Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mak 12:1-44

12  Ọ malitekwara iji ihe atụ na-agwa ha okwu, sị: “Otu nwoke kọrọ ubi vaịn,+ gbaakwa ya ogige gburugburu, ma gwuo olulu nke mmanya si n’ebe nzọchapụta mmanya ga na-agbanye, wuokwa ụlọ elu,+ ma nyefee ya n’aka ndị ọrụ ubi,+ wee gawa mba ọzọ.+  Mgbe oge ruru, o zipụrụ otu ohu ka ọ gakwuru ndị ọrụ ubi ahụ, ka o wee nata ndị ọrụ ubi ahụ ụfọdụ n’ime mkpụrụ nke ubi vaịn ahụ.+  Ma ha jidere ya, tikasịa ya ahụ́ ma hapụ ya ka ọ lawa n’enyeghị ya ihe ọ bụla.+  O zipụkwara ohu ọzọ ka ọ gakwuru ha; ha kụkwara nke ahụ ihe n’isi ma menye ya ihere.+  O wee ziga onye ọzọ, ha gbukwara onye nke ahụ; o zigakwara ọtụtụ ndị ọzọ, bụ́ ndị ha tikasịrị ụfọdụ n’ime ha ahụ́, gbuokwa ụfọdụ n’ime ha.  Ọ ka nwere otu onye ọzọ, bụ́ ọkpara ọ hụrụ n’anya.+ N’ikpeazụ, o zipụrụ ya ka ọ gakwuru ha, sị, ‘Ha ga-akwanyere ọkpara m ùgwù.’+  Ma ndị ọrụ ubi ahụ kwurịtara n’etiti onwe ha, sị, ‘Onye a bụ onye ga-eketa ubi a.+ Bịanụ ka anyị gbuo ya, ihe nketa a ga-abụkwa nke anyị.’+  Ha wee jide ya gbuo,+ tụpụ ya n’ubi vaịn ahụ.+  Gịnị ka onye nwe ubi vaịn ahụ ga-eme? Ọ ga-abịa bibie ndị ọrụ ubi ahụ, ọ ga-enyefekwa ndị ọzọ+ ubi vaịn+ ahụ. 10  Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị akụkụ Akwụkwọ Nsọ a, ‘Nkume+ ahụ nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ, ọ bụ ya ghọrọ nkume isi nkuku bụ́ isi.+ 11  Ihe a si n’aka Jehova, ọ dịkwa ebube n’anya anyị’?”+ 12  Ha wee malite ịchọ otú ha ga-esi jide ya, ma ha tụrụ ìgwè mmadụ ahụ egwu, n’ihi na ha matara na o bu ha n’obi mee ihe atụ ahụ. Ha wee hapụ ya pụọ.+ 13  Mgbe nke ahụ gasịrị, ha zipụrụ ụfọdụ n’ime ndị Farisii nakwa ụfọdụ n’ime ndị òtù Herọd+ ka ha gakwuru ya, ka ha wee jide ya n’okwu ọnụ ya.+ 14  Mgbe ha bịarutere, ha sịrị ya: “Onye Ozizi, anyị maara na ị na-ekwu eziokwu, ị dịghịkwa asọ onye ọ bụla anya, n’ihi na ị dịghị ele otú ndị mmadụ dị n’elu ahụ́ anya, kama ị na-ezi ụzọ Chineke n’eziokwu:+ Iwu ọ̀ kwadoro ịkwụ Siza ụtụ isi ka ọ̀ bụ na ọ kwadoghị? 15  Ọ̀ bụ anyị kwụọ, ka ọ̀ bụ anyị akwụla?”+ Mgbe ọ chọpụtara ihu abụọ ha, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-ele m ule? Wetaranụ m mkpụrụ ego dinarịọs ka m lee.”+ 16  Ha wetara otu. O wee sị ha: “Ihe a ọ̀ bụ onyinyo onye na aha onye?” Ha wee sị ya: “Ọ bụ nke Siza.”+ 17  Jizọs wee sị: “Kwụọnụ Siza ihe Siza,+ ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”+ Ihe o kwuru wee ju ha anya.+ 18  Ndị Sadusii, bụ́ ndị na-asị na mbilite n’ọnwụ adịghị, bịakwutere ya. Ha wee jụọ ya, sị:+ 19  “Onye Ozizi, Mozis deere anyị akwụkwọ na ọ bụrụ na nwanne mmadụ anwụọ wee hapụ nwunye ya, ma ọ mụtaghị nwa, nwanne ya nwoke+ kwesịrị ịkpọrọ nwunye ya wee si n’aka ya mụtara nwanne ya nwoke nwa.+ 20  E nwere ụmụnne asaa; nke mbụ lụrụ nwunye, ma mgbe ọ nwụrụ, ọ dịghị nwa ọ hapụrụ.+ 21  Nke abụọ wee lụwa ya, ma ọ nwụrụ n’amụtaghị nwa; o mekwara onye nke atọ n’otu ụzọ ahụ. 22  Mmadụ asaa ahụ amụtaghịkwa nwa ọ bụla. N’ikpeazụ, nwaanyị ahụ nwụkwara.+ 23  Ná mbilite n’ọnwụ, ònye n’ime ha ka ọ ga-abụ nwunye ya? Ebe ọ bụ na mmadụ asaa ahụ lụrụ ya.”+ 24  Jizọs sịrị ha: “Ọ́ bụghị n’ihi na unu amaghị Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ ike nke Chineke mere unu ji ehie ụzọ?+ 25  N’ihi na mgbe ha ga-esi ná ndị nwụrụ anwụ bilie, ndị ikom agaghị alụ nwunye, a gaghịkwa eke ndị inyom di, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe.+ 26  Ma banyere ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị a ga-akpọlite, ọ̀ bụ na unu agụghị n’akwụkwọ Mozis, n’ihe e dere banyere osisi ogwu ahụ, otú Chineke si gwa ya, sị, ‘Abụ m Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb’?+ 27  Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ Chineke ndị dị ndụ. Unu na-ehie ụzọ nke ukwuu.”+ 28  Otu n’ime ndị odeakwụkwọ bịara ebe ahụ nụ ka ha na-arụrịta ụka. Ebe ọ maara na ihe ọ zara ha dị mma, ọ jụrụ ya, sị: “Olee nke bụ́ nke mbụ n’ime ihe niile e nyere n’iwu?”+ 29  Jizọs zara, sị: “Nke mbụ bụ, ‘Nụrụ, Izrel, Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova,+ 30  jiri obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum, jirikwa ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’+ 31  Nke abụọ bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’+ Ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ e nyere n’iwu nke ka ndị a ukwuu.” 32  Odeakwụkwọ ahụ sịrị ya: “Onye Ozizi, ihe i kwuru bụ eziokwu, ‘Ọ bụ Otu, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ọ bụghị Ya’;+ 33  mmadụ ijikwa obi ya dum na nghọta ya dum na ike ya dum hụ ya n’anya nakwa mmadụ ịhụ onye agbata obi ya n’anya dị ka onwe ya dị nnọọ oké ọnụ ahịa karịa àjà nkịtị na àjà a na-esurecha n’ọkụ.”+ 34  Ya mere, mgbe Jizọs hụrụ na ọ zara dị ka onye maara ihe, ọ sịrị ya: “Ị nọghị alaeze Chineke ebe dị anya.” Ma ọ dịghịzi onye nwere obi ike ịjụ ya ajụjụ.+ 35  Otú ọ dị, mgbe Jizọs na-ezi ihe n’ụlọ nsọ, ọ sịrị: “Olee otú o si bụrụ na ndị odeakwụkwọ na-ekwu na Kraịst bụ nwa Devid?+ 36  Devid si n’ike mmụọ nsọ+ kwuo, sị: ‘Jehova gwara Onyenwe m, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m debere ndị iro gị n’okpuru ụkwụ gị.”’+ 37  Devid kpọrọ ya ‘Onyenwe m,’ ma olee otú o si bụrụ nwa ya?”+ Oké ìgwè mmadụ ahụ jikwa obi ụtọ na-ege ya ntị.+ 38  Mgbe ọ nọ na-ezi ihe, o kwuru, sị: “Lezienụ anya maka ndị odeakwụkwọ+ bụ́ ndị na-achọ ka ha yiri uwe mwụda na-ejegharị ma na-achọ ka a na-ekele ha n’ọma ahịa, 39  na-achọkwa oche ihu n’ụlọ nzukọ na ebe ndị kasị ùgwù ná nri anyasị.+ 40  Ọ bụ ha na-eripịa ụlọ+ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, na-ekpekwa ogologo ekpere iji megharịa ndị mmadụ anya; a ga-ama ha ikpe ka ukwuu.”+ 41  O wee nọdụ ala chee igbe a na-atụnye ego+ ihu wee malite ile otú ìgwè mmadụ ahụ si na-atụnye ego n’igbe ndị ahụ a na-atụnye ego; ọtụtụ ndị bara ọgaranya nọkwa na-atụnye ọtụtụ mkpụrụ ego.+ 42  Ma otu nwaanyị di ya nwụrụ bụ́ onye dara ogbenye bịara tụnye obere mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụtali ihe dị nnọọ nta.+ 43  Ya mere, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya wee sị ha: “N’ezie, ana m asị unu na nwaanyị a di ya nwụrụ, bụ́ onye dara ogbenye, tụnyere ihe karịa ihe ndị niile ahụ na-atụnye ego n’igbe ndị ahụ a na-atụnye ego tụnyere;+ 44  n’ihi na ha niile tụnyere ihe site n’ọtụtụ ihe ha nwere, ma nwaanyị a tụnyere ihe niile o nwere, ihe dum o ji biri, n’agbanyeghị na ọ nọ n’ụkọ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji