Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mkpughe 19:1-21

19  Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ihe dị ka oké olu nke oké ìgwè mmadụ n’eluigwe.+ Ha sịrị: “Toonụ Jaa!+ Ọ bụ Chineke anyị nwe+ nzọpụta+ na otuto na ike,  n’ihi na ikpe ya bụ eziokwu, bụrụkwa ihe ziri ezi.+ N’ihi na o mezuwo ihe e kpere n’ikpe n’isi oké nwaanyị akwụna ahụ, bụ́ onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa, ọ bọwokwa ọbọ ọbara ndị ohu ya n’ahụ́ nwaanyị ahụ.”+  Ozugbo ahụ, ha kwuru nke ugboro abụọ, sị: “Toonụ Jaa!+ Anwụrụ ọkụ nke si n’ahụ́ ya ga na-akwụgo ruo mgbe niile ebighị ebi.”+  Ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ+ na ihe anọ ahụ dị ndụ+ dakwara n’ala ma kpọọrọ Chineke bụ́ onye nọ ọdụ+ n’ocheeze isiala, wee sị: “Amen! Toonụ Jaa!”+  Otu olu sikwa n’ocheeze ahụ dapụta wee sị: “Na-etonụ Chineke anyị, unu ndị ohu ya niile,+ ndị na-atụ egwu ya, ndị nta na ndị ukwu.”+  M wee nụ ihe na-ada ka olu oké ìgwè mmadụ, dịkwa ka ụda nke ọtụtụ mmiri na ụda oké égbè eluigwe. Ha sịrị: “Toonụ Jaa,+ n’ihi na Jehova Chineke anyị, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ amalitewo ịchị achị dị ka eze.+  Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nke ukwuu, ka anyị nyekwa ya otuto,+ n’ihi na ọlụlụ nwunye+ nke Nwa Atụrụ ahụ eruwo,+ nwunye ya ejikerewokwa.+  Ee, e nyewo ya ikike iyiri ákwà linin ọma nke na-enwu gbaa, nke dịkwa ọcha, n’ihi na ákwà linin ọma ahụ nọchiri anya ezi omume nke ndị nsọ na-eme.”+  O wee sị m: “Dee, sị: Obi ụtọ na-adịrị ndị a kpọrọ òkù+ ịbịa nri anyasị ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ.”+ Ọ sịkwara m: “Ndị a bụ okwu Chineke kwuru n’ezie.”+ 10  M wee daa n’ala n’ụkwụ ya ka m fee ya ofufe.+ Ma ọ sịrị m: “Kpachara anya! Emela ya!+ Abụ m naanị ohu ibe gị na ohu ụmụnna gị ndị nwere ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.+ Fee Chineke,+ n’ihi na ịgba àmà banyere Jizọs bụ ihe na-akpali ibu amụma.”+ 11  M wee hụ ka e meghere eluigwe, ma, lee! otu ịnyịnya ọcha.+ A na-akpọkwa onye nọ n’elu ya Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi+ na Onye Eziokwu,+ ọ na-ekpekwa ikpe ma na-alụ agha n’ezi omume.+ 12  Anya ya bụ ire ọkụ na-enwu enwu,+ o kpukwa ọtụtụ okpueze n’isi ya.+ O nwekwara aha+ e dere n’ahụ́ ya, nke onye ọ bụla na-amaghị ma e wezụga ya onwe ya, 13  o yikwa uwe elu nke e fesara ọbara,+ aha a na-akpọkwa ya bụ Okwu+ Chineke. 14  Ụsụụ ndị agha nọ n’eluigwe nọkwa n’elu ịnyịnya ọcha, na-eso ya n’azụ, ha yikwa ákwà linin ọma nke na-acha ọcha, dịkwa ọcha. 15  Ogologo mma agha dị nkọ sikwa n’ọnụ ya pụta,+ ka o jiri ya gbuo mba niile, ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè zụọ ha dị ka atụrụ.+ Ọ na-azọchakwa mkpụrụ dị n’ebe nzọchapụta mmanya+ nke iwe nke ọnụma Chineke,+ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. 16  O nwere aha e dere n’uwe elu ya, ya bụ, n’apata ụkwụ ya, nke bụ́ Eze nke ndị eze na Onyenwenụ kasị ndị nwenụ niile.+ 17  Ahụkwara m otu mmụọ ozi ka o guzo n’anyanwụ, o wee jiri oké olu kpọọ nnụnụ niile+ na-efe n’etiti eluigwe, sị: “Bịanụ ebe a, zukọtanụ iri oké nri anyasị nke Chineke, 18  ka unu wee rie anụ+ ndị eze na anụ ndị ọchịagha na anụ ndị dị ike+ na anụ ịnyịnya+ na nke ndị nọ n’elu ha, na anụ mmadụ niile, nke ndị nweere onwe ha na nke ndị ohu na nke ndị nta na ndị ukwu.” 19  M wee hụ anụ ọhịa ahụ+ na ndị eze+ nke ụwa na ụsụụ ndị agha ha ka ha zukọtara ibuso+ onye ahụ nke nọ n’elu ịnyịnya+ ahụ na ụsụụ ndị agha ya agha. 20  E wee jide anụ ọhịa ahụ,+ ya na onye amụma ụgha+ ahụ nke mere ihe ịrịba ama+ ndị ahụ n’ihu ya, bụ́ ndị o ji duhie ndị natara akara+ nke anụ ọhịa ahụ na ndị na-efe onyinyo ya ofufe.+ Mgbe ha ka nọ ndụ, a tụbara ha abụọ n’ime ọdọ ọkụ ahụ nke ji sọlfọ na-enwu.+ 21  Ma e ji ogologo mma agha nke onye ahụ nọ n’elu ịnyịnya+ ahụ gbuchapụ ndị fọdụrụ, bụ́ mma agha nke si ya n’ọnụ pụta.+ Nnụnụ niile+ rikwara anụ ha,+ rijuo afọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji