Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Job 26:1-14

26  Job wee zaa, sị:   “Leenụ ụdị aka ị na-enyere onye na-enweghị ike!Lee ka i si zọpụta ogwe aka nke na-enweghị ume!+   Leenụ ụdị ndụmọdụ i nyere onye na-amaghị ihe,+Meekwa ka ọtụtụ mmadụ mara ihe bụ́ ezi amamihe!   Ònye ka ị na-agwa?Ọ̀ bụkwa onye ziri gị ihe ị na-ekwu?   Ndị na-adịghị ndụ na-ama jijijiN’ala mmiri, tinyere ihe ndị bi n’ime ya.+   Shiol gba ọtọ n’ihu ya,+Ebe mbibi enweghịkwa ihe mkpuchi.   Ọ na-esetị ebe ugwu n’elu ebe tọgbọrọ chakoo,+Ọ dịghịkwa ihe o kokwasịrị ụwa na ya;   O ji ígwé ojii ya kechie mmiri,+Nke mere na ọ dịghị anyịwa ígwé ojii;   Ọ na-ekpuchi ihu ocheeze ya,Gbasaa ígwé ojii ya n’elu ya.+ 10  Ọ kpawo ókè okirikiri n’elu mmiri,+Ruo n’ókè nke ìhè na ọchịchịrị. 11  Ogidi eluigwe na-amacha jijiji,Ịba mba ya na-eju ha anya. 12  O jiriwo ike ya mee ka oké osimiri mee mkpatụ,+O jiriwokwa nghọta ya kụrie+ ihe na-eme ihe ike.+ 13  O jiriwo ifufe ya mee ka eluigwe na-egbukepụ egbukepụ,+Aka ya amagbuwo agwọ na-amịgharị amịgharị.+ 14  Lee! Ihe ndị a bụ ntakịrị ihe n’ọrụ ya niile,+Leekwa ka ihe a nụworo banyere ya si dị ntakịrị!Ma ònye pụrụ ịghọta ụzọ égbè eluigwe ya nke dị ike?”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji