Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 15:1-35

15  Elifaz onye Timan wee zaa, sị:   “Onye maara ihe ọ̀ ga-eji ihe ọmụma na-enweghị isi na-asa okwu,+ Ka ọ̀ ga-eme ka ime afọ ya jupụta n’ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ?+   Ịba naanị mba agaghị aba uru ọ bụla, Okwu ọnụ efu enweghịkwa uru ọ ga-aba.   Otú ọ dị, gị onwe gị na-eme ka ịtụ egwu Chineke ghọọ ihe efu, Ị na-emekwa ka ịtụgharị uche banyere Chineke ghara inwe ihe ọ bụ.   N’ihi na njehie gị na-akụziri ọnụ gị ihe, Ọ bụkwa ire ndị aghụghọ ka ị họọrọ.   Ọnụ gị na-akpọ gị onye ajọ omume, ọ bụghị m; Egbugbere ọnụ gị na-emegide gị.+   Ọ̀ bụ gị bụ mmadụ mbụ a mụrụ,+ Ka è tinyere oké mgbalị mụọ gị tupu a mụọ ugwu?+   Ị̀ na-anụ okwu nzuzo nke Chineke,+ Ka ì chere na ọ bụ naanị gị nwere amamihe?   Gịnịdị ka ị ma nke anyị na-amaghị?+ Gịnị ka ị ghọtara nke anyị na-aghọtaghị? 10  Onye isi awọ́ na onye agadi nọ n’etiti anyị,+ Bụ́ ndị dịworo ogologo ndụ karịa nna gị. 11  Ngụgụ obi Chineke ó zughịrị gị, Ma ọ bụkwanụ okwu e ji nwayọọ gwa gị? 12  Gịnị mere obi gị ji arafu gị, Gịnịkwa mere i ji na-achakasị anya? 13  N’ihi na ị na-eme ka mmụọ gị megide Chineke, I mewokwa ka okwu si n’ọnụ gị na-apụta. 14  Gịnị ka mmadụ efu bụ nke mere ọ ga-eji dị ọcha?+ Ma ọ bụ onye ọ bụla nwaanyị mụrụ nke mere ọ ga-eji bụrụ onye ziri ezi? 15  Lee! Ọ tụkwasịghị ndị nsọ ya obi,+ Eluigwe adịghịkwa ọcha n’anya ya,+ 16  Ma ya fọdụzie mgbe mmadụ bụ onye a na-asọ oyi, bụrụkwa onye rụrụ arụ,+ Onye na-aṅụ ajọ omume dị ka mmiri! 17  M ga-agwa gị ya. Gee m ntị!+ Ahụwo m nke a, ya mere, ka m kọọ ya, 18  Ya bụ, ihe ndị maara ihe+ na-akọ, Nke ha na-ezoghịkwa ezo, ebe o si n’ọnụ ndị nna ha. 19  Ọ bụ naanị ha ka e nyere ala, Ọ dịghị onye bịara abịa nke si n’etiti ha gafere. 20  Onye ajọ omume na-ata ahụhụ ụbọchị ndụ ya niile, Otú ahụ ka ọ dịkwa ọbụna onye na-achị n’aka ike n’afọ niile dịịrị ya. 21  O ji ntị ya anụ ụda ihe na-emenye ụjọ; N’oge udo, onye na-ebukọrọ ihe mmadụ na-awakpo ya.+ 22  O kwetaghị na ya ga-esi n’ọchịchịrị pụtaghachi,+ Ọ ga-alakwa ná mma agha. 23  Ọ na-awagharị na-achọ ihe oriri—ọ̀ dịkwanụ ebee?+ Ọ maara nke ọma na ụbọchị ọchịchịrị+ ga-agbachibido ya dị nso. 24  Ahụhụ na nhụjuanya na-emenye ya ụjọ;+ Ha na-abịakwasị ya dị ka eze nke dị njikere ibu agha. 25  N’ihi na ọ na-esetị aka ya megide Chineke, Ọ na-anwakwa igosi na ya ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ike;+ 26  N’ihi na o ji ikwesi olu ike na-emegide ya, Buru ọta dị ikputu; 27  N’ihi na o ji abụba kpuchie ihu ya, Maakwa abụba n’úkwù ya,+ 28  O bi n’obodo ndị a ga-ekpochapụ ekpochapụ; N’ụlọ ndị mmadụ na-agaghị ebigide na ha, Bụ́ ndị a kara aka na ha ga-aghọ ikpo nkume. 29  Ọ gaghị aba ọgaranya, akụ̀ ya agaghịkwa amụba, Ọ gaghịkwa eme ka ihe ndị ha nwetara gbasaa n’elu ụwa.+ 30  Ọ gaghị esi n’ọchịchịrị wezụga onwe ya; Ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ, Ikuku nke si Chineke n’ọnụ ga-ala ya n’iyi.+ 31  Ya atụkwasịla obi n’ihe efu, e wee duhie ya, N’ihi na ọ bụ naanị ihe efu ka ọ ga-enweta dị ka ụgwọ ọrụ; 32  Ọ ga-emezu tupu ụbọchị ndụ ya agwụ. Alaka ya agaghịkwa ama pokopoko.+ 33  Dị ka osisi vaịn, mkpụrụ ya na-achaghị acha ga-adapụsị, Dịkwa ka osisi oliv, ifuru ya ga-adasịsị. 34  N’ihi na nzukọ nke ndị si n’ezi ofufe dapụ tọgbọrọ n’efu,+ Ọkụ ga-eripịakwa ụlọikwuu nke iri ngarị.+ 35  Nsogbu ka ha na-atụrụ ime ya, na-amụpụtakwa ihe ọjọọ,+ Afọ ha na-akwadebekwa aghụghọ.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji