Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mak 7:1-37

7  Ndị Farisii na ụfọdụ ndị odeakwụkwọ ndị si Jeruselem bịa gbara ya gburugburu.+  Mgbe ha hụrụ ka ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ji aka e merụrụ emerụ, ya bụ, aka a na-akwọghị akwọ, na-eri nri+  n’ihi na ndị Farisii na ndị Juu niile adịghị eri ihe, ọ gwụla ma hà kwọrọ aka ha ruo n’ikpere aka, na-agbasosi ọdịnala nke ndị oge gboo ike,  mgbe ha si ahịa lọta, ha adịghị eri ihe ọ gwụla ma hà mere onwe ha ka ha dị ọcha site n’ifesa onwe ha mmiri; e nwekwara ọtụtụ ọdịnala+ ndị ọzọ ha natara ka ha na-agbasosi ike, ya bụ, ime iko na udu na arịa ọla kọpa baptizim;+  ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ a jụrụ ya, sị: “Gịnị mere na ndị na-eso ụzọ gị adịghị eme omume dị ka ọdịnala ndị oge gboo si dị, kama ha na-eji aka e merụrụ emerụ eri nri ha?”+  Ọ sịrị ha: “Aịzaya buru amụma n’ụzọ kwesịrị ekwesị banyere unu, unu ndị ihu abụọ, dị ka e dere,+ sị, ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị nnọọ anya n’ebe m nọ.+  Ọ bụ n’efu ka ha na-efe m ofufe, n’ihi na ozizi ha na-ezi bụ ihe mmadụ nyere n’iwu.’+  Unu na-ahapụ iwu Chineke ma na-agbasosi ọdịnala ụmụ mmadụ ike.”+  Ọ gakwara n’ihu ịsị ha: “Unu ji akọ na-eleghara ihe Chineke nyere n’iwu+ anya ka unu wee na-edebe ọdịnala unu. 10  Dị ka ihe atụ, Mozis sịrị, ‘Sọpụrụ nna gị na nne gị,’+ sịkwa, ‘Ka e gbuo onye kwujọrọ nna ya ma ọ bụ nne ya.’+ 11  Ma unu na-asị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ asị nna ya ma ọ bụ nne ya: “Ihe ọ bụla m nwere nke i nwere ike isi na ya rite uru n’aka m bụ kọban,+ (ya bụ, onyinye a raara nye Chineke,+)”’— 12  unu adịkwaghị ekwe ya ka o meere nna ya ma ọ bụ nne ya otu mkpụrụ ihe,+ 13  unu na-esi otú a eji ọdịnala unu, bụ́ nke unu nyefere ndị ọzọ, eme ka okwu Chineke+ ghara ịdị irè. Unu na-emekwa ọtụtụ ihe+ yiri nke a.” 14  Ya mere, mgbe ọ kpọrọ ìgwè mmadụ ahụ ọzọ ka ha bịakwute ya, ọ sịrị ha: “Geenụ m ntị, unu niile, ghọtakwanụ ihe okwu m pụtara.+ 15  Ọ dịghị ihe si n’ebe ọzọ nke banyere n’ime mmadụ nke pụrụ imerụ ya; kama ọ bụ ihe na-esi n’ime mmadụ apụta na-emerụ mmadụ.”+ 16*  —— 17  Mgbe ọ hapụrụ ìgwè mmadụ ahụ banye n’otu ụlọ, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịjụ ya ajụjụ banyere ihe atụ ahụ.+ 18  O wee sị ha: “Unu onwe unu kwa, ùnu bụ ndị na-enweghị nghọta dị ka ha?+ Ọ̀ bụ na unu amaghị na ọ dịghị ihe ọ bụla si n’ebe ọzọ banye n’ime mmadụ nke pụrụ imerụ ya, 19  ebe ọ bụ na ọ na-abanye, ọ bụghị n’ime obi ya, kama n’eriri afọ ya, o wee pụọ banye n’ime olulu nsị?”+ O si otú a mee ka a mara na ihe oriri niile dị ọcha.+ 20  Ọ sịkwara: “Ọ bụ ihe na-esi n’ime mmadụ apụta na-emerụ mmadụ;+ 21  n’ihi na ọ bụ n’ime mmadụ, n’obi ụmụ mmadụ,+ ka echiche ọjọọ dị iche iche si apụta: ịkwa iko,+ izu ohi, igbu ọchụ,+ 22  ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, inwe anyaukwu,+ ajọ omume, aghụghọ, omume rụrụ arụ,+ anyaụfụ, nkwulu, mpako, enweghị ezi uche. 23  Ihe ọjọọ ndị a niile na-esi n’ime apụta, ha na-emerụkwa mmadụ.”+ 24  O si ebe ahụ bilie wee banye n’ógbè ndị dị gburugburu Taya na Saịdọn.+ O wee banye n’otu ụlọ, ọ chọghịkwa ka onye ọ bụla mara. Ma ọ pụghị izopụ ka ndị mmadụ ghara ịhụ ya;+ 25  kama, ozugbo ahụ, otu nwaanyị nke obere nwa ya nwaanyị nwere mmụọ na-adịghị ọcha nụrụ banyere ya ma bịa daa n’ụkwụ ya.+ 26  Nwaanyị ahụ bụ onye Grik, onye si n’obodo Finishia nke dị na Siria; o wee na-arịọ ya ka ọ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ n’ahụ́ nwa ya nwaanyị.+ 27  Ma ọ malitere site n’ịsị ya: “Ka ụmụaka buru ụzọ rijuo afọ, n’ihi na o zighị ezi iwere nri ụmụaka+ tụpụrụ ụmụ nkịta.”+ 28  Otú ọ dị, nwaanyị ahụ zara ya, sị: “Ee, nna anyị ukwu, ma ụmụ nkịta ndị nọ n’okpuru tebụl na-eri irighiri ihe+ ndị si ná nri ụmụntakịrị.”+ 29  O wee sị ya: “N’ihi ihe a i kwuru, lawa; mmụọ ọjọọ ahụ apụwo n’ahụ́ nwa gị nwaanyị.”+ 30  O wee lawa n’ụlọ ya wee hụ+ nwatakịrị ahụ ka o dina n’ihe ndina, mmụọ ọjọọ ahụ apụwokwa. 31  Ka o si n’ógbè ndị dị gburugburu Taya na-alaghachi, o si Saịdọn gafere ruo n’oké osimiri Galili wee banye n’ime ógbè ndị dị gburugburu Dikapọlis.+ 32  N’ebe a, ha kpọtaara ya otu nwoke ntị chiri nke nwekwara nsogbu ikwu okwu, ha wee rịọsie ya arịrịọ ike ka o bikwasị ya aka.+ 33  O wee si n’ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ kpọrọ naanị ya pụọ wee rụnye mkpịsị aka ya n’ime ntị abụọ nke nwoke ahụ, mgbe ọ gbụpụsịrị ọnụ mmiri, o metụrụ ya aka n’ire.+ 34  O leliri anya n’eluigwe+ wee kuda ume,+ sị ya: “Efata,” ya bụ, “Meghee.” 35  E wee meghee ntị ya,+ a gwọkwara nsogbu ikwu okwu o nwere, o wee malite ikwu okwu nke ọma. 36  O wee nye ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla;+ ma ka ọ na-enyekwu ha iwu, ka ha na-akọsakwu ya.+ 37  N’ezie, ọ nọ na-eju ha anya nke ukwuu,+ ha wee sị: “O mewo ihe niile nke ọma. Ọ na-eme ka ndị ntị chiri nụ ihe, na-emekwa ka ndị dara ogbi kwuo okwu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Lee ihe e dere n’ala ala peeji na Mt 17:21.