Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 17:1-37

17  O wee gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụ ihe a na-apụghị izere ezere na ihe ndị na-eme ka a sụọ ngọngọ ga-abịa.+ Ka o sina dị, ahụhụ ga-adịrị onye ha si n’aka ya bịa!+  Ọ ga-akara ya mma ma ọ bụrụ na e konye nkume igwe nri n’olu ya wee tụba ya n’oké osimiri+ karịa na ọ ga-eme ka otu n’ime ndị a dị nta sụọ ngọngọ.+  Lezienụ onwe unu anya. Ọ bụrụ na nwanna gị emehie, baara ya mba,+ ọ bụrụkwa na o chegharịa, gbaghara ya.+  Ọ bụrụgodị na o mehie gị ugboro asaa n’ụbọchị, o wee bịaghachikwute gị ugboro asaa, sị, ‘Echegharịwo m,’ gbaghara ya.”+  Ma ndịozi ahụ gwara Onyenwe anyị, sị: “Nyekwuo anyị okwukwe.”+  Onyenwe anyị wee sị: “Ọ bụrụ na unu enwee okwukwe há ka mkpụrụ osisi mọstad, unu ga-agwa osisi mọlberi ojii a, sị, ‘Ka e fopụ gị ma kụọ gị n’oké osimiri!’ ọ ga-erubekwara unu isi.+  “Ònye n’ime unu nwere ohu nke na-akọ ubi ma ọ bụ nke na-elekọta anụ ụlọ, bụ́ onye ga-asị ohu ahụ mgbe o si n’ubi lọta, ‘Bịa ebe a ozugbo, nọdụ ala rie ihe na tebụl’?  Kama nke ahụ, ọ̀ bụ na ọ gaghị asị ya, ‘Kwadebere m ihe ka m rie nri anyasị m, yirikwa uwe eprọn jeere m ozi ruo mgbe m richara ihe oriri ma ṅụchaa ihe ọṅụṅụ, e mesịakwa, i nwere ike iri ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ’?  Ọ gaghị enwe obi ekele n’ebe ohu ahụ nọ n’ihi na o mere ihe ndị e kenyere ya, ka ọ̀ ga-enwe? 10  Ya mere, unu onwe unu, mgbe unu mere ihe niile e kenyere unu, sịnụ, ‘Anyị bụ ndị ohu na-abaghị uru ọ bụla.+ Ihe anyị mere bụ ihe anyị kwesịrị ime.’” 11  Ka ọ na-aga Jeruselem, o si na Sameria na Galili na-agafe.+ 12  Ka ọ na-abanyekwa n’otu obodo nta, ndị ekpenta+ iri hụrụ ya, ma ha guzo n’ebe dị anya. 13  Ha wee tie mkpu, sị: “Jizọs, Onye Ozizi, meere anyị ebere!”+ 14  Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha: “Gaanụ gosi ndị nchụàjà onwe unu.”+ Ma ka ha nọ na-apụ, e mere ka ha dị ọcha.+ 15  Mgbe otu n’ime ha hụrụ na a gwọrọ ya, ọ laghachiri, jiri oké olu na-enye Chineke otuto.+ 16  O wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala n’ụkwụ Jizọs,+ na-ekele ya; ọ bụ onye Sameria.+ 17  Jizọs sịrị ya: “Ọ́ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha? Oleekwanụ mmadụ itoolu ndị ọzọ? 18  È nwere onye a hụrụ lọghachitere inye Chineke otuto ma ọ́ bụghị nwoke a bụ onye mba ọzọ?” 19  O wee sị ya: “Bilie lawa; okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma.”+ 20  Ma mgbe ndị Farisii jụrụ ya oge alaeze Chineke ga-abịa,+ ọ zara ha, sị: “Alaeze Chineke agaghị abịa n’ụzọ pụtara oké ìhè, 21  ndị mmadụ agaghịkwa na-asị, ‘Lee n’ebe a!’ ma ọ bụ, ‘N’ebe ahụ!’+ N’ihi na, lee! alaeze Chineke dị n’etiti unu.”+ 22  Ya mere, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Oge na-abịa mgbe unu ga-achọ ịhụ otu n’ime ụbọchị Nwa nke mmadụ ma unu agaghị ahụ ya.+ 23  Ndị mmadụ ga-asịkwa unu, ‘Leenụ ya n’ebe ahụ!’ ma ọ bụ, ‘Leenụ ya n’ebe a!’+ Unu apụla, unu achụsokwala ha.+ 24  N’ihi na otú ahụ ọ na-abụ àmụ̀mà gbuo,+ ìhè ya esi n’otu akụkụ n’okpuru eluigwe ruo n’akụkụ ọzọ n’okpuru eluigwe, otú ahụ ka Nwa nke mmadụ+ ga-adị. 25  Otú ọ dị, ọ ghaghị ibu ụzọ taa ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ajụkwa ya.+ 26  Dị nnọọ ka ọ dị n’ụbọchị Noa,+ otú ahụ ka ọ ga-adịkwa n’ụbọchị Nwa nke mmadụ:+ 27  ha nọ na-eri ihe, ha nọ na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom nọ na-alụ nwunye, a nọkwa na-eke ndị inyom di, ruo ụbọchị ahụ Noa banyere n’ụgbọ, iju mmiri ahụ wee bịa bibie ha niile.+ 28  Otú ahụ ọ dị n’ụbọchị Lọt+ ka ọ ga-adị: ha nọ na-eri ihe, ha nọ na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ha nọ na-azụ, ha nọ na-ere, ha nọ na-akụ ihe, ha nọ na-ewu ihe. 29  Ma n’ụbọchị Lọt si na Sọdọm pụta, ọkụ na sọlfọ si n’eluigwe zoo ma bibie ha niile.+ 30  Otú ahụ ka ọ ga-adị n’ụbọchị ahụ mgbe a gaje ikpughe Nwa nke mmadụ.+ 31  “N’ụbọchị ahụ, ka onye nọ n’elu ụlọ, bụ́ onye nwere ihe ndị a pụrụ ibupụ ebupụ dị n’ụlọ, ghara ịrịdata iburu ha, onye nọkwa n’ubi, ya alaghachila n’ihe ndị ọ hapụrụ. 32  Chetanụ nwunye Lọt.+ 33  Onye ọ bụla nke na-achọ ichebere onwe ya mkpụrụ obi ya ga-atụfu ya, ma onye ọ bụla nke na-atụfu ya ga-edebe ya ndụ.+ 34  Ana m asị unu, N’abalị ahụ, ndị ikom abụọ ga-edina n’otu ihe ndina; a ga-akpọrọ otu onye, ma a ga-ahapụ onye nke ọzọ.+ 35  Ndị inyom abụọ ga na-egwe nri n’otu nkume igwe nri; a ga-akpọrọ otu onye, ma a ga-ahapụ onye nke ọzọ.”+ 36*  —— 37  Ya mere, ha zara ya, sị: “N’ebee, Onyenwe anyị?” Ọ sị ha: “Ebe ozu dị,+ n’ebe ahụkwa ka ugo ga-ezukọta.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Lu 17:36*  Lee ihe e dere n’ala ala peeji na Mt 17:21.