Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Matiu 4:1-25

4  Mmụọ nsọ wee duru Jizọs banye n’ala ịkpa+ ka Ekwensu nwaa ya ọnwụnwa.+  Mgbe o busịrị ọnụ ụbọchị iri anọ,+ ehihie na abalị, agụụ gụwara ya.  Onye Ọnwụnwa+ ahụ bịakwara sị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke,+ gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.”  Ma ọ zara, sị: “E dere, sị, ‘Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.’”+  Mgbe ahụ, Ekwensu kpọọrọ ya banye n’obodo nsọ ahụ,+ o wee mee ka o guzoro n’elu ihe a rụbichiri na mgbidi ụlọ nsọ  wee sị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, si ebe a wụda;+ n’ihi na e dere, sị, ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ha ga-eji aka ha ghọrọ gị, ka ị ghara ịkpọ ụkwụ na nkume mgbe ọ bụla.’”+  Jizọs wee sị ya: “E dekwara, sị, ‘Elela Jehova bụ́ Chineke gị ule.’”+  Ọzọ, Ekwensu kpọọrọ ya gaa n’ugwu dị oké elu ma gosi ya alaeze niile nke ụwa+ na ebube ha,  wee sị ya: “Ihe a niile ka m ga-enye gị+ ma ọ bụrụ na ị daa n’ala fee m ofufe.”+ 10  Jizọs wee sị ya: “Si ebe a pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe,+ ọ bụkwa naanị ya+ ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.’”+ 11  Ekwensu wee hapụ ya,+ ma, lee! ndị mmụọ ozi bịara wee malite ijere ya ozi.+ 12  Ma mgbe ọ nụrụ na e jidewo Jọn,+ ọ pụrụ wee banye n’ime Galili.+ 13  Mgbe ọ hapụkwara Nazaret, ọ bịara biri na Kapaniọm+ n’akụkụ oké osimiri dị n’ógbè Zebulọn na Naftalaị,+ 14  ka e wee mezuo ihe e kwuru site n’ọnụ Aịzaya onye amụma, sị: 15  “Gị ala Zebulọn na ala Naftalaị, ndị dị n’ụzọ oké osimiri, n’ofe Jọdan, Galili+ nke ndị mba ọzọ! 16  ndị nọ n’ọchịchịrị+ hụrụ oké ìhè,+ ìhè+ nwukwasịkwara+ ndị nọ n’ógbè nke onyinyo ọnwụ.” 17  Malite n’oge ahụ gaa n’ihu, Jizọs bidoro ikwusa, sị: “Chegharịanụ,+ n’ihi na alaeze+ eluigwe eruwo nso.” 18  Ka ọ na-aga n’akụkụ oké osimiri Galili,* ọ hụrụ ụmụnne abụọ, bụ́ Saịmọn+ onye a na-akpọ Pita+ na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ azụ̀ n’ime oké osimiri, n’ihi na ha bụ ndị na-akụ azụ̀. 19  O wee sị ha: “Soronụ m, m ga-eme unu ndị na-akụta mmadụ.”+ 20  Ozugbo ahụ, ha hapụrụ ụgbụ ha+ wee soro ya. 21  Mgbe o sikwa ebe ahụ gakwuo n’ihu, ọ hụrụ mmadụ abụọ ọzọ+ bụ́ ụmụnne, Jems nwa Zebedi+ na Jọn nwanne ya, ka ha na Zebedi nna ha nọ n’ụgbọ mmiri na-edozi ụgbụ ha, o wee kpọọ ha. 22  Ozugbo ahụ, ha hapụrụ ụgbọ mmiri ahụ na nna ha wee soro ya. 23  O wee gazuo+ Galili dum,+ na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha,+ na-ekwusakwa ozi ọma alaeze ahụ, na-agwọkwa ụdị ọrịa ọ bụla+ na ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla ndị mmadụ nwere. 24  Akụkọ banyere ya gazuru Siria dum;+ ha wee kpọtara ya ndị niile ahụ́ na-adịghị mma,+ ndị ọrịa na mmekpa ahụ́ dị iche iche na-esogbu, ndị mmụọ ọjọọ ji na ndị akwụkwụ+ na ndị ahụ́ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, o wee gwọọ ha. 25  Ya mere, oké ìgwè mmadụ si na Galili+ na Dikapọlis na Jeruselem+ na Judia na ofe Jọdan soro ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

“N’ezie, ọ bụ ọdọ mmiri; Baịbụl kpọkwara ya ọdọ mmiri Genesaret, Osimiri Galili, nakwa Osimiri Taịbirias.”