Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Matiu 12:1-50

12  N’oge ahụ, Jizọs gafeere ubi ọka wit n’ụbọchị izu ike.+ Agụụ gụwara ndị na-eso ụzọ ya, ha wee malite ịghọrọ ụyọkọ ọka wit na-ata.+  Mgbe ndị Farisii hụrụ ihe a, ha sịrị ya:+ “Lee! Ndị na-eso ụzọ gị na-eme ihe iwu na-akwadoghị ka e mee n’ụbọchị izu ike.”+  O wee sị ha: “Ọ̀ bụ na unu agụbeghị ihe Devid mere mgbe agụụ gụrụ ya na ndị ikom so ya?+  Ọ̀ bụ na ọ banyeghị n’ụlọ Chineke, ha wee rie achịcha e chere n’ihu Chineke,+ bụ́ ihe iwu na-akwadoghị+ ka o rie, ma ọ bụ ka ndị ahụ so ya rie, ma e wezụga naanị ndị nchụàjà?+  Ka ọ̀ bụ na unu agụbeghị n’Iwu ahụ+ na n’ụbọchị izu ike, ndị nchụàjà bụ́ ndị nọ n’ụlọ nsọ, na-eme ụbọchị izu ike dị ka ihe na-adịghị nsọ ma bụrụ ndị ikpe na-amaghị?+  Ma ana m agwa unu na e nwere ihe ka ụlọ nsọ ahụ+ n’ebe a.  Otú ọ dị, a sị na unu ghọtara ihe nke a pụtara, ‘Achọrọ m ebere,+ ọ bụghị àjà,’+ unu agaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe.  N’ihi na Nwa nke mmadụ bụ+ Onyenwe ụbọchị izu ike.”+  Mgbe o si ebe ahụ pụọ, ọ banyere n’ụlọ nzukọ ha; 10  ma, lee! e nwere otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ!+ Ha wee jụọ ya, sị, “Iwu ọ̀ kwadoro ịgwọ ọrịa n’ụbọchị izu ike?” ka ha wee nweta ebubo ha ga-ebo ya.+ 11  O wee sị ha: “Ònye n’ime unu nke nwere otu atụrụ bụ onye na-agaghị ejide ya dọpụta ya,+ ma ọ bụrụ na atụrụ ahụ adaba n’olulu+ n’ụbọchị izu ike? 12  Ebe ọ dị otú a, lee ka mmadụ si dị oké ọnụ ahịa karịa atụrụ!+ Ya mere, ọ bụ ihe iwu kwadoro ime ezi ihe n’ụbọchị izu ike.” 13  O wee sị nwoke ahụ: “Gbatịa aka gị.” O wee gbatịa ya, e wee mee ka ọ dị mma dị ka aka nke ọzọ.+ 14  Ma ndị Farisii pụrụ wee gbaara ya izu ka ha wee gbuo ya.+ 15  Ebe Jizọs matara nke a, o si ebe ahụ pụọ. Ọtụtụ ndị sokwaara ya, o wee gwọọ ha niile,+ 16  ma o nyesiri ha iwu ike ka ha ghara ime ka a mata onye ọ bụ;+ 17  ka ihe e kwuru site n’ọnụ Aịzaya onye amụma wee mezuo, bụ́ onye sịrị: 18  “Lee! Ohu m+ nke m họọrọ, onye m hụrụ n’anya,+ onye ihe ya masịrị mkpụrụ obi m! M ga-eme ka mmụọ m dịkwasị ya,+ ọ ga-eme ka ihe bụ́ ikpe ziri ezi doo mba niile anya. 19  Ọ gaghị ese okwu,+ ọ gaghịkwa etisi mkpu ike, ọ dịghịkwa onye ga-anụ olu ya n’okporo ámá. 20  Ọ dịghị ahịhịa amị e chihịara echihịa ọ ga-egwepịa, ọ dịghịkwa owu oriọna na-achọ ịnyụ anyụ ọ ga-emenyụ,+ ruo mgbe ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi+ nwee mmeri. 21  N’ezie, n’aha ya ka mba niile ga-enwe olileanya.”+ 22  Ha wee kpọtara ya nwoke mmụọ ọjọọ ji, bụ́ onye kpuru ìsì ma daa ogbi; o wee gwọọ ya, nke mere na nwoke ogbi ahụ kwuru okwu ma hụ ụzọ. 23  Ìgwè mmadụ ahụ dum nwere nnọọ oké ọṅụ ma malite ịsị:+ “Ọ̀ bụ na onye a abụghị Nwa Devid?”+ 24  Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe a, ha sịrị: “Ọ dịghị ihe ọzọ onye a ji achụpụ ndị mmụọ ọjọọ ma ọ́ bụghị ike Bielzebọb, onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ.”+ 25  Ebe ọ maara echiche ha,+ ọ sịrị ha: “Alaeze ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya na-atọgbọrọ n’efu,+ obodo ọ bụla ma ọ bụ ụlọ ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya agaghị eguzo. 26  N’otu ụzọ ahụ, ọ bụrụ na Setan achụpụ Setan, o kewawo wee na-emegide onwe ya; oleezi otú alaeze ya ga-esi guzo? 27  Ọ bụrụkwa na m ji ike Bielzebọb na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ,+ ọ̀ bụ ike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha? Ọ bụ ya mere ha ga-eji bụrụ ndị ga-ekpe unu ikpe. 28  Ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ Chineke ka m ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, alaeze Chineke akwaala unu n’ezie.+ 29  Ma ọ bụ, olee otú mmadụ ọ bụla pụrụ isi wakpo ụlọ nwoke dị ike ma buru ngwongwo ya ndị a pụrụ ibupụ ebupụ, ma ọ bụrụ na ọ bughị ụzọ kee nwoke ahụ dị ike agbụ? Mgbe ahụ, ọ ga-ebukọrọ ihe dị n’ụlọ ya.+ 30  Onye na-anọghị n’akụkụ m na-emegide m, onye na-esoghịkwa m na-ekpokọta ekpokọta na-ekposa ekposa.+ 31  “N’ihi nke a ka m ji asị unu, A ga-agbaghara ụmụ mmadụ ụdị mmehie na nkwulu ọ bụla, ma a gaghị agbaghara nkwulu e kwuluru mmụọ nsọ.+ 32  Dị ka ihe atụ, onye ọ bụla nke kwuru okwu megide Nwa nke mmadụ, a ga-agbaghara ya onye ahụ;+ ma onye ọ bụla nke kwuru okwu megide mmụọ nsọ, a gaghị agbaghara ya onye ahụ, ee e, ọ bụghị n’usoro ihe nke a ma ọ bụkwanụ na nke na-abịa abịa.+ 33  “Ma ọ́ bụghị ma unu mere ka osisi dị mma nakwa ka mkpụrụ ya dị mma, unu emee ka osisi ree ure nakwa ka mkpụrụ ya ree ure; n’ihi na a na-amata osisi site ná mkpụrụ ya.+ 34  Ụmụ ajụala,+ olee otú unu pụrụ isi kwuo ihe ọma, ebe unu bụ ndị ajọ omume?+ N’ihi na ọ bụ ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.+ 35  Ezi mmadụ na-esi n’ezi akụ̀ ya ewepụta ihe ọma,+ ebe ajọ mmadụ na-esi n’ajọ akụ̀ ya ewepụta ihe ọjọọ.+ 36  Ana m asị unu na okwu ọ bụla na-abaghị uru nke ụmụ mmadụ na-ekwu, ha ga-aza ajụjụ+ banyere ya n’Ụbọchị Ikpe; 37  n’ihi na a ga-esite n’okwu gị kpọọ gị onye ezi omume, a ga-esitekwa n’okwu gị maa gị ikpe.”+ 38  Mgbe ahụ, ụfọdụ n’ime ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii zara ya, sị: “Onye Ozizi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ihe ịrịba ama.”+ 39  Ọ zara ha, sị: “Ọgbọ ọjọọ nke na-akwa iko*+ na-achọ ihe ịrịba ama, ma ọ dịghị ihe ịrịba ama a ga-enye ya ma ọ́ bụghị ihe ịrịba ama nke Jona onye amụma.+ 40  N’ihi na dị nnọọ ka Jona+ nọrọ n’afọ nnukwu azụ̀ ụbọchị atọ, ehihie na abalị, otú ahụ ka Nwa nke mmadụ+ ga-anọ n’ime ala+ ụbọchị atọ, ehihie na abalị.+ 41  Ndị ikom Ninive ga-ebili n’oge ikpe, ha na ọgbọ a,+ ha ga-amakwa ya ikpe;+ n’ihi na ha chegharịrị n’ihe Jona+ kwusara, ma, lee! e nwere onye ka Jona n’ebe a. 42  A ga-akpọlite eze nwaanyị ndịda+ n’oge ikpe ya na ọgbọ a, ọ ga-amakwa ha ikpe; n’ihi na o si na nsọtụ ụwa bịa ịnụ amamihe Sọlọmọn, ma, lee! e nwere onye ka Sọlọmọn n’ebe a.+ 43  “Mgbe mmụọ na-adịghị ọcha si n’ime mmadụ pụta, ọ na-agabiga n’ebe mmiri na-adịghị ịchọ ebe izu ike, ọ dịghịkwa nke ọ na-achọta.+ 44  Mgbe ahụ, ọ na-asị, ‘M ga-alaghachi n’ụlọ m ebe m si pụọ’; mgbe ọ bịarutere, ọ na-ahụ na ọ tọgbọ nkịtị, na a zachara ya nke ọma, chọọkwa ya mma. 45  Mgbe ahụ, ọ na-aga kpọrọ mmụọ asaa dị iche iche, ndị dị njọ karịa ya,+ mgbe ha banyere, ha na-ebirikwa ebe ahụ; ọnọdụ ikpeazụ nke onye ahụ na-aka nke mbụ njọ.+ Otú ahụkwa ka ọ ga-adị ajọ ọgbọ a.”+ 46  Mgbe ọ ka nọ na-agwa ìgwè mmadụ ahụ okwu, lee! nne ya na ụmụnne ya ndị ikom+ guzo n’èzí na-achọ ịgwa ya okwu. 47  Ya mere, otu onye sịrị ya: “Lee! Nne gị na ụmụnne gị ndị ikom guzo n’èzí, ha chọrọ ịgwa gị okwu.” 48  Ọ zara onye ahụ na-akọrọ ya, sị: “Ònye bụ nne m, olee ndị bụkwa ụmụnne m ndị ikom?”+ 49  Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka, sị: “Lee! Ndị a bụ nne m na ụmụnne m ndị ikom!+ 50  N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme uche Nna m nke bi n’eluigwe, onye ahụ bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwaanyị, na nne m.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Mt 12:39*  Ma ọ bụ, “nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ.”