Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 8:1-56

8  Mgbe oge na-adịghị anya gachara, ọ nọ na-aga site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, sitekwa n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa ma na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke.+ Mmadụ iri na abụọ ahụ sokwa ya,  tinyere ụmụ nwaanyị+ ụfọdụ a chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ n’ahụ́ ha, gwọọkwa ọrịa dị iche iche, ya bụ, Meri onye a na-akpọ Magdalin, bụ́ onye mmụọ ọjọọ asaa si n’ahụ ya pụta,+  na Joana+ nwunye Kuza, bụ́ onye na-elekọtara Herọd ụlọ, na Suzana na ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị ọzọ, ndị ji ihe ha nwere na-ejere ha ozi.  Ma mgbe oké ìgwè mmadụ gbakọtara, ha na ndị si n’obodo dị iche iche bịakwute ya, o ji otu ihe atụ kwuo okwu,+ sị:  “Ọgha mkpụrụ gawara ịgha mkpụrụ ya. Ka ọ nọ na-agha mkpụrụ, ụfọdụ n’ime ha dara n’akụkụ ụzọ, e wee zọọ ha ụkwụ, anụ ufe nke eluigwe wee richapụ ha.+  Ndị ọzọ dara n’elu oké nkume, mgbe ha pulitere, ha kpọnwụrụ n’ihi na ha enweghị mmiri.+  Ndị ọzọ dara n’etiti ogwu, ogwu ndị ha na ha tolitekọrọ wee kpagbuo ha.+  Ndị ọzọ dara n’ezi ala, mgbe ha pulitere, ha mịrị mkpụrụ okpukpu otu narị.”+ Ka ọ na-akọ ihe ndị a, o tiri mkpu, sị: “Onye nwere ntị ige ntị, ya gee ntị.”+  Ma ndị na-eso ụzọ ya malitere ịjụ ya ihe ihe atụ a pụtara.+ 10  Ọ sịrị: “Ọ bụ unu ka e nyere ikike ịghọta ihe nzuzo ndị dị nsọ nke alaeze Chineke, ma a na-eji ihe atụ agwa ndị ọzọ okwu,+ ka ha wee na-ele anya ma na-ele na nkịtị, ka ha wee na-anụ ihe ma ghara ịghọta ihe ọ pụtara.+ 11  Ma nke a bụ ihe ihe atụ+ ahụ pụtara: Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke.+ 12  Ndị ahụ dara n’akụkụ ụzọ bụ ndị nụrụ okwu ahụ,+ Ekwensu+ wee bịa wepụ okwu ahụ n’obi ha ka ha wee ghara ikwere, e wee zọpụta ha.+ 13  Ndị ahụ dara n’elu oké nkume bụ ndị na-eji ọṅụ anabata okwu ahụ mgbe ha nụrụ ya, ma ha enweghị mgbọrọgwụ ọ bụla; ha na-ekwere ruo nwa oge, ma ha na-adapụ n’oge ule.+ 14  Ma ndị ahụ dara n’etiti ogwu bụ ndị nụrụ okwu ahụ, ma a na-akpagbu ha kpamkpam, ha adịghịkwa amịpụta mkpụrụ ọ bụla zuru okè, n’ihi na nchegbu na akụnụba na ihe ụtọ+ dị iche iche nke ndụ na-adọpụ uche ha.+ 15  Ma ndị ahụ dara n’ala dị mma bụ ndị na-ejigide okwu ahụ mgbe ha ji ezi obi nke dị mma+ nụ ya wee jiri ntachi obi na-amị mkpụrụ.+ 16  “Ọ dịghị onye ọ bụla nke na-amụnye oriọna ma were arịa kpuchie ya ma ọ bụ dọba ya n’okpuru ihe ndina, kama ọ na-adọba ya n’elu ihe ndọba oriọna, ka ndị na-abata n’ụlọ wee hụ ìhè ya.+ 17  N’ihi na ọ dịghị ihe e zoro ezo+ nke na-agaghị apụta ìhè, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla e zochiri nke ọma nke a na-agaghị amata, nke na-agaghịkwa apụta ìhè.+ 18  Ya mere, lezienụ anya otú unu si aṅa ntị, n’ihi na onye ọ bụla nke nwere ihe, a ga-enyekwu ya,+ ma onye ọ bụla nke na-enweghị, a ga-anapụ ya ọbụna ihe o chere na ya nwere.”+ 19  Ma nne ya na ụmụnne ya ndị ikom+ bịawara n’ebe ọ nọ, ma ha enweghị ike ịbịaru ebe ọ nọ n’ihi ìgwè mmadụ.+ 20  Otú ọ dị, a kọọrọ ya, sị: “Nne gị na ụmụnne gị ndị ikom guzo n’èzí na-achọ ịhụ gị.”+ 21  Ọ zara ha, sị: “Nne m na ụmụnne m ndị ikom bụ ndị a na-anụ okwu Chineke ma na-eme ya.”+ 22  N’otu n’ime ụbọchị ndị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ime otu ụgbọ, o wee sị ha: “Ka anyị gafee n’ofe nke ọzọ nke ọdọ mmiri a.” Ha wee jiri ụgbọ ahụ gawa.+ 23  Ma ka ha ji ụgbọ na-aga ụra buuru ya. Oké ifufe fere n’ọdọ mmiri ahụ, mmiri malitekwara iju n’ebe ha nọ, ha wee nọrọ n’ihe ize ndụ.+ 24  N’ikpeazụ, ha gakwuuru ya ma kpọtee ya, sị: “Onye ozizi, Onye ozizi, anyị na-aga ịla n’iyi!”+ Mgbe o tetara, ọ baara ifufe na ebili mmiri ahụ mba,+ ha dajụrụ, ebe niile wee daa jụụ. 25  O wee sị ha: “Olee ebe okwukwe unu dị?” Ma n’ihi egwu, ọ tụrụ ha n’anya, ha wee na-asị ibe ha: “Ònye n’ezie ka onye a bụ, n’ihi na ọ na-enye ọbụna ifufe na mmiri iwu, ha na-erubekwara ya isi?”+ 26  Ha wee kwụsị n’ikpere mmiri dị n’obodo ndị Geresa, bụ́ nke dị n’akụkụ chere Galili ihu.+ 27  Ma mgbe ọ pụtara n’elu ala, otu nwoke nke si n’obodo ahụ, onye mmụọ ọjọọ ji, zutere ya. Ọ dịtụwokwa anya ọ na-eyibeghị ákwà, ọ naghịkwa anọ n’ụlọ, kama ọ na-anọ n’ebe a na-eli ozu.+ 28  Mgbe ọ hụrụ Jizọs, o tisiri mkpu ike ma daa n’ala n’ihu ya, o jikwa oké olu kwuo, sị: “Jizọs, Ọkpara nke Chineke Onye Kasị Elu, gịnị jikọrọ mụ na gị?+ Ana m arịọ gị, emekpala m ahụ́.”+ 29  (N’ihi na ọ nọ na-enye mmụọ ahụ na-adịghị ọcha iwu ka o si n’ime nwoke ahụ pụta. Ọ dịla anya mmụọ ahụ jisiri ya ike,+ a na-ekekwa nwoke ahụ agbụ ígwè ma tụọ ya ị́gà ugboro ugboro, na-echekwa ya nche, ma ọ na-adọbi agbụ ndị ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ na-achụbakwa ya n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị.) 30  Jizọs jụrụ ya, sị: “Gịnị bụ aha gị?” O wee sị: “Ụsụụ,” n’ihi na ọtụtụ mmụọ ọjọọ abanyewo n’ime ya.+ 31  Ha nọgidekwara na-arịọsi ya arịrịọ ike+ ka ọ ghara inye ha iwu ka ha pụọ baa n’ime abis.+ 32  Ìgwè ézì dị ukwuu+ nọ na-eri ihe n’ebe ahụ n’elu ugwu; ha wee rịọsie ya arịrịọ ike ka o kwe ha ka ha banye n’ime ézì ndị ahụ.+ O wee kwe ha. 33  Mmụọ ọjọọ ndị ahụ wee si n’ime nwoke ahụ pụọ ma banye n’ime ézì ndị ahụ, ìgwè ézì ahụ nuuru gaa n’ebe kpọdara akpọda wee daba n’ọdọ mmiri, mmiri wee rie ha.+ 34  Ma mgbe ndị ahụ na-azụ ézì hụrụ ihe merenụ, ha gbara ọsọ ma kọọ akụkọ ya n’obodo ukwu na n’ime ime obodo.+ 35  Ma ndị mmadụ pụtara ịhụ ihe merenụ, ha wee bịakwute Jizọs ma hụ nwoke ahụ mmụọ ọjọọ si n’ime ya pụta, ka o yi uwe ma nọrọ ọdụ n’akụkụ ụkwụ Jizọs, uche zukwara ya okè; egwu wee jide ha.+ 36  Ndị hụrụ ya kọọrọ ha otú e si mee ka ahụ́ dị nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ji mma.+ 37  Ya mere, ìgwè mmadụ dum ndị si n’ógbè ndị gbara obodo ndị Geresa gburugburu gwara ya ka o si n’ebe ha nọ pụọ, n’ihi na oké egwu ji ha.+ O wee banye n’ụgbọ mmiri gawa. 38  Otú ọ dị, nwoke ahụ mmụọ ọjọọ si n’ime ya pụta nọ na-arịọ ka ya na ya nọrọ; ma ọ gwara nwoke ahụ ka ọ lawa wee sị:+ 39  “Laghachi n’ụlọ gị, na-akọkwa ihe niile Chineke meere gị.”+ O wee lawa, na-akọsa n’obodo ahụ dum ihe niile Jizọs meere ya.+ 40  Mgbe Jizọs laghachiri, ìgwè mmadụ ahụ ji obiọma nabata ya, n’ihi na ha niile nọ na-atụ anya ya.+ 41  Ma, lee! otu nwoke aha ya bụ Jeirọs bịara, nwoke a bụkwa onyeisi oche nke ụlọ nzukọ. O wee daa n’ụkwụ Jizọs ma malite ịrịọsi ya arịrịọ ike ka ọ bata n’ime ụlọ ya,+ 42  n’ihi na o nwere otu nwa nwaanyị ọ mụrụ naanị ya, onye dị ihe dị ka afọ iri na abụọ, ọ nọkwa n’ọnụ ọnwụ.+ Ka ọ nọ na-eje, ìgwè mmadụ ahụ na-adagide ya.+ 43  Otu nwaanyị, onye na-arịa ọrịa oruru ọbara+ kemgbe afọ iri na abụọ, bụ́ onye na-enwebeghị ike inweta onye ọ bụla ga-agwọ ya,+ 44  si n’azụ bịaruo ya nso ma bitụ ọnụ ọnụ+ uwe elu ya aka,+ ozugbo ahụkwa ọrịa oruru ọbara ya kwụsịrị.+ 45  Ya mere, Jizọs sịrị: “Ònye bitụrụ m aka?”+ Mgbe ha niile nọ na-agọ agọ, Pita sịrị: “Onye Ozizi, ìgwè mmadụ gbara gị gburugburu ma na-adagide gị.”+ 46  Ma Jizọs sịrị: “Ọ dị onye bitụrụ m aka, n’ihi na m ghọtara na ike+ pụrụ m n’ahụ́.”+ 47  Mgbe nwaanyị ahụ hụrụ na a matawo ihe o mere, ọ maara jijiji bịa daa n’ala n’ihu ya wee kwuo n’ihu mmadụ niile ihe mere o ji bitụ ya aka na otú e si gwọọ ya n’otu ntabi anya.+ 48  Ma ọ sịrị ya: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma;+ lawa n’udo.”+ 49  Ka ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, otu onye nnọchiteanya nke onyeisi oche ụlọ nzukọ bịara, sị: “Nwa gị nwaanyị anwụọla; enyezila onye ozizi nsogbu.”+ 50  Mgbe Jizọs nụrụ nke a, ọ zara ya, sị: “Atụla egwu, naanị nwee okwukwe,+ a ga-azọpụta ya.” 51  Mgbe o rutere n’ụlọ ahụ, o kweghị ka onye ọ bụla soro ya banye ma e wezụga Pita na Jọn na Jems na nne na nna nwata nwaanyị ahụ.+ 52  Ma mmadụ niile nọ na-akwa ákwá, na-eti aka n’obi wee na-eruru ya uju. O wee sị: “Kwụsịnụ ịkwa ákwá,+ n’ihi na ọ nwụghị anwụ kama ọ na-ehi ụra.”+ 53  Ha wee malite ịchị ya ọchị, na-akwa ya emo, n’ihi na ha maara na ọ nwụwo.+ 54  Ma o seere ya n’aka ma kwuo n’olu dara ụda, sị: “Nwata nwaanyị, bilie!”+ 55  Mmụọ+ ya wee laghachi, o wee bilie ozugbo+ ahụ, o nyekwara iwu ka e nye ya ihe ka o rie.+ 56  Ndị mụrụ ya wee jupụta n’obi ụtọ; ma ọ gwara ha ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla ihe merenụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji