Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Matiu 8:1-34

8  Mgbe o si n’ugwu ahụ rịdata, oké ìgwè mmadụ sooro ya.  Ma, lee! otu onye ekpenta+ bịara wee malite ịkpọrọ ya isiala, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ nnọọ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”  O wee matịa aka ya bitụ ya, sị: “Achọrọ m. Dị ọcha.”+ Ozugbo ahụ, a sachapụrụ ekpenta ya.+  Jizọs wee sị ya: “Hụ na ọ dịghị onye ị kọọrọ,+ kama gaa gosi onye nchụàjà onwe gị,+ nyekwa onyinye+ Mozis kwuru ka a na-enye, ka o wee bụụrụ ndị nchụàjà ihe àmà.”  Mgbe ọ banyere Kapaniọm,+ otu onyeisi ndị agha bịakwutere ya, na-arịọsi ya arịrịọ ike,  sị: “Nna anyị ukwu, nwoke na-ejere m ozi dina n’ụlọ. Ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ na-enwekwa mmekpa ahụ́ dị ukwuu.”  Ọ sịrị ya: “Mgbe m ruru ebe ahụ, m ga-agwọ ya.”  Onyeisi ndị agha ahụ zara, sị: “Nna anyị ukwu, erughị m eru ka ị bata n’ụlọ m, kama naanị kwuo okwu, a ga-agwọkwa nwoke na-ejere m ozi.  N’ihi na mụ onwe m kwa nọ n’okpuru ikike mmadụ, m nwekwara ndị agha nọ n’okpuru m, m na-asị onye nke a, ‘Gawa!’+ ya agawa, m na-asịkwa onye nke ọzọ, ‘Bịa!’ ya abịa, m na-asịkwa ohu m, ‘Mee nke a!’ ya emee ya.” 10  Mgbe Jizọs nụrụ ya, o juru ya anya, o wee sị ndị so ya: “Ana m agwa unu eziokwu, Ahụbeghị m onye nwere okwukwe dị ukwuu otú a n’Izrel.+ 11  Ma ana m asị unu na ọtụtụ ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ na n’ebe ọdịda anyanwụ+ ga-abịa soro Ebreham na Aịzik na Jekọb nọdụ na-eri ihe na tebụl n’alaeze+ eluigwe;+ 12  ma a ga-atụpụ ụmụ alaeze+ n’ọchịchịrị dị n’èzí. N’ebe ahụ ka ha ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.”+ 13  Jizọs wee sị onyeisi ndị agha ahụ: “Lawa. Dị nnọọ ka okwukwe gị si dị, ya si otú ahụ meere gị.”+ E wee gwọọ nwoke ahụ na-ejere ya ozi n’awa ahụ. 14  Mgbe Jizọs batara n’ụlọ Pita, ọ hụrụ nne nwunye Pita+ ka o dina ala, ahụ́ ọkụ na-emekwa ya.+ 15  O wee bitụ ya aka n’aka,+ ahụ́ ọkụ ahụ wee hapụ ya, o wee bilie malite ijere ya ozi.+ 16  Ma mgbe o ruru ná mgbede, ndị mmadụ kpọtaara ya ọtụtụ ndị ndị mmụọ ọjọọ ji; o wee were okwu ọnụ chụpụ ndị mmụọ ahụ, ọ gwọkwara ndị niile ahụ́ na-adịghị mma; 17  ka e wee mezuo ihe e kwuru site n’ọnụ Aịzaya onye amụma, sị: “Ya onwe ya buuru ọrịa ndị na-arịa anyị, burukwa nrịanrịa anyị.”+ 18  Mgbe Jizọs hụrụ ìgwè mmadụ gburugburu ya, o nyere iwu ka ha banye n’ụgbọ mmiri gaa n’ofe nke ọzọ.+ 19  Otu onye odeakwụkwọ bịara wee sị ya: “Onye Ozizi, m ga-eso gị gaa ebe ọ bụla ị chọrọ ịga.”+ 20  Ma Jizọs sịrị ya: “Nkịta ọhịa nwere ọgba, anụ ufe nke eluigwe nwekwara akwụ́, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ ga-atọgbọ isi ya.”+ 21  Onye ọzọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya wee sị ya: “Onyenwe anyị, hapụ m ka m buru ụzọ gaa lie nna m.” 22  Jizọs sịrị ya: “Na-eso m, hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị ha nwụrụ anwụ.”+ 23  Mgbe ọ banyere n’ụgbọ mmiri,+ ndị na-eso ụzọ ya sooro ya. 24  Ma, lee! oké ifufe malitere ife n’oké osimiri ahụ, nke mere na ebili mmiri nọ na-ekpuchi ụgbọ ahụ; otú ọ dị, ọ na-ehi ụra.+ 25  Ha wee bịa kpọtee+ ya, sị: “Onyenwe anyị, zọpụta anyị, anyị na-aga ịla n’iyi!” 26  Ma ọ sịrị ha: “Gịnị mere obi ji na-amapụ unu, unu ndị okwukwe nta?”+ O wee bilie baara ifufe ahụ na oké osimiri ahụ mba, ebe niile wee daa jụụ.+ 27  O wee ju ha anya, ha wee sị: “Olee ụdị mmadụ onye a bụ,+ nke na ọbụna ifufe na oké osimiri na-erubere ya isi?” 28  Mgbe o ruru n’ofe nke ọzọ, n’ime obodo ndị Gadara,+ mmadụ abụọ mmụọ ọjọọ ji,+ ndị si n’ebe e nwere ili ncheta na-apụta, zutere ya, ha na-eme ihe ike nke ukwuu, nke na ọ dịghị onye nwere obi ike ịgafe n’okporo ụzọ ahụ. 29  Ma, lee! ha tiri mkpu, sị: “Ọkpara Chineke, gịnị jikọrọ anyị na gị?+ Ị̀ bịara ebe a imekpa anyị ahụ́+ tupu oge a kara aka eruo?”+ 30  Ma ìgwè ọtụtụ ézì nọ na-ata ahịhịa n’ebe dị anya n’ebe ha nọ. 31  Ndị mmụọ ọjọọ ahụ wee malite ịrịọsi ya arịrịọ ike, sị: “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, hapụ anyị ka anyị banye n’ime ìgwè ézì ahụ.”+ 32  O wee sị ha: “Gawanụ!” Ha pụtara wee banye n’ime ézì ndị ahụ; ma, lee! ìgwè ézì ahụ dum nuuru gaa n’ebe kpọdara akpọda wee daba n’oké osimiri ma nwụọ n’ime mmiri.+ 33  Ma ndị na-azụ ézì ndị ahụ gbara ọsọ. Mgbe ha banyere n’obodo, ha kọrọ ihe niile mere, tinyere ihe mere ndị ahụ mmụọ ọjọọ ji. 34  Ma, lee! obodo ahụ dum pụtara ka ha hụ Jizọs; mgbe ha hụrụ ya, ha rịọsiri ya arịrịọ ike ka o si n’ógbè ha pụọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji