Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Matiu 20:1-34

20  “N’ihi na alaeze eluigwe dị ka otu onye nke bụ́ onyeisi ezinụlọ, onye pụrụ n’isi ụtụtụ ịga goo ndị ga-arụrụ ya ọrụ n’ubi vaịn ya.+  Mgbe ya na ndị ọrụ ahụ kwekọrịtara na ọ ga-akwụ ha otu mkpụrụ ego dinarịọs maka otu ụbọchị,+ o zigara ha n’ubi vaịn ya.  Mgbe ọ pụkwara n’ihe dị ka n’awa nke atọ,*+ ọ hụrụ ndị ọzọ ka ha guzo n’ọma ahịa+ n’enweghị ọrụ;  o wee sị ha, ‘Unu onwe unu, gaanụ n’ubi vaịn m, ihe ọ bụla kwesịrị ekwesị ka m ga-enye unu.’  Ha wee gawa. Ọ pụrụ ọzọ n’ihe dị ka n’awa nke isii*+ nakwa n’awa nke itoolu*+ wee mee otu ihe ahụ.  N’ikpeazụ, ọ pụrụ n’ihe dị ka n’awa nke iri na otu* wee hụ ka ndị ọzọ guzo, o wee sị ha, ‘Gịnị mere unu ji guzo n’ebe a ụbọchị dum n’enweghị ọrụ?’  Ha sịrị ya, ‘N’ihi na ọ dịghị onye goro anyị ọrụ.’ O wee sị ha, ‘Unu onwe unu, gaanụ n’ubi vaịn m.’+  “Mgbe o ruru uhuruchi,+ onye nwe ubi vaịn ahụ gwara onye na-elekọtara ya ọrụ, sị, ‘Kpọọ ndị ọrụ ahụ, kwụọ ha ụgwọ ọrụ ha,+ malite n’onye ikpeazụ ruo n’onye mbụ.’  Mgbe ndị awa nke iri na otu bịara, onye ọ bụla n’ime ha natara otu mkpụrụ ego dinarịọs. 10  Ya mere, mgbe ndị mbụ bịara, ha chere na ha ga-anata nke ka ukwuu; ma ha natakwara ụgwọ ọrụ nke bụ́ otu mkpụrụ ego dinarịọs. 11  Mgbe ha natara ya, ha malitere ịtamu ntamu megide onyeisi ezinụlọ ahụ+ 12  wee sị, ‘Ndị ikpeazụ a rụrụ ọrụ otu awa; n’agbanyeghị nke ahụ, i mere ka anyị na ha hara nhata, anyị ndị nọ na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ kemgbe ụtụtụ n’anwụ!’ 13  Ma ọ zara otu onye n’ime ha, sị, ‘Enyi, ọ dịghị ihe ọjọọ m mere gị. I kwere na m ga-akwụ gị otu mkpụrụ ego dinarịọs, ka ọ̀ bụ na i kweghị?+ 14  Nara ihe bụ́ nke gị lawa. Achọrọ m inye onye ikpeazụ a otu ihe ahụ m nyere gị.+ 15  Iwu ọ́ kwadoghị ka m jiri ihe ndị bụ́ nke m mee ihe m chọrọ? Ka ị̀ na-emere m anyaụfụ*+ maka na m bụ ezi mmadụ?’+ 16  Otú a, ndị ikpeazụ ga-abụ ndị mbụ, ndị mbụ ga-abụkwa ndị ikpeazụ.”+ 17  Mgbe Jizọs chọrọ ịgbago Jeruselem, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya iche,+ wee gwa ha n’okporo ụzọ, sị: 18  “Lee! Anyị na-agbago Jeruselem, a ga-enyefe Nwa nke mmadụ n’aka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ, ha ga-amakwa ya ikpe ọnwụ,+ 19  ha ga-enyefekwa ya n’aka ndị mba ọzọ ka ha were ya mee ihe ọchị, pịakwa ya ihe ma kpọgide ya n’osisi,+ n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya.”+ 20  Nne ụmụ Zebedi+ wee bịakwute ya, ya na ụmụ ya ndị ikom, kpọọrọ ya isiala ma rịọ ya ka o meere ya ihe.+ 21  Ọ sịrị ya: “Gịnị ka ị chọrọ?” Nwaanyị ahụ wee sị ya: “Kwuo ka ụmụ m ndị ikom abụọ a nọdụ ala, otu onye n’aka nri gị, otu onye n’aka ekpe gị, n’alaeze gị.”+ 22  Jizọs wee zaa, sị: “Unu amaghị ihe unu na-arịọ. Ùnu pụrụ ịṅụ iko+ nke m na-aga ịṅụ?” Ha sịrị ya: “Anyị pụrụ ịṅụ ya.” 23  O wee sị ha: “Unu ga-aṅụ iko m,+ ma ọ bụghị m na-eme ka a nọdụ n’aka nri m na n’aka ekpe m, kama ọ dịịrị ndị Nna m kwadebeere ya.”+ 24  Mgbe mmadụ iri ndị nke ọzọ nụrụ ihe a, ha wesoro ụmụnne abụọ ahụ iwe.+ 25  Ma mgbe Jizọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya, ọ sịrị: “Unu maara na ndị na-achị ndị mba ọzọ na-eme ha ka ọ̀ bụ ha nwe ha, ndị ukwu ha na-achịkwa ha n’aka ike.+ 26  O kwesịghị ịdị otú ahụ n’etiti unu;+ kama onye ọ bụla nke na-achọ ịbụ onye ukwu n’etiti unu aghaghị ịbụ onye na-ejere unu ozi,+ 27  onye ọ bụla nke na-achọkwa ịbụ onye mbụ n’etiti unu aghaghị ịbụ ohu unu.+ 28  Dị nnọọ ka Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi,+ ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”+ 29  Mgbe ha si Jeriko na-apụ,+ oké ìgwè mmadụ sooro ya. 30  Ma, lee! Mgbe ndị ìsì abụọ ndị nọ ọdụ n’akụkụ okporo ụzọ nụrụ na ọ bụ Jizọs na-agafe, ha tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, meere anyị ebere, Nwa Devid!”+ 31  Ma ìgwè mmadụ ahụ gwasiri ha ike ka ha mechie ọnụ; ma ha tisikwuru mkpu ike, sị: “Onyenwe anyị, meere anyị ebere, Nwa Devid!”+ 32  Jizọs wee kwụsị, kpọọ ha, sị: “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” 33  Ha sịrị ya: “Onyenwe anyị, ka e meghee anya anyị.”+ 34  N’ihi ọmịiko Jizọs nwere, o bitụrụ ha aka n’anya,+ ha wee hụwa ụzọ ozugbo wee soro ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ihe dị ka n’elekere itoolu nke ụtụtụ.
Ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.
Ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.
Ihe dị ka n’elekere ise nke mgbede.
Otú e si dee ya n’asụsụ Grik bụ “anya gị ọ̀ jọrọ njọ.”