Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Job 33:1-33

33  “Ma ugbu a, Job, nụrụ okwu m,Ṅaakwa ntị n’ihe niile m na-ekwu.   Biko, lee! aghaghị m imeghe ọnụ m;Ire m na okpo ọnụ+ m ga-ekwurịrị okwu.   Okwu m na-egosi na obi m ziri ezi,+Ọ bụkwa ihe ọmụma ka egbugbere ọnụ m ji ezi obi na-ekwupụta.+   Ọ bụ mmụọ Chineke kere m,+Ọ bụkwa ume Onye Pụrụ Ime Ihe Niile mere ka m dị ndụ.+   Saa m okwu ma ọ bụrụ na i nwere ike,Doo okwu n’usoro n’ihu m; jikere ejikere.   Lee! Ihe ị bụ n’anya ezi Chineke ka mụ onwe m bụ;+Ọ bụkwa ụrọ ka e ji kpụọ m.+   Lee! Ọ dịghị ihe ụjọ dị n’ebe m nọ nke ga-emenye gị ụjọ,Ọ dịghịkwa nsogbu m na-enye gị nke+ ga-adị arọ n’ahụ́ gị.   Ọ bụ naanị na i kwuwo ná ntị m,Anọwokwa m na-anụ ka ị na-ekwu, sị,   ‘Adị m ọcha, enweghịkwa m njehie;+Adị m ọcha, adịghịkwa m emejọ ihe.+ 10  Lee! Ọ bụ ụzọ ọ ga-esi megide m ka ọ na-achọ,O weere m ka onye iro ya.+ 11  O tinyere ụkwụ m n’ọtọsị,+Ọ na-ele ụzọ m niile anya.’+ 12  Lee! Ka m gwa gị, i kwuteghị nke a;+N’ihi na Chineke dị nnọọ ukwuu karịa mmadụ efu.+ 13  Gịnị mere o ji bụrụ ya ka i sesara okwu?+Ọ bụ n’ihi na ọ dịghị asa gị ihe niile ị na-ekwu?+ 14  N’ihi na Chineke na-ekwu okwu otu ugboro,Nakwa ugboro abụọ+—ọ bụ ezie na mmadụ adịghị eji ya akpọrọ ihe— 15  Ná nrọ,+ bụ́ ọhụụ+ nke abalị,Mgbe oké ụra ji ndị mmadụ,Mgbe ụra na-atụ ha n’elu ihe ndina.+ 16  Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ na-emeghe ntị ụmụ mmadụ,+Ọ na-emekwa ka okwu ịdọ aka ná ntị ya bamie ha n’obi, 17  Iji mee ka mmadụ si n’omume ya chigharịa,+Nakwa ka o wee napụta mmadụ n’aka nganga.+ 18  Ọ na-egbochi mkpụrụ obi ya ịdaba n’olulu,+Na-egbochikwa akụ́ ụta+ ịla ndụ ya n’iyi. 19  A na-ejikwa ihe mgbu adọ ya aka ná ntị n’elu ihe ndina ya,Ihe mgbu ọ na-enwe n’ọkpụkpụ ya adịghịkwa akwụsị akwụsị. 20  Ndụ ya na-eme ka nri ghọọ ihe na-asọ oyi,+Mkpụrụ obi ya na-emekwa ka nri dị mma ghọọ ihe na-asọ oyi. 21  Ọ taala ahụ́,Ọkpụkpụ ya ndị a na-adịbughị ahụ anya apụtawo ìhè. 22  Mkpụrụ obi ya na-abịaru olulu nso,+Ndụ ya na-abịarukwa ndị na-egbu mmadụ nso. 23  Ọ bụrụ na o nwere onye ozi,Ọnụ na-ekwuchitere ya, otu n’ime otu puku mmadụ,Onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi ọ ga-eme, 24  O wee meere ya amara, sị,‘Napụta ya ka ọ ghara ịgbada n’olulu!+Enwetawo m ihe mgbapụta!+ 25  Ka ahụ́ ya dị ọhụrụ karịa otú ọ dị n’oge ọ bụ nwata;+Ka ọ laghachi otú ọ dị n’oge o nwere ike okorobịa.’+ 26  Ọ ga-arịọsi Chineke arịrịọ ike ka o nwee mmasị n’ebe ọ nọ,+Ọ ga-ejikwa iti mkpu ọṅụ hụ ihu ya,Ọ ga-enyeghachi mmadụ efu ezi omume Ya. 27  Ọ ga-abụrụ ụmụ mmadụ abụ wee sị,‘Emehiewo m;+ emewokwa m ka ihe kwụ ọtọ gbagọọ agbagọ,Ọ bụghịkwa ihe m kwesịrị ime ma ọlị. 28  Ọ napụtawo mkpụrụ obi m ka ọ ghara ịba n’olulu,+Ndụ m ga-ahụkwa ìhè.’ 29  Lee! Chineke na-eme ihe a niile,ọ na-emere ya mmadụ, ugboro abụọ, ugboro atọ 30  Iji gbochie mkpụrụ obi ya ịba n’olulu,+Ka ìhè nke ndị dị ndụ wee nye ya ìhè.+ 31  Ṅaa ntị, Job! Gee m ntị!Dere duu, mụ onwe m ga na-ekwukwa ihe m na-ekwu. 32  Ọ bụrụ na i nwere ihe ọ bụla ị ga-asa m, saa m ya;Kwuo okwu, n’ihi na ezi omume gị na-atọ m ụtọ. 33  Ọ bụrụ na ọ dịghị ihe ị ga-asa m, gee m ntị;+Dere duu, m ga-akụzikwara gị amamihe.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji