Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 24:1-25

24  “Gịnị mere na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ekwughị oge ọ ga-ekpe ikpe,+ Gịnịkwa mere na ndị maara ya ahụghị ụbọchị ya?+   E nwere ndị na-ewela ihe e ji kpaa ókè ala azụ;+ Ha akpụrụwo ìgwè ewu na atụrụ n’ike, ka ha wee zụọ ha.   Ha na-achụfu ọbụna oké ịnyịnya ibu nke ụmụ na-enweghị nna; Ha na-ejichi oké ehi nke nwaanyị di ya nwụrụ dị ka ihe ibé.+   Ha na-enupụ ndị ogbenye n’ụzọ;+ N’otu mgbe ahụ, ndị nọ n’ahụhụ n’ụwa ezowokwa.   Lee! Dị ka ịnyịnya ọhịa+ ndị nọ n’ala ịkpa, Ha agawo n’ihu n’ọrụ ha, na-achọ ihe oriri. Ọzara na-enye onye nke ọ bụla nri ụmụ ya ga-eri.   N’ọhịa ka ha si eweta nri ọ na-ata, Ha na-ebukọrọkwa ihe dị n’ubi vaịn onye ajọ omume ngwa ngwa.   Ha na-agba ọtọ ehi ụra abalị n’eyighị uwe,+ N’ekpuchighịkwa onwe ha ihe ọ bụla n’oge oyi.+   Oké mmiri ozuzo nke si n’ugwu na-ede ha, Ha na-amakụkwa oké nkume n’ihi na ebe mgbaba adịghị.+   Ha na-esepụ nwa na-enweghị nna ọnụ n’ara,+ Ha na-ewerekwa ihe onye nọ n’ahụhụ yi n’ahụ́ ka ọ bụrụ ihe ibé.+ 10  Ha na-agba ọtọ ejegharị, n’eyighị uwe, N’agụụ, ha na-eburu oko ọka* ha ghọrọ.+ 11  N’ala ubi nke dị n’etiti mgbidi abụọ ka ha na-anọ n’ehihie; Ha na-azọchapụta mmanya, ma akpịrị na-akpọ ha nkụ.+ 12  Ude ndị na-anwụ anwụ na-asụ si n’obodo na-adapụta, Mkpụrụ obi nke ndị e merụrụ ahụ́ nke ukwuu na-eti mkpu enyemaka;+ Chineke adịghịkwa ewere ya dị ka ihe na-ekwesịghị ekwesị.+ 13  Ha so ná ndị na-enupụrụ ìhè isi;+ Ha amaghịkwa ụzọ ya, Ha anọgideghịkwa n’okporo ụzọ ya. 14  Ogbu mmadụ na-ebili n’ehihie, Ọ na-egbukwa onye nọ n’ahụhụ na ogbenye;+ N’abalị kwa, ọ na-aghọ onye ohi.+ 15  Anya onye na-akwa iko+ anọwo na-echere mgbe chi jiri,+ Na-asị, ‘Ọ dịghị anya ga-ahụ m!’+ Ọ na-ekpuchikwa ihu ya. 16  Onye ohi egwupuwo ụlọ n’ọchịchịrị; N’ehihie, ndị ohi na-akpọchigide onwe ha ụzọ. Ha amaghịkwa ihe bụ́ ìhè ehihie.+ 17  N’ihi na ụtụtụ na oké ọchịchịrị+ bụụrụ ha otu ihe, N’ihi na ha ma ihe bụ́ ụjọ mberede nke a na-atụ n’oké ọchịchịrị. 18  Mmiri na-ebupụ ya ngwa ngwa. A ga-abụ ibé ala ha ọnụ n’ụwa.+ Ọ gaghị aga n’ụzọ ubi vaịn ya. 19  Oké ọkọchị na okpomọkụ na-eme ka mmiri snoo taa; Otú ahụ ka Shiol na-eme ndị mehierenụ!+ 20  Akpa nwa ga-echefu ya, ikpuru ga-amịcha ya,+ A gakwaghị echeta ya.+ A ga-agbajikwa ajọ omume dị nnọọ ka osisi.+ 21  Ya na nwaanyị aga nke na-adịghị amụ nwa na-emekọ ihe, Ya na nwaanyị di ya nwụrụ,+ bụ́ onye ọ na-adịghị emere ihe ọma, na-emekọkwa ihe. 22  Ọ ga-ejikwa ike ya dọkpụrụ ndị dị ike; Ọ ga-ebili ọtọ ma ọ gaghị eji ndụ ya n’aka. 23  Chineke ga-eme ka o nwee obi ike,+ ka o wee kwado onwe ya; Anya Chineke ga-adị n’ụzọ ha.+ 24  Ha na-adị elu ruo nwa oge, nke ha agaa,+ E mewokwa ka ha dị ala;+ a na-ebipụ ha dị ka onye ọ bụla ọzọ, A na-egbujipụkwa ha dị ka oko ọka. 25  Ugbu a, ònye ga-eme m onye ụgha, Ma ọ bụ mee ka okwu m ghọọ ihe efu?”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Job 24:10*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.