Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 13:1-35

13  N’oge ahụ, e nwere ụfọdụ ndị nọ n’ebe ahụ bụ́ ndị kọọrọ ya banyere ndị Galili+ Paịlet gwakọtara ọbara ha n’àjà ha.  Ya mere, ọ sịrị ha: “Ùnu chere na ndị Galili a bụ ndị mmehie+ karịa ndị Galili ọzọ niile n’ihi na ihe ndị a dakwasịrị ha?  N’ezie, ana m asị unu, ee e; kama, ọ gwụla ma ùnu chegharịrị, a ga-ebibi unu niile n’otu aka ahụ.+  Ka ùnu chere na mmadụ iri na asatọ ahụ ụlọ elu dị na Siloam dagburu bụ ndị mmehie* karịa ndị ọzọ niile bi na Jeruselem?  N’ezie, ana m asị unu, ee e; ma ọ bụrụ na unu echegharịghị, a ga-ebibi unu niile n’otu ụzọ ahụ.”+  O wee gaa n’ihu inye ihe atụ a: “Otu onye nwere osisi fig a kụrụ n’ubi vaịn ya,+ o wee bịa na-achọgharị mkpụrụ na ya,+ ma ọ dịghị nke ọ hụrụ.+  O wee gwa onye ọrụ ubi vaịn ahụ, sị, ‘Ihe a bụ afọ atọ+ m nọ na-abịa na-achọ mkpụrụ n’osisi fig a, ma ọ dịghị nke m hụrụ. Gbutuo ya!+ Gịnị mere ọ ga-eji mee ka ala a ghara ịba uru?’  Ọ zara ya, sị, ‘Nna m ukwu, hapụkwuo ya+ afọ a, ruo mgbe m ga-egwu ala gburugburu ya ma tinye nsị anụ;  ọ bụrụkwa na o mechaa mịa mkpụrụ n’ọdịnihu, nke ahụ amaka; ma ọ bụrụ na ọ mịghị, gị egbutuo ya.’”+ 10  Ọ nọ na-ezi ihe n’otu n’ime ụlọ nzukọ n’ụbọchị izu ike. 11  Ma, lee! ọ dị otu nwaanyị nke mmụọ+ na-eme ka mmadụ ghara ịdị ike ji kemgbe afọ iri na asatọ, o huuru ehuru, o nweghịkwa ike ịgbatị onwe ya ma ọlị. 12  Mgbe Jizọs hụrụ ya, ọ gwara ya, sị: “Nwaanyị, a tọhapụwo+ gị n’adịghị ike gị.” 13  O wee bikwasị ya aka; o wee gbatịa n’otu ntabi anya,+ wee malite inye Chineke otuto. 14  Ma iwe were onyeisi oche ụlọ nzukọ n’ihi na Jizọs gwọrọ ọrịa ahụ n’ụbọchị izu ike, o wee malite ịsị ìgwè mmadụ ahụ: “E nwere ụbọchị isii e kwesịrị ịrụ ọrụ n’ime ha;+ ya mere, bịanụ n’ụbọchị ndị ahụ ka a gwọọ unu, ọ bụghị n’ụbọchị izu ike.”+ 15  Otú ọ dị, Onyenwe anyị zara ya, sị: “Ndị ihu abụọ,+ ọ̀ dị onye ọ bụla n’ime unu nke na-adịghị atọpụ ehi ya ma ọ bụ ịnyịnya ibu ya n’ụlọ anụ n’ụbọchị izu ike ma kpụrụ ya gaa ka o nye ya mmiri?+ 16  Ya mere, nwaanyị a bụ́ nwa Ebreham,+ onye Setan kere agbụ ruo afọ iri na asatọ, ọ̀ bụ na o kwesịghị ka a tọpụ ya agbụ a n’ụbọchị izu ike?” 17  Ma, mgbe o kwuru ihe ndị a, ihere malitere ime ndị niile na-emegide ya;+ ma ìgwè mmadụ ahụ dum malitere ịṅụrị ọṅụ n’ihi ihe niile dị ebube ọ na-eme.+ 18  Ya mere, ọ gara n’ihu ịsị: “Gịnị ka alaeze Chineke dị ka ya, gịnịkwa ka m ga-eji ya tụnyere?+ 19  Ọ dị ka mkpụrụ osisi mọstad nke mmadụ weere kụọ n’ubi ya, o wee too ma ghọọ osisi, anụ ufe nke eluigwe+ wee biri n’alaka ya.”+ 20  Ọ sịkwara: “Gịnị ka m ga-eji alaeze Chineke tụnyere? 21  Ọ dị ka ihe iko achịcha nke nwaanyị weere zoo n’ime ntụ ọka nke juru arịa atọ buru ibu ruo mgbe ntụ ọka ahụ dum koro eko.”+ 22  O wee mee njem site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu nakwa site n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ezi ihe ma gawa Jeruselem ọ na-aga.+ 23  Ma otu nwoke sịrị ya: “Onyenwe anyị, ndị a ga-azọpụta hà dị ole na ole?”+ O wee sị ha: 24  “Gbalịsienụ ike+ ka unu si n’ọnụ ụzọ dị warara banye,+ n’ihi na ana m asị unu, ọtụtụ ndị ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike,+ 25  ozugbo onyeisi ezinụlọ biliri kpọchie ụzọ, unu eguzoro n’èzí na-akụ aka n’ụzọ, sị, ‘Nna anyị ukwu, megheere anyị ụzọ.’+ Ma ọ ga-aza unu, sị, ‘Amaghị m ebe unu si.’+ 26  Mgbe ahụ, unu ga-amalite ịsị, ‘Anyị riri ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ n’ihu gị, i zikwara ihe n’okporo ámá anyị.’+ 27  Ma ọ ga-agwa unu, sị, ‘Amaghị m ebe unu si. Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu niile bụ́ ndị ọrụ ajọ omume!’+ 28  Ọ bụ n’ebe ahụ ka unu ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé,+ mgbe unu ga-ahụ Ebreham na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile n’alaeze Chineke,+ ma a tụpụ unu onwe unu n’èzí. 29  Ndị mmadụ ga-esi n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ bịa, sikwa n’ebe ugwu nakwa n’ebe ndịda,+ ha ga-anọdụkwa ala na-eri ihe na tebụl n’alaeze Chineke.+ 30  Ma, lee! e nwere ndị ikpeazụ ga-abụ ndị mbụ, e nwekwara ndị mbụ ga-abụ ndị ikpeazụ.”+ 31  N’oge awa ahụ, ụfọdụ ndị Farisii bịara, na-asị ya: “Pụwa, lawa, n’ihi na Herọd chọrọ igbu gị.” 32  O wee sị ha: “Gaa gwa nkịta ọhịa+ ahụ, sị, ‘Lee! Ana m achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, na-agwọkwa ọrịa taa na echi, m ga-emechakwa n’ụbọchị nke atọ.’+ 33  Ka o sina dị, m ga-agawa taa na echi na nwanne echi, n’ihi na o kwesịghị ka e gbuo onye amụma n’ebe na-abụghị Jeruselem.+ 34  Jeruselem, Jeruselem, nke na-egbu+ ndị amụma, nke na-atụkwa ndị e ziteere ya nkume+—lee ọtụtụ ugboro m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya,+ ma unu achọghị ya!+ 35  Lee! A hapụworo unu ụlọ unu.+ Ana m asị unu, unu agaghị ahụ m ma ọlị ruo mgbe unu ga-asị, ‘Ngọzi na-adịrị onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova!’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Lu 13:4*  Otú e si dee ya n’asụsụ Grik bụ “ndị ji ụgwọ.”