Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 4:1-21

4  Elifaz+ onye Timan wee zaa ya, sị:   “Ọ bụrụ na mmadụ anwaa ịgwa gị okwu, ike ọ̀ ga-agwụ gị? Ma, ònye nwere ike igbochi mmadụ ikwu okwu?   Lee! Ị gbaziwo ọtụtụ ndị,+ Ị na-emebukwa ka aka ndị na-adịghị ike dị ike.+   Okwu gị na-eme ka onye ọ bụla sụrụ ngọngọ bilie;+ Ị na-emekwa ka ikpere na-adịghị ike sie ike.+   Ma ugbu a, ọ bịarala gị, ike wee gwụ gị; O meela gị, i wee na-echegbu onwe gị.   Ọ́ bụghị nsọpụrụ ị na-enye Chineke bụ obi ike gị? Ọ́ bụghị iguzosi ike n’ihe+ n’ụzọ gị bụ olileanya gị?   Biko, cheta: Olee onye aka ya dị ọcha nke latụworo n’iyi? Olee ebe e kpochapụtụrụla ndị ezi omume?+   Dị ka m hụworo, ndị na-echepụta ihe ọjọọ Na ndị na-agha nsogbu dị ka mkpụrụ, ọ bụ ha ga-aghọrọ ya.+   Ha na-ala n’iyi site n’ume Chineke kupụrụ, Ha na-anwụkwa site ná mwụpụ nke iwe ya. 10  Ọdụm na-ebigbọ, a na-anụkwa olu nwa ọdụm, Ma a na-agbaji ezé ụmụ ọdụm tojuru etoju. 11  Ọdụm na-ala n’iyi n’ihi na o nweghị anụ ọ dọgbutere, Ụmụ ya na-ahapụkwa ibe ha gbasasịa. 12  A takwunyeere m okwu, Ntị m wee nụpere ya,+ 13  Mgbe obi na-ezughị m ike n’ihi ọhụụ m na-ahụ n’abalị, Mgbe oké ụra ji ndị mmadụ. 14  Ụjọ jidere m, m makwara jijiji, O mekwara ka ọkpụkpụ m niile jupụta n’ụjọ. 15  Otu mmụọ wee gafere n’ihu m; Ajị dị m n’ahụ́ wee guzoro ọtọ. 16  Ọ kwụụrụ ọtọ ma nọrọ jii, Ma amataghị m ihe ọ bụ; E nwere ihe guzo n’ihu m; Ebe niile dara jụụ, m wee nụ otu olu: 17  ‘Mmadụ efu—ò nwere ike ịbụ onye ezi omume karịa Chineke? Ka mmadụ ò nwere ike ịdị ọcha karịa Onye mere ya?’ 18  Lee! Ọ tụkwasịghị ndị ohu ya obi, Ọ na-ebokwa ndị ozi ya ebubo na ha na-emejọ, 19  Ma ya fọdụzie ndị bi n’ụlọ ájá, Ndị a tọrọ ntọala ha n’ájá!+ A na-azọpịa ha ọsọ ọsọ karịa nla. 20  Malite n’ụtụtụ ruo n’anyasị, a na-azọpịa ha; Ha na-ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi n’enweghị onye ọ na-emetụ n’obi. 21  Ọ̀ bụ na e fopụghị ụdọ ụlọikwuu ha? Ha na-anwụ n’ihi enweghị amamihe.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji