Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mkpughe 6:1-17

6  M wee hụ mgbe Nwa Atụrụ+ ahụ meghere otu n’ime ihe asaa ahụ a kara akara,+ m wee nụ ka otu n’ime ihe anọ ahụ dị ndụ+ ji olu nke na-ada ka égbè eluigwe kwuo, sị: “Bịa!”+  M wee hụ, ma, lee! ịnyịnya ọcha;+ onye nọ n’elu ya+ ji ụta;+ e nyekwara ya okpueze,+ o wee gaa na-emeri,+ ka o wee nwezuo mmeri ya.+  Mgbe o meghere nke abụọ n’ime ihe ndị ahụ a kara akara, anụrụ m ka ihe nke abụọ dị ndụ+ sịrị: “Bịa!”  Ịnyịnya ọzọ wee pụta, bụ́ ịnyịnya na-acha uhie uhie; e nyere onye nọ n’elu ya ikike iwepụ udo n’ụwa ka ha wee gburịta ibe ha; e nyekwara ya oké mma agha.+  Mgbe o+ meghere nke atọ n’ime ihe ndị ahụ a kara akara, anụrụ m ka ihe nke atọ dị ndụ+ sịrị: “Bịa!” M wee hụ, ma, lee! ịnyịnya ojii; onye nọ n’elu ya ji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ gbara mkpị+ n’aka ya.  M wee nụ otu olu nke dị ka à ga-asị na o si n’etiti+ ihe anọ ahụ dị ndụ.+ Olu ahụ sịrị: “A na-ere otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kwọt nke ọka wit otu mkpụrụ ego dinarịọs,+ a na-erekwa ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kwọt atọ nke ọka bali otu mkpụrụ ego dinarịọs; emebikwala mmanụ oliv na mmanya.”+  Mgbe o meghere nke anọ n’ime ihe ndị ahụ a kara akara, anụrụ m ka olu ihe nke anọ dị ndụ+ sịrị: “Bịa!”  M wee hụ, ma, lee! ịnyịnya nke ahụ́ ya chanwụrụ achanwụ; onye nọ n’elu ya nwekwara aha bụ́ Ọnwụ. Hedis+ sochikwara ya anya. E nyekwara ha ikike ịchị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ụwa, ka ha jiri ogologo mma agha+ na ụkọ nri+ na ajọ ọrịa na anụ ọhịa+ nke ụwa na-egbu ndị mmadụ.  Mgbe o meghere nke ise n’ime ihe ndị ahụ a kara akara, ahụrụ m, n’okpuru ebe ịchụàjà ahụ,+ mkpụrụ obi+ nke ndị e gburu+ n’ihi okwu Chineke nakwa n’ihi ọrụ ịgba àmà+ ha nọ na-arụ. 10  Ha wee jiri oké olu tie mkpu, sị: “Ọkaakaa+ Onyenwe anyị, onye dị nsọ na onye eziokwu,+ ruo ole mgbe ka ị ga-ahapụ ikpe ikpe+ na ịbọ ọbọ ọbara anyị+ n’isi ndị bi n’elu ụwa?” 11  E wee nye onye ọ bụla n’ime ha otu uwe mwụda na-acha ọcha;+ a gwakwara ha ka ha zutụkwuo ike ruo nwa oge, ruo mgbe ọnụ ọgụgụ nke ha na ndị ohu ibe ha na ụmụnna ha ga-ezu ezu, bụ́ ndị a na-aga igbu+ dị ka e gburu ha onwe ha. 12  M wee hụ mgbe o meghere nke isii n’ime ihe ndị ahụ a kara akara, e nwere oké ala ọma jijiji; anyanwụ jikwara oji dị ka ákwà mkpe+ e ji ajị anụ mee, ọnwa dum chakwara dị ka ọbara,+ 13  kpakpando nke eluigwe dakwara n’ala, dị ka mgbe mkpụrụ fig na-achaghị acha na-adapụsị n’osisi ya mgbe oké ifufe na-ebugharị ya. 14  E wepụrụ eluigwe dị ka akwụkwọ mpịakọta nke a na-afụkọta afụkọta,+ e wepụkwara ugwu niile na agwaetiti niile n’ọnọdụ ha.+ 15  Ndị eze nke ụwa na ndị nọ n’ọkwá ukwu na ndị ọchịagha na ndị bara ọgaranya na ndị dị ike na ndị ohu niile na ndị niile nweere onwe ha wee gaa zoo n’ọgba nakwa n’oké nkume+ ndị dị n’ugwu. 16  Ha wee na-asị ugwu na oké nkume ndị ahụ: “Dakwasịnụ anyị+ ma zobe anyị ka Onye ahụ nke nọ n’ocheeze ahụ+ ghara ịhụ anyị, ka ọnụma nke Nwa Atụrụ ahụ gharakwa ịbịakwasị anyị,+ 17  n’ihi na oké ụbọchị+ nke ọnụma ha+ abịawo, ònye pụrụ iguzo?”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji