Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mkpughe 17:1-18

17  Otu n’ime ndị mmụọ ozi asaa ahụ ndị ji efere asaa+ ahụ wee bịa, gwa m okwu, sị: “Bịa, m ga-egosi gị ikpe ahụ a mara oké nwaanyị akwụna+ ahụ nke nọ n’elu ọtụtụ mmiri,+  onye ya na ndị eze ụwa kwara iko,+ ma e mere ka mmanya nke ịkwa iko ya na-egbu ndị bi n’elu ụwa.”+  O wee buru m n’ike mmụọ nsọ+ baa n’ala ịkpa. M wee hụ otu nwaanyị nke nọ n’elu otu anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie,+ nke jupụtara n’aha nke na-ekwulu Chineke,+ nke nwekwara isi asaa+ na mpi iri.  Nwaanyị ahụ yi ákwà odo odo+ na ákwà uhie uhie,+ o jikwa ọlaedo na nkume dị oké ọnụ ahịa na nkume pel chọọ onwe ya mma,+ o jikwa iko ọlaedo+ nke jupụtara n’ihe arụ+ na ihe ndị na-adịghị ọcha o ji akwa iko n’aka.+  N’egedege ihu ya, e dere otu aha nke bụ́ ihe omimi:+ “Babịlọn Ukwu ahụ, nne ụmụ nwaanyị akwụna+ na nke ihe arụ nke ụwa.”+  M wee hụ na ọbara+ nke ndị nsọ na ọbara nke ndị àmà Jizọs+ na-egbu nwaanyị ahụ dị ka mmanya. Mgbe m hụrụ ya, o juru m anya nke ukwuu.+  Ya mere, mmụọ ozi ahụ gwara m, sị: “Gịnị mere o ji ju gị anya? M ga-agwa gị ihe omimi banyere nwaanyị ahụ+ na banyere anụ ọhịa ahụ na-ebugharị ya, nke nwekwara isi asaa na mpi iri.+  Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ dịbu adị,+ ma ọ dịkwaghị, ma ọ ga-esikwa n’abis rịgota,+ a ga-ebibikwa ya. Mgbe ndị bi n’ụwa hụrụ otú anụ ọhịa ahụ si bụrụ nke dịbu adị, ma ọ dịkwaghị, ma bụrụ nke ga-adị, ọ ga-eju ha anya nke ukwuu, ma e deghị aha ha n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ+ ahụ malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.+  “Ebe a ka a chọrọ ọgụgụ isi na amamihe:+ Isi asaa ahụ+ pụtara ugwu asaa,+ bụ́ ebe nwaanyị ahụ nọ ọdụ. 10  E nwere ndị eze asaa: ise adawo,+ otu nọ ugbu a,+ nke ọzọ abịabeghị,+ ma mgbe ọ ga-abịa, ọ ghaghị ịnọru nwa oge.+ 11  Ma anụ ọhịa ahụ nke dịbu adị, ma ọ dịghị ugbu a,+ ya onwe ya bụ eze nke asatọ, ma o si n’asaa ahụ pụta, a ga-ebibikwa ya. 12  “Mpi iri ahụ ị hụrụ pụtara ndị eze iri,+ bụ́ ndị na-anatabeghị alaeze, ma ha na anụ ọhịa ahụ ga-anata ikike dị ka ndị eze ruo otu awa. 13  Ndị a nwere otu echiche, n’ihi ya, ha na-enye anụ ọhịa ahụ ike na ikike ha.+ 14  Ndị a ga-ebuso Nwa Atụrụ ahụ agha,+ ma Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha,+ n’ihi na ọ bụ Onyenwenụ kasị ndị nwenụ niile na Eze nke ndị eze.+ Ndị so ya ga-emerikwa ha,+ ya bụ, ndị a kpọrọ, ndị a họọrọ, ndị kwesịkwara ntụkwasị obi.” 15  Ọ sịkwara m: “Mmiri ahụ ị hụrụ, bụ́ ebe nwaanyị akwụna ahụ nọ ọdụ, pụtara ndị dị iche iche na ìgwè mmadụ na mba dị iche iche na asụsụ dị iche iche.+ 16  Mpi iri+ ahụ na anụ ọhịa+ ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwaanyị akwụna+ ahụ asị, laakwa ya n’iyi ma mee ka ọ gbara ọtọ, ha ga-erikwa anụ ya ma kpọọ ya ọkụ kpamkpam.+ 17  N’ihi na Chineke tinyere ya n’obi ha imezu echiche ya,+ ya bụ, imezu otu echiche ha site n’inye anụ ọhịa ahụ alaeze ha,+ ruo mgbe a ga-emezu okwu Chineke.+ 18  Nwaanyị ahụ+ ị hụrụ pụtara obodo ukwu ahụ nke nwere alaeze na-achị ndị eze nke ụwa.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji