Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 17:1-16

17  “E gbuwo mmụọ m,+ e mewokwa ka ụbọchị m nyụọ ka ọkụ;Ọ bụ m ka e debeere ili.+   N’ezie, a na-akwa m emo,+Anya m dịkwa n’omume nnupụisi ha.   Biko, ka ihe ibé m dịrị gị n’aka.+Olee onye ọzọ ga-anara m n’ibé?+   N’ihi na i mechiwo obi ha ka ọ ghara inwe ezi uche.+Ọ bụ ya mere na ị naghị ebuli ha elu.   O nwere ike ịgwa ndị enyi ya ka ha were òkè ha,Ma anya ụmụ ya agakwaghị ahụ ụzọ.+   O mewo ka m bụrụ ihe ndị mmadụ ji atụ ilu,+M wee ghọọ onye a na-agbụ ọnụ mmiri n’ihu.+   Anya m na-ahụ inyoghi inyoghi n’ihi iru uju,+Ahụ́ m dum dịkwa ka onyinyo.   Ndị ziri ezi kporopụrụ anya na-ele m,Ọbụna onye aka ya dị ọcha na-ewesa onye si n’ezi ofufe dapụ iwe.   Onye ezi omume na-anọgidesi ike n’ụzọ ya,+Onye aka ya dị ọcha+ na-enwewanyekwa ume.+ 10  Otú ọ dị, unu niile nweziri ike ịga n’ihu. Biko, kwuwenụ,N’ihi na ahụghị m onye maara ihe n’etiti unu.+ 11  Ụbọchị m agafewo,+ a kụghasịwokwa atụmatụ m,+Bụ́ ọchịchọ obi m. 12  Ha na-eji abalị mere ehihie, ma na-asị:+‘Ìhè dị nso n’ihi ọchịchịrị.’ 13  Ọ bụrụ na mụ anọgide na-echere, Shiol ga-abụ ụlọ m;+Ọ bụ n’ọchịchịrị+ ka m ga-agbasa ihe ndina m. 14  M ga-eji oké olu gwa olulu,+ sị, ‘Ị bụ nna m!’Gwakwa ikpuru,+ sị, ‘Ị bụ nne m na nwanne m nwaanyị!’ 15  Oleezi ebe olileanya m dị?+Olileanya m kwa, ònye na-ahụ ya? 16  Ha ga-agbada ruo n’ọnụ ụzọ Shiol,Mgbe anyị niile ga-agbadakọta n’ájá.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji