Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 14:1-22

14  “Mmadụ nke nwaanyị mụrụ,+ Ndụ ya na-adị mkpụmkpụ,+ jupụtakwa ná nsogbu.+   Ọ pụtawo dị ka okooko osisi, e wee bipụ ya,+ Ọ na-agafekwa ọsọ ọsọ dị ka onyinyo,+ ọ naghịkwa adịgide.   Ee, i meghewo anya lekwasị onye a, I mewo ka mụ na gị baa n’ikpe.+   Ọ̀ dị onye na-adịghị ọcha nke pụrụ ịmụ onye dị ọcha?+ Ọ dịghị.   Ọ bụrụ na e kpebiwo ụbọchị ole ọ ga-adị ndụ,+ Ọnwa ole ọ ga-adị ndụ dị gị n’aka; Ị kpaworo ya ókè ka ọ ghara ịgabiga ya.   Wepụ anya n’ebe ọ nọ ka o zuru ike,+ Ruo mgbe ụbọchị ya ga-atọ ya ụtọ otú o si atọ onye ọrụ e goro ego.   N’ihi na ọbụna osisi nwere olileanya. Ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epulite ọzọ,+ Ọ dịghịkwa mgbe ọ na-agaghị enwe ome.   Ọ bụrụ na mgbọrọgwụ ya emee ochie n’ime ala, Ọ bụrụkwa na úkwù ya anwụọ n’ime ájá,   Mgbe mmiri metụrụ ya, ọ ga-epulite,+ Ọ ga-awakwa alaka dị ka osisi pulitere ọhụrụ.+ 10  Ma dimkpa na-anwụ wee tọgbọrọ dị ka onye e meriri emeri; Mmadụ na-ekubi ume, ma olee ebe ọ nọ?+ 11  Mmiri na-ata n’oké osimiri, Mmiri na-asọpụcha n’osimiri, o wee takọọ.+ 12  Mmadụ na-edina ala, ma ghara ibili.+ Ha agaghị ebili ruo mgbe eluigwe na-agakwaghị adị,+ A gaghịkwa akpọte ha n’ụra.+ 13  A sị nnọọ na ị ga-ezobe m na Shiol,+ Na ị ga-ezobe m ruo mgbe iwe gị dajụrụ, Na ị ga-ekpebi oge m ga-anọru,+ i wee cheta m!+ 14  Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ pụrụ ịdị ndụ ọzọ?+ M ga-echere ruo ogologo oge niile a manyere m ichere,*+ Ruo mgbe a ga-eme ka m nwere onwe m.+ 15  Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa gị.+ N’ihi na agụụ ọrụ aka gị ga-agụsi gị ike. 16  Ma ugbu a, ị na-agụ nzọụkwụ m ọnụ;+ Ọ dịghị ihe ọzọ ị na-ele anya ya ma ọ́ bụghị mmehie m.+ 17  E kechiwo nnupụisi m n’akpa,+ I jikwa mgbá nyagide mmehie m. 18  Otú ọ dị, ugwu ga-ada, ọ gaghị adịkwa, A ga-ebupụkwa ọbụna oké nkume n’ebe ọ dịbu. 19  Mmiri na-erichasị ọbụna nkume; Idei ya na-asachapụ ájá dị n’ala. Otú ahụ ka i bibiworo olileanya nke mmadụ efu. 20  Ị na-emeri ya ruo mgbe ebighị ebi, o wee ghara ịnọkwa;+ Ị na-eme ka ihu ya gbanwee, i wee zipụ ya. 21  A na-akwanyere ụmụ ya ùgwù, ma ọ dịghị ama;+ Ha na-aghọ ndị a na-ejighị kpọrọ ihe, ma ọ dịghị echebara ha echiche. 22  Ọ bụ naanị na anụ ahụ́ ya ga na-egbu ya mgbu mgbe ọ ka kpuchiri ya, Mkpụrụ obi ya ga na-erukwa uju mgbe ọ ka dị n’ime ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Job 14:14*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ ‘ịrụ ọrụ.’