Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 3:1-38

3  N’afọ nke iri na ise nke ọchịchị Taịbiriọs Siza, mgbe Pọntiọs Paịlet bụ gọvanọ Judia, Herọd+ abụrụkwa onye na-achị ógbè Galili, ma Filip nwanne ya bụ onye na-achị ógbè Ituria na Trakọnaịtis, Laịsenias abụrụkwa onye na-achị ógbè Abilini,  n’ụbọchị onyeisi nchụàjà bụ́ Anas na n’ụbọchị Keyafas,+ okwu Chineke ruru Jọn+ nwa Zekaraya ntị n’ala ịkpa.+  O wee na-agagharị n’ógbè niile dị gburugburu Jọdan, na-ekwusa baptizim dị ka ihe na-egosi nchegharị bụ́ nke na-eme ka a gbaghara mmehie,+  dị nnọọ ka e dere n’akwụkwọ nke okwu Aịzaya onye amụma, sị: “Geenụ ntị! E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị, ‘Kwadebenụ ụzọ Jehova, meenụ ka okporo ụzọ ya kwụrụ ọtọ.+  A ghaghị ikpochi okokoro ọ bụla, kposaakwa ugwu ukwu niile na ugwu nta niile, ebe ndị gbara ngọ aghaghịkwa ịghọ ụzọ ndị kwụ ọtọ, ebe ndị na-adịghị larịị aghọọkwa ụzọ ndị dị larịị;+  anụ ahụ́ niile ga-ahụkwa onye Chineke ga-esi n’aka ya weta nzọpụta.’”+  Ya mere, ọ malitere ịgwa ìgwè mmadụ ndị na-apụta ka o mee ha baptizim, sị: “Unu ụmụ ajụala,+ ònye gwara unu ka unu gbanahụ ọnụma ahụ nke na-abịa?+  Ya mere, mịanụ mkpụrụ kwesịrị nchegharị.+ Unu asịkwala n’ime onwe unu, ‘Ebreham bụ nna anyị.’ N’ihi na ana m asị unu na Chineke nwere ike ime ka Ebreham nweta ụmụ site na nkume ndị a.  N’ezie, anyụike adịrịwo na mgbọrọgwụ osisi, n’ihi ya, a ga-egbutu osisi ọ bụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ, tụbakwa ya n’ọkụ.”+ 10  Ìgwè mmadụ ahụ na-ajụkwa ya, sị: “Gịnịzi ka anyị ga-eme?”+ 11  Ọ na-aza ha, sị: “Onye nwere uwe ime abụọ, ya chịnye onye ọ na-adịghị nke o nwere otu, onye nwere ihe ọ na-eri, ya meekwa otú ahụ.”+ 12  Ma ọbụna ndị ọnaụtụ bịara ka e mee ha baptizim, ha wee sị ya: “Onye Ozizi, gịnị ka anyị ga-eme?”+ 13  Ọ sị ha: “Unu anala ihe ọ bụla karịrị ego a na-akwụ n’ụtụ isi.”+ 14  Ndị agha na-ajụkwa ya, sị: “Gịnịkwa ka anyị ga-eme?” Ọ na-asịkwa ha: “Unu awakpola onye ọ bụla ma ọ bụ bo onye ọ bụla ebubo+ ụgha, kama ka ihe a na-enye unu ju unu afọ.”+ 15  Ka ndị Juu nọ na-atụ anya, ka mmadụ niile nọkwa na-atụle n’obi ha banyere Jọn, sị: “Ọ̀ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst?”+ 16  Jọn zara ha niile, sị: “Mụ onwe m ji mmiri na-eme unu baptizim; ma onye ka m ike na-abịa, bụ́ onye m na-erughị eru ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.+ Ọ ga-eji mmụọ nsọ na ọkụ mee unu baptizim.+ 17  O ji shọvel o ji afụcha ihe n’aka iji debe ebe nzọcha mkpụrụ ya ọcha nke ọma nakwa ka o kpokọba+ ọka wit n’ụlọ nkwakọba ihe ya, ma ọ ga-agba igbogbo+ ya ọkụ n’ọkụ+ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.” 18  Ya mere, o kwukwara ọtụtụ okwu ndụmọdụ ndị ọzọ ma na-ezisara ndị mmadụ ozi ọma. 19  Ma ebe ọ bụ na Jọn katọrọ Herọd onye na-achị ógbè ahụ n’ihi Herodias bụ́ nwunye nwanne ya nakwa n’ihi ihe ọjọọ niile Herọd mere,+ 20  Herọd mekwuru ihe ọjọọ ọzọ: ọ kpọchiri Jọn n’ụlọ mkpọrọ.+ 21  Ma mgbe a nọ na-eme ndị ahụ niile baptizim, e mekwara Jizọs+ baptizim, ka ọ nọ na-ekpe ekpere, e meghere eluigwe,+ 22  mmụọ nsọ wee bekwasị ya n’ọdịdị nduru, otu olu wee si n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; ihe gị masịrị m.”+ 23  Jizọs dị ihe dị ka afọ iri atọ+ mgbe o bidoro ọrụ ya.+ Ọ bụkwa, dị ka e chere,nwa+ Josef,+nwa Hilaị, 24  nwa Matat,nwa Livaị,nwa Melkaị,nwa Janaị,nwa Josef, 25  nwa Matatayas,nwa Emọs,nwa Nehọm,nwa Eslaị,nwa Nagaị, 26  nwa Meyat,nwa Matatayas,nwa Semein,nwa Josek,nwa Joda, 27  nwa Joanan,nwa Risa,nwa Zerọbabel,+nwa Shieltiel,+nwa Niraị, 28  nwa Melkaị,nwa Adaị,nwa Kosam,nwa Elmedam,nwa Ea, 29  nwa Jizọs,nwa Elịiza,nwa Jorim,nwa Matat,nwa Livaị, 30  nwa Simiọn,nwa Judas,nwa Josef,nwa Jonam,nwa Elayakim, 31  nwa Milia,nwa Mena,nwa Matata,nwa Netan,+nwa Devid,+ 32  nwa Jesi,+nwa Obed,+nwa Boaz,+nwa Salmọn,+nwa Nashọn,+ 33  nwa Aminadab,+nwa Anaị,+nwa Hezrọn,+nwa Pirez,+nwa Juda,+ 34  nwa Jekọb,+nwa Aịzik,+nwa Ebreham,+nwa Tira,+nwa Nehọ,+ 35  nwa Sirọg,+nwa Riu,+nwa Pileg,+nwa Iba,+nwa Shila,+ 36  nwa Kaịnan,nwa Apakshad,+nwa Shem,+nwa Noa,+nwa Lemek,+ 37  nwa Metusela,+nwa Inọk,+nwa Jered,+nwa Mahalelel,+nwa Kaịnan,+ 38  nwa Inọsh,+nwa Set,+nwa Adam,+nwa Chineke.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji