Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 34:1-37

34  Elaịhu wee gaa n’ihu ịza, sị:   “Geenụ ntị n’okwu m, unu ndị amamihe;Unu ndị maara ihe, ṅaanụ m ntị.   N’ihi na ntị na-anwale okwu,+Dị ka okpo ọnụ si anụ ụtọ ihe mgbe a na-eri nri.+   Ka anyị mee nchọpụta ziri ezi;Ka anyị mara n’etiti onwe anyị ihe dị mma.   N’ihi na Job asịwo, ‘Ọ dịghị ihe ọjọọ m mere,+Kama Chineke agbanwewo ikpe m.+   M̀ ga-agha ụgha banyere ikpe ziri ezi nke ruuru m?Ọnyá m nke dị ukwuu enweghị ngwọta n’agbanyeghị na ọ dịghị iwu m mebiri.’+   Olee dimkpa nwoke nke dị ka Job,+Onye na-aṅụ ịkwa emo dị ka mmiri?+   Ọ na-aga ka ya na ndị na-eme ihe ọjọọ na-akpakọrịta,Nakwa ka ya na ndị ajọ omume na-eje ije.+   N’ihi na ọ sịwo, ‘Mmadụ adịghị erite uru+N’inwe mmasị n’ebe Chineke nọ.’ 10  Ya mere, unu ndị nwere obi nghọta,+ geenụ m ntị.Ya bụrụ Chineke ihe arụ ime ihe ọjọọ,+Ya bụrụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ihe arụ ime ihe n’ụzọ na-ezighị ezi!+ 11  N’ihi na ọ bụ dị ka mmadụ si eme ka ọ ga-akwụ ya ụgwọ,+Ọ bụkwa dị ka ụzọ mmadụ si dị ka ọ ga-eme ka ọ bịakwasị ya. 12  Ee, n’eziokwu, Chineke adịghị eme ihe ọjọọ,+Onye Pụrụ Ime Ihe Niile adịghịkwa agbagọ ikpe.+ 13  Ònye nyefere ụwa n’aka ya,Ònyekwa nyere ya elu ala dum? 14  Ọ bụrụ na o tinye obi ya n’ebe mmadụ nọ,Ọ bụrụ na o were mmụọ na ume ndụ onye ahụ,+ 15  Ihe niile bụ́ anụ ahụ́ ga-ekubikọ ume,Mmadụ ga-alaghachikwa n’ájá.+ 16  Ya mere, ọ bụrụ na ị nwere nghọta, nụrụ okwu a;Ṅaa ntị n’ihe m na-ekwu. 17  Ọ̀ dị onye kpọrọ ikpe ziri ezi asị nke ga-anọ n’isi?+Ọ bụrụkwa na onye dị ike bụ onye ezi omume, ị̀ ga-akpọ ya onye ajọ omume?+ 18  Mmadụ ọ̀ ga-asị eze, ‘Ị bụ onye na-abaghị n’ihe’?Sikwa ndị a ma ama, ‘Unu bụ ndị ajọ omume’?+ 19  E nwere onye na-adịghị ele ndị isi anya n’ihu,Nke na-adịghị emenyere onye a ma ama karịa onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya,+N’ihi na ha niile bụ ọrụ aka ya.+ 20  Ha na-anwụ n’otu ntabi anya,+ ọbụna n’etiti abalị;+Ndị mmadụ na-ama jijiji wee nwụọ,Ndị dị ike na-anwụkwa n’enweghị aka metụrụ ha.+ 21  N’ihi na anya ya na-ahụ ụzọ mmadụ,+Ọ na-ahụkwa nzọụkwụ ya niile. 22  Ọchịchịrị ma ọ bụ oké itiri ọ bụla adịghị,Bụ́ ebe ndị na-eme ihe ọjọọ ga-ezo.+ 23  N’ihi na Chineke adịghị eyiri onye ọ bụla ogeỌ ga-abịa n’ihu Ya maka ikpe. 24  Ọ na-agbaji ndị dị ike+ n’agaghị mewe nchọpụta,Ọ na-emekwa ka ndị ọzọ bilie n’ọnọdụ ha.+ 25  N’ihi ya, ọ maara ọrụ ha,+Ọ na-akwatukwa ha n’abalị, e wee gwepịa ha.+ 26  Dị ka ndị ajọ omume, ọ na-eti ha iheN’ihu ndị mmadụ;+ 27  N’ihi na ha echigharịwo hapụ iso ya,+Ha echebaraghị ụzọ ya ọ bụla echiche,+ 28  Ka e wee mee ka mkpu ákwá nke onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ruo ya ntị;O wee nụ mkpu ákwá nke ndị nọ n’ahụhụ.+ 29  Ọ bụrụ na o mee ka ebe niile daa jụụ, ònye pụrụ ịma ya ikpe?Ọ bụrụkwa na o wepụ ihu ya,+ ònye pụrụ ịhụ ya,Ma ọ̀ bụ otu mba+ ma ọ̀ bụ otu onye ka o wepụụrụ ya, ọ bụ otu ihe ahụ? 30  Ka onye si n’ezi ofufe dapụ wee ghara ịchị ọchịchị,+Ka ndị mmadụ gharakwa inwe ọnyà.+ 31  N’ihi na ọ̀ dị onye ga-asị Chineke,‘Ahụsiela m anya, ọ bụ ezie na adịghị m eme ihe ọjọọ;+ 32  Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe m na-ahụ, kụziere m ya;Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọjọọ m mere,Agaghị m eme ya ọzọ’?+ 33  Ọ̀ ga-enye gị ụgwọ ọrụ dị ka i si chọọ ebe ọ bụ na ị jụrụ ikpe ya,N’ihi na ọ bụ gị họọrọ ya, ọ bụghị m?Ihe ahụ ị maara nke ọma, kwuo ya. 34  Ndị nwere obi nghọta+ ga-asị m—Ee, nwoke maara ihe nke na-ege m ntị ga-asị m, 35  ‘Amamihe adịghị n’ihe Job na-ekwu,+Okwu ya bụkwa okwu onye na-enweghị nghọta.’ 36  Nna m, ka a nwalee Job ruo n’isiN’ihi ihe ọ na-aza n’etiti ndị na-eme ihe ọjọọ.+ 37  N’ihi na ọ na-atụkwasị nnupụisi n’elu mmehie ya;+Ọ nọ n’etiti anyị na-akụ aka, na-ekwukwa ọtụtụ ihe megide ezi Chineke!”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji