Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 41:1-18

41  O wee ruo n’ọnwa nke asaa na Ishmel,+ nwa Netanaya nwa Elishama,+ onye si n’ezinụlọ eze+ na otu n’ime ndị isi na-ejere eze ozi, bịakwutere Gedalaya nwa Ahaịkam n’obodo Mizpa,+ ya na ndị agha iri ọzọ.+ Ha wee rikọta nri ọnụ n’ebe ahụ na Mizpa.+  Ishmel nwa Netanaya na ndị ikom iri ahụ ya na ha so wee bilie jiri mma agha gbuo Gedalaya nwa Ahaịkam nwa Shefan.+ O wee gbuo onye eze Babịlọn mere onyeisi ala.+  Ishmel gbukwara ndị Juu niile ya na ha nọ, ya bụ, ndị ha na Gedalaya nọ na Mizpa, tinyere ndị Kaldia nọ n’ebe ahụ, ya bụ, ndị agha.  O wee ruo n’ụbọchị nke abụọ mgbe e gbusịrị Gedalaya, mgbe ọ na-adịghị onye ọ bụla maara banyere ya,+  na e nwere ndị ikom si Shikem,+ Shaịlo+ na Sameria+ bịa, ndị ikom iri asatọ ndị kpụchara ajị agba ha,+ dọwaakwa uwe mwụda ha ma bekasịa onwe ha ahụ́,+ ha ji àjà ọka* na frankinsens+ na-abịa n’ụlọ Jehova.  Ishmel nwa Netanaya wee si na Mizpa gawa izute ha, kwara ákwá na-aga.+ O wee ruo na ozugbo o zutere ha, ọ sịrị ha: “Bịanụ hụ Gedalaya nwa Ahaịkam.”  O wee ruo na ozugbo ha batara n’ime obodo ahụ, Ishmel nwa Netanaya na ndị agha ya na ha nọ gburu ha, tụba ha n’ime olulu mmiri.+  Ma, e nwere ndị ikom iri n’ime ha ndị gwara Ishmel ozugbo, sị: “Egbula anyị, n’ihi na e nwere nri anyị zoro n’ọhịa, bụ́ ọka wit na ọka bali na mmanụ na mmanụ aṅụ.”+ O wee hapụ ha, o gbukọtaghị ha na ụmụnne ha.  Olulu mmiri ahụ Ishmel+ tụbara ozu ndị ikom ahụ niile o gburu bụ nnukwu olulu, nke ahụ Eze Esa gwuru n’ihi Beasha eze Izrel.+ Ọ bụ ya bụ olulu mmiri Ishmel nwa Netanaya tụjuru ndị ahụ o gburu. 10  Ishmel wee dọrọ ndị niile fọdụrụnụ bụ́ ndị nọ na Mizpa n’agha,+ bụ́ ụmụ nwaanyị eze mụrụ+ na ndị niile fọdụrụ na Mizpa,+ ndị Nebuzaradan bụ́ onyeisi ndị nche nyefere n’aka Gedalaya nwa Ahaịkam ka o lekọtawa.+ Ishmel nwa Netanaya wee dọrọ ha n’agha gawa ka ọ gakwuru ụmụ Amọn.+ 11  Ka oge na-aga, Johenan+ nwa Kariya na ndị ọchịagha niile+ ya na ha nọ nụrụ ihe ọjọọ niile Ishmel nwa Netanaya mere. 12  Ha wee kpọrọ ndị ikom niile gawa ibuso Ishmel nwa Netanaya agha, ha wee hụ ya n’ebe e nwere nnukwu mmiri na Gibiọn.+ 13  O wee ruo na ozugbo ndị ahụ niile Ishmel chị hụrụ Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile ya na ha so, ha malitere ịṅụrị ọṅụ. 14  Ndị niile ahụ Ishmel dọọrọ n’agha na Mizpa+ wee tụgharịa gakwuru Johenan nwa Kariya. 15  Ma Ishmel nwa Netanaya na ndị ikom asatọ hụrụ Johenan gbaa ọsọ,+ ka ha wee gbakwuru ụmụ Amọn. 16  Johenan+ nwa Kariya na ndị ọchịagha niile ahụ ya na ha nọ wee kpọrọ ndị niile ahụ fọdụrụnụ si Mizpa, bụ́ ndị ha napụtara n’aka Ishmel nwa Netanaya, mgbe o gbusịrị Gedalaya+ nwa Ahaịkam, ya bụ, ndị dimkpa, ndị agha, na ndị nwunye ha na ụmụntakịrị ha na ndị na-eje ozi n’obí eze, bụ́ ndị o si Gibiọn kpọghachite. 17  Ha wee gaa nọrọ n’ebe ihi ụra nke Kimham nke dị n’akụkụ Betlehem,+ ka ha wee si ebe ahụ banye n’Ijipt,+ 18  n’ihi ndị Kaldia;+ n’ihi na egwu tụwara ha n’ihi ha,+ ebe ọ bụ na Ishmel nwa Netanaya gburu Gedalaya nwa Ahaịkam,+ bụ́ onye eze Babịlọn mere onyeisi ala ahụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.