Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 23:1-56

23  Ìgwè mmadụ ahụ niile wee bilie kpụgara ya Paịlet.+  Ha wee malite ibo ya ebubo,+ sị: “Anyị chọpụtara na nwoke a na-ekpu mba anyị ihu+ ma na-amachibido ịkwụ Siza ụtụ isi,+ na-ekwukwa na ya onwe ya bụ Kraịst, bụ́ eze.”+  Paịlet wee jụọ ya, sị: “Ị̀ bụ eze ndị Juu?” Ọ zara ya, sị: “Ọ bụ gị kwuru ya.”+  Paịlet wee gwa ndị isi nchụàjà na ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Ahụghị m ihe ọjọọ ọ bụla nwoke a mere.”+  Ma ha kwusiwere ike, sị: “Ọ na-akpasu ndị mmadụ ime aghara site n’izi ihe n’ime Judia dum, malite na Galili ruo ebe a.”  Mgbe Paịlet nụrụ ihe a, ọ jụrụ ma nwoke a ọ̀ bụ onye Galili,  mgbe ọ chọpụtara na o si n’ógbè Herọd na-achị, o zigaara ya Herọd,+ bụ́ onye nọkwa na Jeruselem n’ụbọchị ndị a.  Mgbe Herọd hụrụ Jizọs, ọ ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu, n’ihi na ọ dịwo anya ọ nọ na-achọ ịhụ+ ya n’ihi na ọ nụwo+ banyere ya, ọ nọkwa na-enwe olileanya ịhụ ihe ịrịba ama ụfọdụ ọ ga-eme.  O wee malite ịjụ ya ọtụtụ ajụjụ; ma ọ zaghị ya ihe ọ bụla.+ 10  Otú ọ dị, ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ nọgidere na-ebili ma na-ebosi ya ebubo ike.+ 11  Herọd na ndị agha na-eche ya nche kparịrị ya,+ jirikwa ya mee ihe ọchị+ site n’iyiwe ya uwe mara mma, wee zighachiri ya Paịlet. 12  Herọd na Paịlet+ ghọziri ndị enyi n’ụbọchị ahụ, n’ihi na tupu mgbe ahụ, ha nọ na-ebuso ibe ha iro. 13  Paịlet wee kpọkọta ndị isi nchụàjà na ndị na-achị achị na ìgwè mmadụ ahụ 14  wee sị ha: “Unu kpọtaara m nwoke a dị ka onye na-akpali ndị mmadụ inupụ isi, ma, lee! agbara m ya ajụjụ n’ihu unu ma ahụghị m ihe ọ bụla nwoke a mere+ nke gosiri na ebubo ndị unu na-ebo ya bụ eziokwu. 15  N’eziokwu, Herọd ahụghịkwa, n’ihi na o zighachiteere anyị ya; ma, lee! ọ dịghị ihe kwesịrị ọnwụ+ o mere. 16  Ya mere, m ga-apịa ya ihe+ ma hapụ ya.” 17*  —— 18  Ma ha na ìgwè mmadụ ahụ dum tiri mkpu, sị: “Kpọrọ onye a pụọ,+ ma hapụrụ anyị Barabas!”+ 19  (Bụ́ nwoke a tụbara n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na ọ kpaliri ndị mmadụ imegide ọchịchị n’obodo ahụ, nakwa n’ihi igbu ọchụ.) 20  Paịlet wee gwa ha okwu ọzọ, n’ihi na ọ chọrọ ịhapụ Jizọs.+ 21  Ha wee malite iti mkpu, na-asị: “Kpọgide ya n’osisi! Kpọgide ya n’osisi!”+ 22  Na nke ugboro atọ ya, ọ sịrị ha: “N’ihi gịnị, olee ihe ọjọọ nwoke a mere? Ahụghị m ihe ọ bụla o mere nke ga-eme ka e gbuo ya; ya mere, m ga-apịa ya ihe ma hapụ ya.”+ 23  Ha wee jiri oké olu malite inye ya nsogbu, na-ekwusi ike ka a kpọgide ya n’osisi; olu ha wee karịa nke ya.+ 24  Ya mere, Paịlet biri ikpe wee kwuo ka e mee ihe ha chọrọ:+ 25  ọ hapụrụ+ nwoke ahụ a tụbara n’ụlọ mkpọrọ n’ihi imegide ọchịchị na igbu ọchụ, bụ́ onye ha chọrọ, ma o nyefere Jizọs ka ha mee ya ihe ha chọrọ.+ 26  Ma ka ha kpụ ya na-apụ, ha jidere Saịmọn, bụ́ onye Saịrini, ka o si n’ime obodo na-abịa, ha wee bo ya osisi ịta ahụhụ ka o buru ya soro Jizọs n’azụ.+ 27  Ma ìgwè mmadụ dị ukwuu na ndị inyom, bụ́ ndị na-eti aka n’obi wee na-eruru ya uju ma na-akwara ya ákwá arịrị, na-eso ya n’azụ. 28  Jizọs tụgharịrị n’ebe ndị inyom ahụ nọ wee sị: “Ụmụ nwaanyị Jeruselem, kwụsịnụ ibere m ákwá. Kama nke ahụ, bewerenụ onwe unu na ụmụ unu ákwá;+ 29  n’ihi na, lee! ụbọchị na-abịa mgbe ndị mmadụ ga-asị, ‘Obi ụtọ na-adịrị ụmụ nwaanyị aga, nakwa akpa nwa na-amụghị nwa na ara nwa na-aṅụghị!’+ 30  Mgbe ahụ, ha ga-amalite ịsị ugwu ukwu, ‘Dakwasị anyị!’ sịkwa obere ugwu, ‘Kpuchie anyị!’+ 31  N’ihi na ọ bụrụ na ha na-eme ihe ndị a mgbe osisi dị ndụ, gịnị ga-eme mgbe ọ kpọnwụrụ akpọnwụ?”+ 32  Ma e dukwa ndị ikom abụọ ọzọ, bụ́ ndị ajọ omume, na-aga ka e gbuo ha na ya.+ 33  Mgbe ha rukwara n’ebe a na-akpọ Okpokoro Isi,+ n’ebe ahụ ka ha kpọgidere ya na ndị ajọ omume ahụ n’osisi, otu onye n’aka nri ya, otu onye n’aka ekpe ya.+ 34  [Ma Jizọs nọ na-asị: “Nna, gbaghara+ ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.”]* Ha fekwara nza ka ha wee kesaa uwe ya.+ 35  Ìgwè mmadụ guzo ma na-ekiri ihe na-emenụ.+ Ma ndị na-achị achị nọ na-akwa ya emo, sị: “Ọ zọpụtara ndị ọzọ; ya zọpụta+ onwe ya, ma ọ bụrụ na onye a bụ Kraịst nke Chineke, Onye Ọ Họọrọ.”+ 36  Ọbụna ndị agha ji ya mee ihe ọchị,+ bịaruo ya nso ma nye ya mmanya gbara ụka,+ 37  sị: “Ọ bụrụ na ị bụ eze ndị Juu, zọpụta onwe gị.” 38  E nwekwara ihe e dere n’elu isi ya, sị: “Onye a bụ eze ndị Juu.”+ 39  Ma otu n’ime ndị ajọ omume ahụ a kwụwara n’elu osisi malitere ịkparị+ ya, sị: “Ị bụ Kraịst, ka ọ̀ bụ na ị bụghị? Zọpụta onwe gị, zọpụtakwa anyị.” 40  Onye nke ọzọ wee baara ya mba, sị: “Ị́ dịghị atụ egwu Chineke, ugbu a a mara gị otu ikpe ahụ a mara ya?+ 41  Nke anyị zikwara nnọọ ezi, n’ihi na anyị na-anatazu ihe kwesịrị anyị maka ihe ndị anyị mere; ma ọ dịghị ihe na-ekwesịghị ekwesị nwoke a mere.”+ 42  O wee gaa n’ihu ịsị: “Jizọs, cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.”+ 43  O wee sị ya: “N’ezie, ana m asị gị taa, Mụ na gị ga-anọ+ na Paradaịs.”+ 44  Ka ọ dị ugbu a, ọ bụ ihe dị ka oge awa nke isii,* ma ọchịchịrị gbara n’elu ụwa niile ruo n’oge awa nke itoolu,*+ 45  n’ihi na ìhè anyanwụ apụtaghị; ákwà mgbochi+ nke ebe nsọ dọwakwara n’etiti ya ruo n’ala.+ 46  Jizọs wee tie mkpu n’oké olu, sị: “Nna, n’aka gị ka m na-enyefe mmụọ m.”+ Mgbe o kwuru nke a, o kubiri ume.+ 47  Ebe onyeisi ndị agha ahụ hụrụ ihe merenụ, ọ malitere inye Chineke otuto, sị: “N’ezie, nwoke a bụ onye ezi omume.”+ 48  Mgbe ìgwè mmadụ ahụ dum, bụ́ ndị zukọtara n’ebe ahụ n’ihi ihe ijuanya a, hụrụ ihe niile merenụ, ha tiiri aka n’obi na-ala. 49  Ndị niile ya na ha maara guzokwa n’ebe dịtụ anya.+ Ndị inyom, bụ́ ndị dum si na Galili soro ya, guzo na-ahụ ihe ndị a.+ 50  Ma, lee! otu nwoke aha ya bụ Josef, onye bụ́ onye òtù Nzukọ,* ọ bụkwa ezi mmadụ na nwoke ezi omume+ 51  nwoke a akwadoghị atụmatụ ha na ihe ha mere+—ọ bụ onye Arimatia, bụ́ obodo ndị Judia, ọ na-echerekwa alaeze Chineke;+ 52  nwoke a gakwuuru Paịlet ma rịọ ka e bunye ya ozu Jizọs.+ 53  O wee budata+ ya ma fụchie ya ákwà linin ọma, o wee lie ya n’ili+ e gwuru n’oké nkume, nke ọ na-adịbeghị onye e liri na ya.+ 54  Ma ọ bụ ụbọchị Nkwadebe,+ ụbọchị izu ike+ na-erukwa nso ná mgbede. 55  Ma ndị inyom ahụ, ndị ya na ha so pụta na Galili, so gaa kirie ili ncheta+ ahụ na otú e si lie ozu ya;+ 56  ha wee laghachi ịga kwadebe ihe na-esi ísì ụtọ na mmanụ na-esi ísì ụtọ.+ Ma, otú ọ dị, ha zuru ike+ n’ụbọchị izu ike dị ka e nyere n’iwu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Lu 23:17*  Lee ihe e dere n’ala ala peeji na Mt 17:21.
Lu 23:34*  Akara ngebichi na-egosi ihe na-adịghị n’ụfọdụ ihe odide ndị kasị mee ochie, ma ọ dị ná ndị ọzọ.
Lu 23:44*  Ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.
Lu 23:44*  Ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.
Lu 23:50*  Ma ọ bụ, “Sanhedrin.”