Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 23:1-17

23  Job wee zaa, sị:   “Ọbụna taa nchegbu m na-enwe+ bụ nnupụisi; Aka m dị arọ n’ihi ịsụ ude m.   A sị nnọọ na m maara ebe m nwere ike ịhụ ya!+ M ga-aga n’ebe ya e wusiri ike.+   M ga-ewere okwu ikpe bịa n’ihu ya, M ga-ejikwa ọnụ m zaa ọtụtụ ihe;   M ga-ama ihe ọ ga-asa m, M ga-echebakwara ihe ọ ga-agwa m echiche.+   Ọ̀ ga-eji ike ya dị ukwuu lụso m ọgụ? Mbanụ! N’ezie, ọ ga-aṅa m ntị.+   N’ebe ahụ, onye ziri ezi ga-aga ka ya na ya dozie okwu, Ruokwa mgbe ebighị ebi, onyeikpe m ga-asị na ikpe amaghị m.   Lee! M ga-aga n’ebe ọwụwa anyanwụ, ma ọ gaghị anọ n’ebe ahụ; M ga-alaghachikwa azụ, ma apụghị m ịmata na ọ bụ ya;+   M ga-aga n’aka ekpe ebe ọ na-arụ ọrụ, ma apụghị m ịhụ ya; Ọ na-atụgharị gaa n’aka nri, ma adịghị m ahụ ya. 10  N’ihi na ọ maara nke ọma ụzọ m na-esi aga.+ Mgbe ọ nụchasịrị m, m ga-adịzi ka ọlaedo.+ 11  Ụkwụ m agbasowo nzọụkwụ ya; Ụzọ ya ka m gbasoworo, adịghịkwa m ahapụ ya.+ 12  Adịghị m ahapụ ihe egbugbere ọnụ ya nyere n’iwu.+ Echekwawo m okwu si ya n’ọnụ+ karịa ihe a chọrọ m n’aka. 13  Ọ dịghị enwe obi abụọ, ònyekwa pụrụ iguzogide ya?+ Ọ dị ihe na-agụ mkpụrụ obi ya agụụ, ọ ga-emekwa ya.+ 14  N’ihi na ọ ga-emezucha ihe a kara aka maka m,+ Ihe ndị dị otú a dị ọtụtụ n’uche ya. 15  Ọ bụ ya mere m ji na-ama jijiji n’ihi ya; Ana m aṅa ntị, ụjọ ya na-atụkwa m.+ 16  Chineke emewo ka obi na-alọ m mmiri,+ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile emewokwa ka obi koro m n’elu.+ 17  N’ihi na e meghị ka m dere duu n’ihi ọchịchịrị, Ma ọ bụkwanụ n’ihi na itiri agbachiwo m ihu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji