Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mkpughe 2:1-29

2  “Degara mmụọ ozi+ nke ọgbakọ dị n’Efesọs+ akwụkwọ, sị: Ihe ndị a ka onye ahụ nke chị kpakpando asaa+ ahụ n’aka nri ya na-ekwu, onye ahụ nke na-eje ije n’etiti ihe ndọba oriọna asaa ahụ e ji ọlaedo rụọ,+  ‘Amaara m ihe ndị ị na-eme,+ na ndọgbu ị na-adọgbu onwe gị n’ọrụ na ntachi obi i nwere, amakwaara m na ị pụghị ịnabata ndị ọjọọ, na ị na-anwalekwa+ ndị na-asị na ha bụ ndịozi,+ ma ha abụghị, i wee chọpụta na ha bụ ndị ụgha.  Ị na-atachikwa obi,+ i diwokwa ọtụtụ ihe n’ihi aha m,+ ị dabeghịkwa mbà.+  Otú ọ dị, ihe i mere nke na-adịghị m mma bụ na ị hapụwo ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ.+  “‘Ya mere, cheta ebe i si daa, chegharịakwa,+ mewe ihe ndị ị na-eme na mbụ. Ọ bụrụ na i meghị otú ahụ, aga m abịakwute gị,+ m ga-ewepụkwa ihe ndọba oriọna gị+ n’ọnọdụ ya, ma ọ bụrụ na i chegharịghị.  Ma, ọ dị ihe dị mma ị na-eme, ya bụ, ị kpọrọ ihe òtù Nikọleyọs+ na-eme asị,+ nke mụ onwe m kpọkwara asị.  Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe mmụọ nsọ+ na-agwa ọgbakọ ndị a: Onye meriri emeri,+ m ga-ekwe ka o rie mkpụrụ si n’osisi nke ndụ,+ nke dị na paradaịs Chineke.’  “Degakwara mmụọ ozi+ nke ọgbakọ dị na Smeana akwụkwọ, sị: Ihe ndị a ka ‘Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ’+ na-ekwu, onye ghọrọ onye nwụrụ anwụ ma dị ndụ ọzọ,+  ‘Amaara m mkpagbu gị na ogbenye ị dara—ma ị bara ọgaranya+—amakwaara m nkwulu nke ndị na-asị na ha onwe ha bụ ndị Juu,+ ma ha abụghị, kama ha bụ ụlọ nzukọ Setan.+ 10  Atụla egwu banyere ihe ndị ị na-aga ịta ahụhụ ha.+ Lee! Ekwensu+ ga na-atụba ụfọdụ n’ime unu n’ụlọ mkpọrọ ka e wee lee unu ule n’ụzọ zuru ezu,+ ka unu wee nweekwa mkpagbu+ ruo ụbọchị iri. Bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ,+ m ga-enye gị okpueze bụ́ ndụ.+ 11  Onye nwere ntị,+ ya nụrụ ihe mmụọ nsọ+ na-agwa ọgbakọ ndị a: Onye meriri emeri,+ ọnwụ nke abụọ agaghị emerụ ya ahụ́ ma ọlị.’+ 12  “Degakwara mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Pagamọm akwụkwọ, sị: Ihe ndị a ka onye ahụ nke nwe ogologo mma agha dị nkọ, nwekwara ihu abụọ,+ na-ekwu, sị, 13  ‘Amaara m ebe i bi, ya bụ, n’ebe ocheeze Setan dị; ma i jidesiri aha m ike,+ ị gọnahụghịkwa okwukwe i nwere n’ebe m nọ+ ọbụna n’ụbọchị Antipas, bụ́ onye àmà m,+ onye kwesịrị ntụkwasị obi, onye e gburu+ n’akụkụ unu, n’ebe Setan bi. 14  “‘Otú ọ dị, ọ dị ihe ole na ole ị na-eme ndị na-adịghị m mma, ya bụ, i nwere n’ebe ahụ ndị jidesiri ozizi Belam ike,+ bụ́ onye malitere ịkụziri Belak+ ka o debe ihe ịsụ ngọngọ n’ihu ụmụ Izrel, ka ha rie ihe e ji chụọrọ arụsị àjà, ka ha kwaakwa iko.+ 15  Otú ahụkwa ka i nwere ndị jidesiri ozizi nke òtù Nikọleyọs ike.+ 16  Ya mere, chegharịa.+ Ọ bụrụ na i chegharịghị, m ga-abịakwute gị ọsọ ọsọ, m ga-ejikwa ogologo mma agha dị n’ọnụ m+ lụso ha agha.+ 17  “‘Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a:+ M ga-enyetụ onye meriri emeri+ mana e zoro ezo,+ m ga-enyekwa ya obere okwute nke na-acha ọcha, n’elu obere okwute ahụ, e dere aha ọhụrụ+ nke ọ na-enweghị onye maara ya ma ọ́ bụghị onye natara ya.’+ 18  “Degakwara mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Tayataịra+ akwụkwọ, sị: Ihe ndị a ka Ọkpara+ Chineke kwuru, bụ́ onye anya ya dị ka ire ọkụ na-enwu enwu,+ ụkwụ ya dịkwa ka ọla kọpa ọma,+ 19  ‘Amaara m ihe ndị ị na-eme, na ịhụnanya+ na okwukwe na ije ozi na ntachi obi gị, amakwaara m na ihe ndị ị na-eme+ n’oge na-adịbeghị anya karịrị ndị i mere n’oge gara aga.+ 20  “‘Otú ọ dị, ihe na-adịghị mma i mere bụ na ị gbachiri nwaanyị ahụ bụ́ Jezibel nkịtị,+ bụ́ onye na-akpọ onwe ya onye amụma, ọ na-akụzikwara+ ndị ohu m,+ na-eduhiekwa ha, ka ha na-akwa iko,+ ka ha na-erikwa ihe e ji chụọrọ arụsị àjà.+ 21  M nyekwara ya oge ka o chegharịa,+ ma ọ chọghị ichegharị n’ịkwa iko ya.+ 22  Lee! M na-aga ịtụba ya n’àkwà ọrịa, tụbakwa ndị ha na ya na-akwa iko n’oké mkpagbu, ma ọ bụrụ na ha echegharịghị wee hapụ ihe ndị ọ kụziiri ha. 23  M ga-ejikwa ihe otiti na-akpata ọnwụ gbuo ụmụ ya, ka ọgbakọ niile wee mara na ọ bụ m na-enyocha akụrụ na obi, m ga-akwụkwa unu ụgwọ n’otu n’otu dị ka omume unu si dị.+ 24  “‘Otú ọ dị, ana m agwa ndị fọdụrụ n’ime unu nọ na Tayataịra, ndị niile na-enweghị ozizi a, ndị ahụ na-amataghị “ihe ndị miri emi nke Setan,”+ dị ka ha si ekwu: Anaghị m ebo unu ibu arọ ọ bụla ọzọ.+ 25  Otú o sina dị, jidesienụ ihe unu nwere ike+ ruo mgbe m ga-abịa. 26  Onye meriri emeri, debekwa ihe m nyere n’iwu ruo ọgwụgwụ,+ m ga-enye ya ikike ịchị mba niile,+ 27  ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè zụọ ndị mmadụ dị ka atụrụ,+ ka e wee kụrisịa ha dị ka arịa e ji ụrọ kpụọ,+ dị ka m natara ikike n’aka Nna m, 28  m ga-enyekwa ya kpakpando ụtụtụ.+ 29  Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe mmụọ nsọ+ na-agwa ọgbakọ ndị a.’+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji