Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Matiu 26:1-75

26  Mgbe Jizọs kwusịrị okwu a niile, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya:  “Unu maara na abalị abụọ taa, a ga-eme ememme ngabiga,+ a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ ka a kpọgide ya n’osisi.”+  Ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu wee zukọta na mbara èzí nke nnukwu onye nchụàjà, bụ́ onye a na-akpọ Keyafas,+  ma gbaa izu+ iji ụzọ akọ jide Jizọs ma gbuo ya.  Otú ọ dị, ha nọ na-asị: “Ọ bụghị n’oge ememme a, ka a ghara inwe oké ọgba aghara n’etiti ìgwè mmadụ.”+  Mgbe Jizọs nọ na Betani,+ n’ụlọ Saịmọn onye ekpenta,+  otu nwaanyị ji mkpọ̀ alabasta mmanụ nke na-esi ísì ụtọ+ bịakwute ya. Mmanụ ahụ dịkwa oké ọnụ. Nwaanyị ahụ wee malite ịwụkwasị ya n’isi ya ka ọ nọ na-eri ihe na tebụl.  Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe a, ha were iwe wee sị: “Gịnị mere e ji laa ihe a n’iyi otú a?+  N’ihi na a gaara ereta ihe a ego buru ibu ma nye ya ndị ogbenye.”+ 10  Ebe Jizọs maara ihe ha na-ekwu,+ ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-enye nwaanyị a nsogbu? N’ihi na o meere m ihe ọma.+ 11  N’ihi na unu na ndị ogbenye+ nọ mgbe niile, ma mụ na unu anọghị mgbe niile.+ 12  N’ihi na mgbe nwaanyị a tere m mmanụ a na-esi ísì ụtọ n’ahụ́, o tere m ya iji kwadebe m maka olili.+ 13  N’ezie, ana m asị unu, N’ebe ọ bụla a na-ekwusa ozi ọma a n’ụwa dum, a ga na-akọ ihe nwaanyị a mere ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-echeta ya.”+ 14  Otu n’ime mmadụ iri na abụọ ahụ, onye a na-akpọ Judas Iskarịọt,+ gakwuuru ndị isi nchụàjà 15  wee sị: “Gịnị ka unu ga-enye m ka m rara ya nye n’aka unu?”+ Ha wee kwekọrịta inye ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.+ 16  Ya mere, malite mgbe ahụ gaa n’ihu, ọ nọ na-achọ ohere dị mma ọ ga-eji rara ya nye.+ 17  N’ụbọchị mbụ nke ememme achịcha na-ekoghị eko,+ ndị na-eso ụzọ Jizọs bịakwutere ya, sị: “Olee ebe ị chọrọ ka anyị kwadebere gị ka ị nọrọ rie nri ememme ngabiga?”+ 18  O wee sị: “Gaanụ n’ime obodo, n’ụlọ onye dị otú a.+ Sịnụ ya, Onye Ozizi sịrị, ‘Oge m a kara aka dị nso; mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eme ememme ngabiga n’ụlọ gị.’”+ 19  Ndị na-eso ụzọ Jizọs mere ihe o nyere ha n’iwu, ha wee kwadebe ihe maka ememme ngabiga ahụ.+ 20  Mgbe o ruru ná mgbede,+ ya na mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nọ na-eri ihe na tebụl.+ 21  Mgbe ha nọ na-eri ihe, ọ sịrị: “N’ezie, ana m asị unu, Otu onye n’ime unu ga-arara m nye.”+ 22  Ebe ihe a wutere ha nke ukwuu, ha niile n’otu n’otu malitere ịsị ya: “Onyenwe anyị, ọ bụghị m, ka ọ̀ bụ m?”+ 23  O wee zaa, sị: “Ọ bụ onye mụ na ya ga-esurukọ achịcha n’otu efere ga-arara m nye.+ 24  N’ezie, Nwa nke mmadụ na-aga ịnwụ, dị nnọọ ka e dere+ banyere ya, ma ahụhụ+ ga-adịrị onye a ga-esi n’aka ya rara Nwa nke mmadụ nye!+ Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya.” 25  Judas, bụ́ onye na-aga ịrara ya nye, wee zaa, sị: “Ọ bụghị m, ka ọ̀ bụ m, Rabaị?” O wee sị ya: “Ọ bụ gị kwuru ya.” 26  Mgbe ha nọ na-eri ihe, Jizọs weere otu ogbe achịcha.+ Mgbe ọ gọzichara ya, ọ nyawara ya,+ nye ya ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Naranụ, taa. Nke a pụtara ahụ́ m.”+ 27  O bukwaara iko.+ Mgbe o kelesịrị Chineke, o bunyekwara ha ya, sị: “Ṅụọnụ, unu niile;+ 28  n’ihi na nke a pụtara+ ‘ọbara m+ nke ọgbụgba ndụ ahụ,’+ nke a ga-awụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ+ maka mgbaghara mmehie.+ 29  Ma ana m asị unu, Malite ugbu a gaa n’ihu, agaghị m aṅụ mmanya a si ná mkpụrụ vaịn ma ọlị ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ ya nke ọhụrụ n’alaeze Nna m.”+ 30  N’ikpeazụ, mgbe ha bụsịrị abụ otuto,+ ha pụrụ gaa n’Ugwu Oliv.+ 31  Mgbe ahụ, Jizọs sịrị ha: “Unu niile ga-asụ ngọngọ n’ihi m n’abalị a, n’ihi na e dere, sị, ‘M ga-egbu onye ọzụzụ atụrụ, ìgwè atụrụ ya ga-agbasasịkwa.’+ 32  Ma mgbe a kpọlitesịrị m, m ga-ebu unu ụzọ gaa Galili.”+ 33  Ma Pita zara ya, sị: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile asụọ ngọngọ n’ihi gị, m gaghị asụ ngọngọ ma ọlị!”+ 34  Jizọs wee sị ya: “N’ezie, ana m asị gị, N’abalị a, tupu oké ọkpa akwaa, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ 35  Pita sịrị ya: “Ọ bụrụgodị na m ga-eso gị nwụọ, agaghị m agọnahụ gị ma ọlị.” Ndị ọzọ niile bụ́ ndị na-eso ụzọ ya kwukwara otu ihe ahụ.+ 36  Mgbe ahụ, ha na Jizọs bịara n’ebe+ a na-akpọ Getsemeni, o wee sị ndị na-eso ụzọ ya: “Nọdụnụ ala n’ebe a ka m gaa ebe nke ọzọ wee kpee ekpere.”+ 37  Ọ kpọọrọ Pita na ụmụ Zebedi abụọ+ wee malite inwe mwute, na-echegbukwa onwe ya nke ukwuu.+ 38  O wee sị ha: “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ọbụna ruo ọnwụ.+ Nọrọnụ n’ebe a, sorokwanụ m na-eche nche.”+ 39  Mgbe ọ gatụrụ n’ihu, o gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, kpee ekpere,+ sị: “Nna m, ọ bụrụ na o kwere omume, ka iko a+ gabiga m. Ma, ọ bụghị dị ka m si chọọ,+ kama dị ka i si chọọ.”+ 40  O wee bịakwute ndị na-eso ụzọ ya ma hụ ka ha na-ehi ụra, o wee sị Pita: “Ọ̀ bụ na unu enweghị ike iso m chee nche ruo ọbụna otu awa?+ 41  Na-echenụ nche+ ma na-ekpe ekpere+ mgbe niile, ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa.+ N’ezie, mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ́ adịghị ike.”+ 42  Ọ gara ọzọ kpee ekpere nke ugboro abụọ ya,+ sị: “Nna m, ọ bụrụ na ọ gaghị ekwe omume ka ọ gabiga ma ọ bụrụ na mụ aṅụghị ya, ka uche gị mee.”+ 43  O wee bịa ọzọ ma hụ ha ka ha na-ehi ụra, n’ihi na ụra juru ha n’anya.+ 44  Ya mere, mgbe ọ hapụrụ ha, ọ pụrụ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ ya,+ kwughachikwa otu ihe ahụ. 45  Mgbe ahụ, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya wee sị ha: “N’ụdị oge dị otú a ka unu na-ehi ụra, na-ezu ike! Lee! Oge awa ahụ eruwo nso ka a rara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmehie.+ 46  Bilienụ, ka anyị pụọ. Lee! Onye ga-arara m nye abịawo nso.”+ 47  Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, lee! Judas,+ otu n’ime mmadụ iri na abụọ ahụ, bịara, ya na oké ìgwè mmadụ ndị ji mma agha+ na okpiri, ndị si n’ebe ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu nọ bịa.+ 48  Onye ga-arara ya nye nyere ha ihe àmà, sị: “Onye ọ bụla m susuru ọnụ, ọ bụ ya; jidenụ ya.”+ 49  O wee gakwuru Jizọs kpọmkwem, sị: “Ndeewo, Rabaị!”+ o wee jiri nwayọọ susuo ya ọnụ.+ 50  Ma Jizọs+ sịrị ya: “Enyi, gịnị mere i ji bịa ebe a?” Ha wee kpara Jizọs aka, jide ya.+ 51  Ma, lee! otu n’ime ndị so Jizọs mịịrị mma agha ya, gbuo ya ohu nnukwu onye nchụàjà wee bepụ ya ntị.+ 52  Jizọs wee sị ya: “Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya,+ n’ihi na ndị niile na-eji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.+ 53  Ka ì chere na mụ apụghị ịrịọ Nna m ka o zitere m ugbu a ihe karịrị ụsụụ ndị mmụọ ozi iri na abụọ?+ 54  Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú Akwụkwọ Nsọ ga-esi mezuo, nke kwuru na ihe ga-esi otú a mee?” 55  N’oge awa ahụ, Jizọs sịrị ìgwè mmadụ ahụ: “Ùnu ji mma agha na okpiri bịa ijide m dị ka ùnu bịara ijide onye na-apụnara mmadụ ihe?+ M na-anọdụ ala kwa ụbọchị n’ụlọ nsọ,+ na-ezi ihe, ma unu ejideghị m. 56  Ma ihe a dum mere ka ihe ndị amụma dere n’Akwụkwọ Nsọ wee mezuo.”+ Ndị niile na-eso ụzọ ya wee hapụ ya gbaa ọsọ.+ 57  Ndị jidere Jizọs duuru ya gakwuru Keyafas,+ bụ́ nnukwu onye nchụàjà, n’ebe ndị odeakwụkwọ na ndị okenye zukọtara.+ 58  Ma Pita nọ na-eso ya n’azụ n’ebe dịtụ anya, ruo na mbara èzí+ nke nnukwu onye nchụàjà ahụ, mgbe ọ banyere n’ime, o so ndị na-eje ozi n’ụlọ nọdụ ala ka o wee hụ ihe ga-emesị mee.+ 59  N’oge ahụ, ndị isi nchụàjà na Sanhedrin dum na-achọgharị ihe ha ga-eji gbagide Jizọs akaebe ụgha ka ha wee gbuo ya,+ 60  ma ọ dịghị nke ha chọtara, ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị akaebe ụgha pụtara.+ E mesịa, mmadụ abụọ pụtara 61  wee sị: “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọ nsọ Chineke ma wuo ya n’ime ụbọchị atọ.’”+ 62  Nnukwu onye nchụàjà wee guzo ọtọ, sị ya: “Ó nweghị ihe ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu n’akaebe a ndị a na-agbagide gị?”+ 63  Ma Jizọs gbachiri nkịtị.+ Ya mere, nnukwu onye nchụàjà ahụ sịrị ya: “Eji m Chineke dị ndụ na-eme ka ị ṅụọ iyi+ na ị ga-agwa anyị ma ọ̀ bụ gị bụ Kraịst,+ Ọkpara Chineke!” 64  Jizọs sịrị+ ya: “Ọ bụ gị kwuru ya.+ Ma ana m asị unu, Site ugbu a+ gaa n’ihu, unu ga-ahụ Nwa nke mmadụ+ ka ọ nọ ọdụ n’aka nri+ nke ike ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.”+ 65  Mgbe ahụ, nnukwu onye nchụàjà ahụ dọwara uwe elu ya, sị: “O kwuluwo Chineke!+ Ọ̀ ka dị anyị mkpa ịchọ ndị akaebe?+ Lee! Ugbu a, unu anụwo nkwulu ahụ.+ 66  Gịnị bụ uche unu?” Ha zara, sị: “O kwesịrị ọnwụ.”+ 67  Mgbe ahụ, ha gbụrụ ya ọnụ mmiri n’ihu+ ma suo ya ọkpọ.+ Ndị ọzọ mara ya ụra n’ihu,+ 68  sị ya: “Buoro anyị amụma, gị bụ́ Kraịst.+ Ọ̀ bụ onye tiri gị ihe?”+ 69  Pita nọkwa ọdụ n’èzí, na mbara èzí ahụ; otu nwa agbọghọ na-eje ozi wee bịakwute ya, sị: “Gị onwe gị na Jizọs onye Galili na-anọ!”+ 70  Ma ọ gọrọ agọ n’ihu ha niile, sị: “Amaghị m ihe ị na-ekwu.” 71  Mgbe ọ gara n’ụlọ ọnụ ụzọ ámá, nwa agbọghọ ọzọ matara na ọ bụ ya wee gwa ndị nọ n’ebe ahụ, sị: “Nwoke a na Jizọs onye Nazaret nọrọ.”+ 72  Ọ gọkwara agọ, ṅụọ iyi, sị: “Amaghị m nwoke ahụ!”+ 73  Mgbe obere oge gasịrị, ndị guzo gburugburu bịara sị Pita: “N’ezie, gị onwe gị kwa bụ otu n’ime ha, n’ihi na, n’eziokwu, ire okwu gị na-arapụta gị.”+ 74  Mgbe ahụ, ọ malitere ịdụ ikwu na ịṅụ iyi, sị: “Amaghị m nwoke ahụ!” Ozugbo ahụ, oké ọkpa kwara.+ 75  Pita wee cheta ihe Jizọs kwuru, ya bụ: “Tupu oké ọkpa akwaa, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ O wee pụọ n’èzí, kwaa ákwá nke ukwuu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji