Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 28:1-28

28  “N’ezie, ọlaọcha nwere ebe a na-enweta ya, Ọlaedo a na-anụcha anụcha+ nwekwara ebe a na-enweta ya;   Ọ bụ n’ala ka a na-egwute ígwè,+ Ọ bụkwa na nkume ka e si agbazepụta ọla kọpa.   Mmadụ emewo ka a ghara inwekwa ọchịchịrị; Ọ na-achọkwa nkume ruo na nsọtụ niile nke ala,+ N’itiri nakwa n’oké ọchịchịrị.   O gwunyewo okporo ígwè n’ebe dị anya n’ebe ndị mmadụ bi,+ N’ebe e chefuru echefu nke ụkwụ na-adịghị eru; Ụfọdụ n’ime ụmụ mmadụ na-eji ụdọ rịba n’ime ala, ha ana-akwụfegharị.   Ọ bụ n’ala ka ihe oriri si apụta;+ Ma n’okpuru ya, e kpuru ya ihu dị ka ihe ọkụ bibiri.   Nkume safaya dị n’ebe nkume ya juru,+ O nwekwara aghịrịgha ọlaedo.   Ọ bụ ụzọ nke nnụnụ ọ bụla na-eri anụ+ na-amaghị, Anya égbé ojii+ adịghịkwa ahụ ya.   Anụ ọhịa ndị dị ebube azọtụbeghị ụkwụ na ya; Nwa ọdụm agafetụbeghịkwa n’elu ya.   N’elu nkume siri ike ka ọ tụkwasịworo aka ya; Ọ na-akwatu ugwu malite na ntọala ya; 10  Ọ na-awa ọwa mmiri banye n’oké nkume;+ Anya ya ahụwokwa ihe niile dị oké ọnụ ahịa. 11  Ọ sụchiwokwa ebe osimiri si asọpụta,+ Ọ na-agbakwa ihe zoro ezo n’anwụ. 12  Ma, amamihe—olee ebe a pụrụ ịchọta ya,+ Oleekwanụ ebe nghọta dị? 13  Mmadụ efu amabeghị ọnụ ahịa ya,+ A dịghịkwa ahụ ya n’ala ndị dị ndụ. 14  Ogbu mmiri asịwo, ‘Ọ dịghị n’ime m!’ Oké osimiri asịwokwa, ‘Ọ dịghị n’ebe m nọ!’+ 15  A pụghị iji ezi ọlaedo gbanweta ya,+ A pụghịkwa ịtụ ọlaọcha atụ̀ ka ọ bụrụ ọnụ ahịa ya. 16  A pụghị iji ọlaedo Ofa,+ Ma ọ bụ nkume oniks dị ụkọ, ya na safaya, kwụọ ụgwọ ya. 17  A pụghị iji ọlaedo na enyo tụnyere ya, A pụghịkwa iji arịa ọ bụla e ji ọlaedo a nụchara anụcha mee gbanweta ya. 18  A gaghị ekwutedị okwu nkume kọral+ na nkume kristal, Ma akpa nke jupụtara n’amamihe dị oké ọnụ ahịa karịa nke jupụtara na nkume pel.+ 19  A pụghị iji nkume topaz+ si Kush tụnyere ya; A pụghịkwa iji ọbụna ezi ọlaedo kwụọ ụgwọ ya. 20  Ma amamihe—olee ebe o si abịa,+ Oleekwanụ ebe nghọta dị? 21  E zopụwo ya ọbụna n’anya onye ọ bụla dị ndụ,+ E zochiwokwara ya anụ ufe nke eluigwe. 22  Mbibi na ọnwụ asịwo, ‘Anyị ji ntị anyị nụ akụkọ banyere ya.’ 23  Ọ bụ Chineke ghọtara ụzọ ya,+ Ọ bụkwa ya onwe ya maara ebe ọ dị, 24  N’ihi na anya ya na-eru na nsọtụ ụwa;+ Ọ na-ahụkwa okpuru eluigwe dum, 25  Iji mee ka ifufe dị arọ,+ Ya onwe ya atụwokwa mmiri n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀;+ 26  Mgbe ọ tụụrụ mmiri ozuzo ụkpụrụ,+ Meekwara oké mmiri ozuzo na égbè eluigwe ụzọ, 27  Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ hụrụ amamihe wee kọọ banyere ya; Ọ kwadebere ya ma nyochaa ya nke ọma. 28  O wee sị mmadụ, ‘Lee! Ịtụ egwu Jehova—ọ bụ ya bụ amamihe,+ Mmadụ isi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya bụkwa nghọta.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji