Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 40:1-24

40  Jehova wee zaa Job, sị:   “Onye na-ahụtakarị mmejọ ọ̀ ga-esesa Onye Pụrụ Ime Ihe Niile okwu?+ Ka onye na-abara Chineke mba zaa ya.”+  Job wee zaa Jehova, sị:   “Lee! O nwekwaghị ihe m bụ.+ Gịnịkwanụ ka m ga-aza gị? Ekpuchiwo m ọnụ m aka.+   Otu ugboro ka m kwuru okwu, agaghịkwa m aza gị; Ugboro abụọ kwa, ọ dịghịkwa ihe ọzọ m ga-ekwu.”  Jehova wee si n’oké ifufe+ zaa Job, sị:   “Biko, kee ájị̀ n’ume dị ka dimkpa;+ M ga-ajụ gị ajụjụ, gị onwe gị azaakwa m.+   N’ezie, ị̀ ga-eme ka ikpe m gharazie izi ezi? Ị̀ ga-akpọ m onye ajọ omume ka o wee bụrụ na ikpe ziiri gị?+   Ka ì nwere ogwe aka yiri nke ezi Chineke,+ Ị̀ pụkwara iji ụda olu yiri nke ya mee ka égbè eluigwe gbaa?+ 10  Biko, were ịdị ebube+ na ịdị elu+ chọọ onwe gị mma; Yirikwa ùgwù+ na ịma mma+ dị ka uwe. 11  Gosipụta oké iwe gị,+ Lee onye ọ bụla nke dị mpako, weda ya ala. 12  Lee onye ọ bụla nke dị mpako, wetuo ya ala,+ Zọdakwa ndị ajọ omume kpọmkwem n’ebe ha nọ. 13  Zoo ha dum n’ájá,+ Kechie ihu ha n’ebe zoro ezo, 14  Mụ onwe m ga-aja gị mma, N’ihi na aka nri gị pụrụ ịzọpụta gị. 15  Lee Enyí Mmiri nke m kere dịkwa ka m kere gị. Ọ bụ ahịhịa ndụ ka ọ na-ata+ dị ka ehi. 16  Lee, ike ya dị ya n’úkwù, Ike ya nke dị ukwuu+ dị ya n’akwara afọ. 17  Ọ na-arọgọ ọdụ ya dị ka osisi sida; A kpara akwara apata ụkwụ ya akpa. 18  Ọkpụkpụ ya bụ okporo ọla kọpa; Ọkpụkpụ ya nke siri ike yiri mkpirisi ígwè. 19  Ọ bụ mmalite nke ụzọ Chineke; Onye mere+ ya pụrụ iweta mma agha ya nso. 20  N’ihi na ugwu dị iche iche na-emepụtara ya ihe oriri,+ Anụ ọhịa niile na-egwurikwa egwu n’ebe ahụ. 21  N’okpuru osisi lotọs dị ogwu ogwu ka ọ na-edina, N’ebe zoro ezo nke ahịhịa amị dị+ nakwa n’ebe mmiri na-adọ.+ 22  Osisi lotọs dị ogwu ogwu na-eji ndò ya kpuchie ya; Osisi pọpla nke ndagwurugwu iyi na-agba ya gburugburu. 23  Ọ bụrụ na e nwee ebili mmiri n’osimiri, ọ dịghị agba ọsọ n’ụjọ. Ọ bụrụgodị na osimiri Jọdan+ eju n’ọnụ wee na-asọpụta, obi na-esi ya ike. 24  Ọ̀ dị onye pụrụ ịnọ n’ihu ya nwụde ya? Ọ̀ dị onye pụrụ iji nko dụpuo ya imi?

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji