Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 5:1-39

5  N’otu oge, mgbe ìgwè mmadụ nọ na-adagide ya, na-egekwa ntị n’okwu Chineke, o guzo n’akụkụ ọdọ mmiri Genesaret.+  O wee hụ ụgbọ abụọ a dọsara n’akụkụ ọdọ mmiri ahụ, ma ndị ọkụ azụ̀ esiwo na ha pụta wee na-asacha ụgbụ ha.+  Ka ọ banyere n’otu n’ime ụgbọ ndị ahụ, bụ́ nke Saịmọn, ọ gwara ya ka o si n’elu ala kwọpụ nke nta. O wee nọdụ ala, malitekwa izi ìgwè mmadụ ahụ ihe site n’ụgbọ+ ahụ.  Mgbe ọ kwụsịrị ikwu okwu, ọ sị Saịmọn: “Kwọrọ ụgbọ a banye n’ebe dị omimi, wụnyekwanụ ụgbụ+ unu ka unu wee gbute azụ̀.”  Ma Saịmọn zara ya, sị: “Onye ozizi, anyị dọgburu onwe anyị n’ọrụ abalị dum n’egbuteghị ihe ọ bụla,+ ma ebe i kwuru ya, aga m awụnye ụgbụ.”  Mgbe ha wụnyere ya, ha gbutere azụ̀ dị nnọọ ukwuu. N’eziokwu, ụgbụ ha malitere ịdọwa.  Ya mere, ha feere ndị ibe ha nọ n’ụgbọ nke ọzọ aka ka ha bịa nyere ha aka;+ ha bịakwara, ha wee kpojuo ụgbọ abụọ ahụ, nke mere na ụgbọ ndị a malitere imi.  Mgbe Saịmọn Pita+ hụrụ nke a, ọ dara n’ala n’ụkwụ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, si n’ebe m nọ pụọ, n’ihi na abụ m onye mmehie.”+  N’ihi na mgbe ha gbutere azụ̀ ndị ahụ, o juru ya na ndị niile ha na ya nọ anya, 10  o jukwara ma Jems ma Jọn, ụmụ Zebedi+ anya, bụ́ ndị ha na Saịmọn na-arụkọ ọrụ. Ma Jizọs sịrị Saịmọn: “Kwụsị ịtụ egwu. Site ugbu a gaa n’ihu, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.”+ 11  Ya mere, ha kwọọrọ ụgbọ ndị ahụ gaghachi n’elu ala. Ha gbahapụkwara ihe niile ma soro ya.+ 12  N’oge ọzọkwa, ka ọ nọ n’otu n’ime obodo ndị ahụ, lee! e nwere otu nwoke nke ekpenta zuru ahụ́! Mgbe ọ hụrụ Jizọs, o gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, wee rịọ ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ nnọọ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”+ 13  O wee matịa aka bitụ ya, sị: “Achọrọ m. Dị ọcha.” Ozugbo ahụkwa, ekpenta ahụ pụrụ n’ahụ́ ya.+ 14  O wee nye nwoke ahụ iwu ka ọ ghara ịkọrọ onye ọ bụla.+ Ọ sịrị ya: “Kama gaa gosi onye nchụàjà onwe gị,+ chụọkwa àjà+ maka ime ka ị dị ọcha, dị nnọọ ka Mozis nyere ntụziaka ya, ka o wee bụụrụ ha ihe àmà.”+ 15  Ma okwu banyere ya nọ na-agbasakwu, oké ìgwè mmadụ na-agbakọtakwa ka ha gee ya ntị, ka ọ gwọọkwa ha ọrịa na-arịa ha.+ 16  Otú ọ dị, ọ nọgidere n’ebe ahụ ọ nọpụrụ iche n’ọzara, na-ekpekwa ekpere.+ 17  N’otu ụbọchị, ọ nọ na-ezi ihe, ndị Farisii na ndị na-akụzi iwu, bụ́ ndị si n’obodo nta niile dị na Galili na Judia na Jeruselem bịa, nọkwa ọdụ n’ebe ahụ. O nwekwara ike Jehova nke ọ ga-eji na-agwọ ọrịa.+ 18  Ma, lee! e nwere ndị ikom ndị bu otu nwoke nke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ n’ihe ndina, ha nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi bubata ya ma dọba ya n’ihu ya.+ 19  Ebe ha na-ahụghị ụzọ ha ga-esi bubata ya n’ihi ìgwè mmadụ ahụ, ha rịgooro n’elu ụlọ, sikwa n’uko ụlọ buda ya n’obere ihe ndina ahụ n’etiti ndị nọ n’ihu Jizọs.+ 20  Mgbe ọ hụrụ okwukwe ha, ọ sị: “Nwoke m, a gbagharawo gị mmehie gị.”+ 21  Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii wee malite ịtụgharị n’uche ha, sị: “Ònye bụ onye a nke na-ekwu okwu nkwulu?+ Ònye pụrụ ịgbaghara mmehie ma ọ́ bụghị naanị Chineke?”+ 22  Ma mgbe Jizọs chọpụtara ihe ha na-atụgharị n’uche, ọ zara ha, sị: “Gịnị ka unu na-atụle n’obi unu?+ 23  Olee nke ka mfe, ọ̀ bụ ịsị, ‘A gbagharawo gị mmehie gị,’ ka ọ̀ bụ ịsị, ‘Bilie gawa ije’?+ 24  Ma ka unu wee mara na Nwa nke mmadụ nwere ikike n’elu ụwa ịgbaghara mmehie—” ọ gwara nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Ana m asị gị, Bilie buru obere ihe ndina gị, lawa n’ụlọ gị.”+ 25  O wee bilie ozugbo ahụ n’ihu ha, buru ihe ọ na-ejibu edina ala lawa n’ụlọ ya, na-enye Chineke otuto.+ 26  O wee ju ha niile anya.+ Ha malitekwara inye Chineke otuto. Egwu wee jide ha, ha wee na-asị: “Anyị ahụwo ihe ọhụrụ taa!”+ 27  Ma mgbe ihe ndị a gasịrị, ọ pụrụ ma hụ otu onye ọnaụtụ aha ya bụ Livaị ka ọ nọ ọdụ n’ụlọ a na-anakọta ụtụ isi, o wee sị ya: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+ 28  Ọ gbahapụkwara ihe niile,+ bilie wee soro ya. 29  Livaị mekwaara ya oké oriri n’ụlọ ya iji nabata ya; e nwekwara oké ìgwè ndị ọnaụtụ na ndị ọzọ bụ́ ndị ha na ha nọ na-eri nri.+ 30  Ya mere, ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ ha malitere ịtamuru ndị na-eso ụzọ ya ntamu, na-asị: “Gịnị mere unu ji soro ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ?”+ 31  Jizọs zara ha, sị: “Mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma,+ kama mkpa ya dị ndị ahụ́ na-enye nsogbu.+ 32  Ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie, ka ha wee chegharịa.”+ 33  Ha sịrị ya: “Ndị na-eso ụzọ Jọn na-ebu ọnụ ugboro ugboro, na-arịọsikwa arịrịọ ike, otú ahụkwa ka ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na-eme, ma ndị nke gị na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ.”+ 34  Jizọs sịrị ha: “Unu apụghị ime ka ndị enyi nke nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na-ebu ọnụ mgbe ha na nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ nọ, ka ùnu pụrụ?+ 35  Ma ụbọchị ga-abịa mgbe a ga-akpọpụ+ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ+ n’ebe ha nọ n’ezie; mgbe ahụ ha ga-ebu ọnụ n’ụbọchị ndị ahụ.”+ 36  Ọ gakwara n’ihu inye ha otu ihe atụ, sị: “Ọ dịghị onye na-esi n’uwe elu ọhụrụ achabita ibé ákwà ma dụnye ya n’uwe elu meworo ochie; ma ọ bụrụ na o mee otú ahụ, ibé ákwà ọhụrụ ahụ na-adọkapụ, ibé ákwà nke si n’uwe ọhụrụ ahụ adịghịkwa ekwekọ na nke ochie ahụ.+ 37  Ọ dịghịkwa onye na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya mere ochie; ma ọ bụrụ na o mee otú ahụ, mmanya ọhụrụ ahụ ga-agbawa karama akpụkpọ mmanya+ ahụ, ọ ga-awụfusikwa, karama akpụkpọ mmanya ahụ ga-alakwa n’iyi.+ 38  Kama a ghaghị ịgbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya ọhụrụ. 39  Ọ dịghị onye ọ bụla nke ṅụrụ mmanya ochie nke na-achọ nke ọhụrụ; n’ihi na ọ na-asị, ‘Nke ochie+ ahụ dị mma.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji