewetakwa n’ụlọ Chineke+ anyị otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ụzọ n’ụzọ iri a ga-edebe n’ebe a na-eri ihe+ n’ụlọ ebe a na-akwakọba ihe. 39  N’ihi na ọ bụ n’ebe a na-eri ihe ka ụmụ Izrel na ụmụ ndị Livaị ga-eweta onyinye+ ọka, mmanya ọhụrụ+ na mmanụ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka arịa ebe nsọ dị, bụrụkwa ebe ndị nchụàjà ndị na-eje ozi+ na ndị nche ọnụ ụzọ ámá+ na ndị na-abụ abụ+ nọ; anyị ekwesịghị ileghara ụlọ Chineke anyị anya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.