Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 16:1-22

16  Job wee zaa, sị:   “Anụwo m ọtụtụ ihe yiri ndị a. Unu niile bụ ndị nkasi obi na-eweta nsogbu!+   Okwu na-enweghị isi ọ̀ na-agwụ agwụ?+ Ka ọ̀ bụ gịnị na-ewute gị, nke mere i ji na-ekwu ihe ndị a?   Mụ onwe m nwekwara ike ikwu okwu otú unu si ekwu. A sị na mkpụrụ obi unu nọ n’ọnọdụ a mkpụrụ obi m nọ, M̀ ga-eji amamihe kwuo okwu megide unu,+ M̀ ga-efufekwa isi megide unu?+   M gaara eji okwu ọnụ m mee ka unu dị ike,+ Okwu ngụgụ obi nke si n’egbugbere ọnụ m ga-ebelatakwa ihe mgbu unu—.   Ọ bụrụ na mụ ekwuo okwu, ihe mgbu m adịghị akwụsị,+ Ọ bụrụkwa na mụ ekwughị okwu, gịnị ka ọ na-ewepụ m n’ahụ́?   Ma o mewo ka ike gwụ m;+ O bibiwo ndị niile mụ na ha na-ezukọta.   I jichiwo m. Ọ ghọwokwa ihe akaebe,+ Nke mere na ahụ́ m tara na-ebili imegide m. Ọ na-agba akaebe n’ihu m.   Iwe ya adọrisịwo m, o bukwaara m iwe n’obi.+ Ọ na-ata ikikere ezé megide m.+ Onye iro m asawo anya ya mmiri chebiri m.+ 10  Ha emeghepụwo ọnụ ha megide m,+ Ha amawo m ụra iji kọchaa m, Ha agbakọtawo n’ìgwè megide m.+ 11  Chineke enyefewo m n’aka ụmụaka, O jikwa ike tụba m n’aka ndị ajọ omume.+ 12  M tụsaara ahụ́, ma o mere ka m kụja;+ O jidere m n’ekwo wee kụrie m n’ala, O lekwasịwo m anya. 13  Ndị na-agbara ya ụta+ agbawo m gburugburu; Ọ gbapuwo m akụrụ,+ o nweghịkwa ọmịiko; Ọ wụpụwo ihe dị n’akpa ilu m n’ala. 14  Ọ na-etipusị m dị ka mgbidi; Ọ na-eji ọsọ abịakwasị m dị ka dike.+ 15  Adụkọtawo m ákwà iru uju+ wee jiri ya kpuchie akpụkpọ ahụ́ m, Asọwokwa m mpi m n’ájá.+ 16  Ihu m na-achazi ọbara ọbara n’ihi ákwá m na-akwa,+ Oké ọchịchịrị agbachiwokwa mbubere anya m,+ 17  Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’ọbụ aka m, Ekpere m dịkwa ọcha.+ 18  Ala, ekpuchila ọbara m!+ Ka ákwá m gharakwa inwe ebe ọ ga-akwụsị! 19  Ugbu a, lee! n’eluigwe ka onye na-agba akaebe banyere m nọ, Onye akaebe m nọkwa n’ebe dị n’elu.+ 20  Ndị enyi m bụ ọnụ na-ekwugide m;+ Ọ bụ Chineke ka m lekwasịworo anya n’ehighị ụra.+ 21  A ga-ekpebi ikpe n’etiti mmadụ na Chineke, Dị ka e si ekpebi ikpe n’etiti mmadụ na ibe ya.+ 22  N’ihi na ọ bụ naanị afọ ole na ole fọrọ, Ọ bụkwa n’ụzọ m na-agaghị esi lọghachi ka m ga-esi pụọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji