Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Matiu 14:1-36

14  N’oge ahụ, Herọd, bụ́ onye na-achị ógbè ahụ, nụrụ akụkọ banyere Jizọs+  wee gwa ndị na-ejere ya ozi, sị: “Onye a bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim. E si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya, ọ bụ ya mere o ji na-arụ ọrụ ndị a dị ike.”+  N’ihi na Herọd jidere Jọn, kee ya agbụ, tụba ya n’ụlọ mkpọrọ n’ihi Herodias nwunye Filip nwanne ya.+  N’ihi na Jọn nọ na-asị ya: “Iwu akwadoghị ka ị lụrụ ya.”+  Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ọ chọrọ igbu ya, ọ tụrụ ìgwè mmadụ ahụ egwu, n’ihi na ha weere ya dị ka onye amụma.+  Ma mgbe a na-eme ememme ụbọchị ọmụmụ+ Herọd, ada Herodias gbara egwú n’ihu ndị ọbịa, wee mee Herọd obi ụtọ nke ukwuu  nke na ọ ṅụrụ iyi wee kwe nkwa inye ya ihe ọ bụla ọ rịọrọ.+  Ya mere, ọ gbasoro ntụziaka nne ya wee sị: “Bunye m isi Jọn Onye Na-eme Baptizim n’efere dị mbadamba.”+  Ọ bụ ezie na o wutere eze, o nyere iwu ka e buru ya nye ya, n’ihi iyi ọ ṅụrụ nakwa n’ihi ndị ha na ya nọ na-eri ihe;+ 10  o wee zipụ ozi ma mee ka e gbupụ Jọn isi n’ụlọ mkpọrọ. 11  E wee bute isi ya n’efere dị mbadamba bunye nwa agbọghọ ahụ, o wee butere ya nne ya.+ 12  N’ikpeazụ, ndị na-eso ụzọ ya bịara buru ozu ya gaa lie+ ma bịa kọọrọ Jizọs. 13  Mgbe Jizọs nụrụ ihe a, o ji ụgbọ mmiri si n’ebe ahụ pụọ gaa n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị, ka o wee nọọrọ onwe ya;+ ma mgbe ìgwè mmadụ ahụ nụrụ banyere ya, ha siri n’obodo dị iche iche jiri ụkwụ sochie ya. 14  Mgbe ọ pụtara, ọ hụrụ oké ìgwè mmadụ; o wee nwee ọmịiko+ n’ebe ha nọ, o wee gwọọ ndị ha na-arịa ọrịa.+ 15  Ma mgbe o ruru n’uhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya wee sị: “Ebe a bụ ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị, chi ejimiekwala; sị ìgwè mmadụ a lawa, ka ha gaa n’obodo nta dị iche iche zụrụ ihe ha ga-eri.”+ 16  Otú ọ dị, Jizọs sịrị ha: “Ọ dịghị mkpa ka ha laa; Nyenụ ha ihe ka ha rie.”+ 17  Ha sịrị ya: “Ọ dịghị ihe anyị nwere n’ebe a, ma e wezụga ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ.”+ 18  Ọ sịrị: “Wetaranụ m ha ebe a.” 19  O wee nye ìgwè mmadụ ahụ iwu ka ha nọdụ ala n’ahịhịa, o wee were ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ ahụ. O leliri anya n’eluigwe wee gọzie ha.+ Mgbe ọ nyawasịrị achịcha ndị ahụ, o kesaara ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya wee kesaara ha ìgwè mmadụ ahụ.+ 20  Ha niile wee rie, rijuo afọ, ha wee tụtụkọta ihe ha rifọrọ, o juru nkata iri na abụọ.+ 21  Ma ndị riri ya dị ihe dị ka puku ndị ikom ise, ma e wezụga ndị inyom na ụmụntakịrị.+ 22  N’egbughị oge, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye n’ụgbọ mmiri wee buru ya ụzọ gaa n’ofe osimiri, ma ya onwe ya sịrị ìgwè mmadụ ahụ lawa.+ 23  E mesịa, mgbe ọ sịrị ìgwè mmadụ ahụ lawa, ọ rịgooro n’elu ugwu naanị ya ikpe ekpere.+ Ọ bụ ezie na chi ejiwo, ọ nọ n’ebe ahụ naanị ya. 24  Ka ọ dị ugbu a, ụgbọ mmiri ahụ esiwo n’elu ala gaa ọtụtụ narị yad, ebili mmiri mekwara ka o sie ike ịkwọ ya,+ n’ihi na ifufe na-efegide ha. 25  Ma n’oge nche nke anọ* nke abalị, o jeere ije n’elu oké osimiri ahụ na-abịakwute ha.+ 26  Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-eje ije n’elu oké osimiri ahụ, obi lọrọ ha mmiri, ha wee na-asị: “Ọ bụ onyinyo ụgha!”+ Ha wee tie mkpu n’ihi egwu ha na-atụ. 27  Ma ozugbo, Jizọs gwara ha, sị: “Nweenụ obi ike, ọ bụ m;+ unu atụla egwu.” 28  Pita zara ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, gwa m ka m bịakwute gị n’elu mmiri.” 29  O wee sị: “Bịa!” Ya mere, mgbe Pita si n’ụgbọ ahụ pụta,+ o jere ije n’elu mmiri ahụ, gawa n’ebe Jizọs nọ. 30  Ma mgbe ọ hụrụ oké ifufe ahụ, egwu tụrụ ya. Mgbe ọ malitere imikpu, o tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, zọpụta m!” 31  Jizọs matịrị aka ozugbo, jide ya wee sị ya: “Gị onye okwukwe nta, gịnị mere i ji nwewe obi abụọ?”+ 32  Mgbe ha banyere n’ụgbọ ahụ, oké ifufe ahụ kwụsịrị. 33  Ya mere, ndị nọ n’ụgbọ ahụ kpọọrọ ya isiala, sị: “Ị bụ Ọkpara Chineke n’ezie.”+ 34  Ha wee gafeta ma bịa n’elu ala na Genesaret.+ 35  Mgbe ndị ebe ahụ matara onye ọ bụ, ha zigara ozi gburugburu ógbè ahụ dum, ndị mmadụ wee kpọtara ya ndị niile na-arịa ọrịa.+ 36  Ha wee na-arịọsi ya arịrịọ ike ka ha bitụ naanị ọnụ ọnụ uwe elu ya aka;+ e mekwara ka ahụ́ dịchaa ndị niile bitụrụ ya aka mma.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Lee ihe e dere n’ala ala peeji na Mak 13:35.