Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Matiu 19:1-30

19  Mgbe Jizọs kwuchara ihe ndị a, o si na Galili pụọ wee bịa n’ókèala Judia n’ofe Jọdan.+  Oké ìgwè mmadụ sokwa ya, o wee gwọọ ha n’ebe ahụ.+  Ndị Farisii wee bịakwute ya, buru n’uche ka ha nwaa ya ọnwụnwa, sị: “Iwu ọ̀ kwadoro ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm n’ihi ụdị ihe ọ bụla?”+  Ọ zara, sị: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị+  wee sị, ‘N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya+ wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’?+  Nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”+  Ha sịrị ya: “Gịnịzi mere Mozis ji nye iwu ka e nye nwaanyị akwụkwọ nchụpụ, gbaakwa ya alụkwaghịm?”+  O wee sị ha: “Mozis kwetara ka unu na-agba nwunye unu alụkwaghịm n’ihi na obi kpọrọ unu nkụ,+ ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị site ná mmalite.+  Ana m asị unu na onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko, wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko.”+ 10  Ndị na-eso ụzọ ya wee sị ya: “Ọ bụrụ otú a ka ọ dị n’etiti nwoke na nwunye ya, ọ bụghị ihe amamihe dị na ya ịlụ nwunye.”+ 11  Ọ sịrị ha: “Ọ bụghị mmadụ niile ga-emeli ihe ahụ e kwuru, kama ọ bụ naanị ndị nwere onyinye ya.+ 12  N’ihi na e nwere ndị ọnaozi ndị a mụrụ otú ahụ site n’afọ nne ha,+ e nwekwara ndị ọnaozi ndị mmadụ mere ndị ọnaozi, nweekwa ndị ọnaozi ndị mere onwe ha ndị ọnaozi n’ihi alaeze eluigwe. Onye ọ bụla nke ga-emeli ya, ya mee ya.”+ 13  Mgbe ahụ, a kpọtaara ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka ma kpee ekpere; ma ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba.+ 14  Otú ọ dị, Jizọs sịrị: “Hapụnụ ụmụntakịrị ahụ, kwụsịkwanụ igbochi ha ịbịakwute m, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otú a.”+ 15  O wee bikwasị ha aka n’isi ma si ebe ahụ pụọ.+ 16  Ma, lee! otu onye bịakwutere ya wee sị: “Onye Ozizi, olee ihe ọma m na-aghaghị ime ka m wee nweta ndụ ebighị ebi?”+ 17  O wee sị ya: “Gịnị mere i ji ajụ m banyere ihe bụ́ ezi ihe? E nwere otu onye bụ́ ezi onye.+ Ma ọ bụrụ na ị chọrọ inweta ndụ, na-edebe ihe ndị e nyere n’iwu.”+ 18  Ọ sịrị ya: “Olee ndị ọ bụ?”+ Jizọs wee sị ya: “Egbula ọchụ,+ Akwala iko,+ Ezula ohi,+ Agbala akaebe ụgha,+ 19  Sọpụrụ nna gị na nne gị,+ na, Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”+ 20  Nwa okorobịa ahụ wee sị ya: “M na-edebe ihe a niile; gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?” 21  Jizọs sịrị ya: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ka i zuo okè, gaa ree ihe i nwere nye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe,+ bịakwa bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+ 22  Mgbe nwa okorobịa ahụ nụrụ okwu a, ọ lawara ná mwute, n’ihi na o nwere ọtụtụ ihe.+ 23  Ma Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’ezie, ana m asị unu na ọ ga-abụ ihe siri ike onye bara ọgaranya ịba n’alaeze eluigwe.+ 24  Ana m asị unu ọzọ, Ọ dịịrị kamel mfe isi n’anya agịga gafere karịa ọgaranya ịba n’alaeze Chineke.”+ 25  Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ ihe ahụ, o juru ha anya nke ukwuu, ha wee sị: “Ònyezi ka a pụrụ ịzọpụta?”+ 26  Jizọs lere ha anya n’ihu, sị ha: “Ihe a agaghị ekwe omume n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ma n’ebe Chineke nọ, ihe niile kwere omume.”+ 27  Pita wee sị ya: “Lee! Anyị ahapụwo ihe niile, soro gị; gịnịkwanụ ka anyị ga-enweta?”+ 28  Jizọs sịrị ha: “N’ezie, ana m asị unu, Mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ, mgbe Nwa nke mmadụ ga-anọdụ ala n’ocheeze ya dị ebube, unu onwe unu ndị sowooro m ga-anọdụkwa ala n’ocheeze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.+ 29  Onye ọ bụla nke hapụworo ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nna ma ọ bụ nne ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ala n’ihi aha m ga-enweta ihe karịrị ya okpukpu okpukpu, ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.+ 30  “Ma ọtụtụ ndị bụ́ ndị mbụ ga-abụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị mbụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji