Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 29:1-25

29  Job wee jiri ilu malite ikwu okwu ọzọ, sị:   “A sị nnọọ na m dị otú m dịbu n’ọnwa ndị gara aga,+ N’oge Chineke na-eche m nche;+   Mgbe o mere ka oriọna ya na-achakwasị m n’isi, Mgbe m na-eji ìhè ya agafere n’ọchịchịrị;+   Dị nnọọ ka m dị n’oge m bụ okorobịa,+ Mgbe mụ na Chineke nwere mmekọrịta chiri anya n’ụlọikwuu m;+   Mgbe Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ka nọnyeere m, Mgbe ndị na-ejere m ozi gbara m gburugburu!   Mgbe mmiri ara ehi rahụrụ arahụ jupụtara n’ebe m na-azọ ụkwụ, Oké nkume ana-agbapụtara m mmanụ dị ka mmiri iyi;+   Mgbe m na-aga n’ọnụ ụzọ ámá obodo,+ Ọ bụ n’ámá ka m na-edebe oche m!+   Ụmụaka hụrụ m gaa zoo, Ọbụna ndị agadi biliri guzoro ọtọ.+   Ndị isi ekwughị okwu, Ha kpuchiri aka n’ọnụ ha.+ 10  Olu ndị ndú adapụtaghị adapụta, Ire ha rapakwaara n’okpo ọnụ ha.+ 11  N’ihi na ntị nụrụ ya wee kpọọ m onye obi ụtọ, Anya hụkwara ya wee gbaara m akaebe. 12  N’ihi na m na-anapụta onye nọ n’ahụhụ nke na-eti mkpu enyemaka,+ Tinyere nwa na-enweghị nna na onye ọ bụla nke na-enweghị onye inyeaka.+ 13  Ngọzi+ nke onye na-aga ịla n’iyi—n’isi m ka ọ na-adị, M na-emekwa ka obi nwaanyị di ya nwụrụ ṅụrịa.+ 14  M yiiri ezi omume, o wee ghọọrọ m uwe.+ Ikpe ziri ezi m dị ka uwe elu nke na-enweghị aka—dịkwa ka ákwà a na-eke n’isi. 15  M ghọọrọ onye ìsì anya;+ Ghọọkwara onye ngwọrọ ụkwụ. 16  Abụụrụ m ndị ogbenye ezigbo nna;+ Okwu ikpe nke onye m na-amaghị—m na-eleba ya anya.+ 17  M na-agbaji ọkpụkpụ agba nke onye na-eme ihe ọjọọ,+ M na-anapụtakwa anụ ọ kpụ n’ọnụ. 18  M na-asịbu, ‘M ga-anọ n’ime akwụ́ m kubie ume,+ M ga-emekwa ka ụbọchị ndụ m dị ọtụtụ dị ka ájá dị n’ala.+ 19  Mgbọrọgwụ m na-agbasa ruo n’ebe mmiri dị,+ Igirigi ga-adịbọ chi n’elu alaka m. 20  M ka nwere ùgwù m, M ga-agba ụta m ji n’aka ugboro ugboro.’ 21  Ha gere m ntị; ha chekwaara, Ha na-anọkwa jụụ igere ndụmọdụ m.+ 22  M kwusịa, ọ dịghị ihe ọzọ ha na-ekwu, Okwu m na-erukwa ha n’ahụ́.+ 23  Ha na-echere m dị ka a na-echere mmiri ozuzo,+ Ha na-asaghepụ ọnụ ha maka ụla mmiri.+ 24  M na-amụmụrụ ha ọnụ ọchị—ha anaghị ekweta— Ha adịghịkwa eme ka ihu m gbachapụrụ agbachapụ gbarụọ.+ 25  M na-ahọtara ha ụzọ ha ga-agbaso, m na-anọdụkwa dị ka onyeisi; M bikwa dị ka eze nke nọ n’etiti ndị agha ya,+ Dị ka onye na-akasi ndị na-eru uju obi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji