Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 29:1-32

29  Ihe ndị a bụ ihe dị n’akwụkwọ ozi Jeremaya onye amụma si na Jeruselem zigara ndị okenye fọdụrụ n’ime ndị a dọọrọ n’agha na ndị nchụàjà na ndị amụma nakwa mmadụ niile, bụ́ ndị Nebukadneza si na Jeruselem dọrọ n’agha laa Babịlọn,+  mgbe Jekonaya+ bụ́ eze si na Jeruselem pụọ, ya na nwunye eze+ na ndị na-eje ozi n’obí eze, ndị isi Juda na Jeruselem,+ na ndị omenkà na ndị na-ewu mgbidi siri ike.+  Ọ bụ Elesa nwa Shefan+ na Gemaraya nwa Hilkaya, bụ́ ndị Zedekaya+ eze Juda zipụrụ Babịlọn ka ha gakwuru Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn, ka o nyere akwụkwọ ozi ahụ, nke na-asị:  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, gwara ndị niile a dọọrọ n’agha, bụ́ ndị m mere ka e si na Jeruselem dọrọ n’agha+ laa Babịlọn,  ‘Wuonụ ụlọ, biri n’ime ha, kọọnụ ubi, rie mkpụrụ ha.+  Lụọnụ ndị inyom, mụọkwanụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom;+ lụtakwaranụ ụmụ unu ndị ikom ụmụ nwaanyị, keekwanụ ụmụ unu ndị inyom di, ka ha wee mụọ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom; mụbaanụ n’ebe ahụ, unu adịkwala ole na ole.  Chọọkwanụ udo nke obodo ahụ m mere ka a dọrọ unu n’agha laa na ya, kpekuokwanụ Jehova ekpere maka ya, n’ihi na ọ bụrụ na udo adị na ya, udo ga-adịrị unu onwe unu.+  N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Unu ekwela ka ndị amụma unu bụ́ ndị nọ n’etiti unu nakwa ndị na-agbara unu afa duhie unu,+ unu egekwala ntị ná nrọ ha na-arọ.+  N’ihi na ‘ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu n’aha m. Ọ bụghị m dunyere ha,’+ ka Jehova kwuru.”’” 10  “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘M ga-elebara unu anya mgbe afọ iri asaa zuru na Babịlọn,+ m ga-eme ka okwu dị mma m kwuru mezuo n’isi unu site n’ịkpọlata unu ebe a.’+ 11  “‘N’ihi na mụ onwe m maara nke ọma ihe m na-echere unu,’+ ka Jehova kwuru, ‘echiche udo, ọ bụghị nke ọdachi,+ ime ka unu nwee ọdịnihu na olileanya.+ 12  Unu ga-akpọku m, bịakwa kpekuo m ekpere, m ga-egekwa unu ntị.’+ 13  “‘Unu ga-achọ m wee chọta m,+ n’ihi na unu ga-eji obi unu dum chọọ m.+ 14  M ga-ekwe ka unu chọta m,’+ ka Jehova kwuru. ‘M ga-akpọkọta ndị unu a dọọrọ n’agha, sikwa ná mba niile na ebe niile m chụsasịrị unu kpọkọta unu,’+ ka Jehova kwuru. ‘M ga-akpọlatakwa unu n’ebe m mere ka e si dọrọ unu n’agha.’+ 15  “Ma unu asịwo, ‘Jehova enyewo anyị ndị amụma na Babịlọn.’ 16  “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova gwara eze nke nọ n’ocheeze Devid+ nakwa ndị niile bi n’obodo a, bụ́ ụmụnne unu ndị a na-adọrọghị unu na ha n’agha,+ 17  ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Lee, m ga-ezigara ha mma agha,+ ụnwụ+ na ọrịa na-efe efe,+ m ga-emekwa ka ha dị ka mkpụrụ osisi fig gbawara agbawa nke a na-apụghị iri eri n’ihi otú o si mebie emebi.”’+ 18  “‘M ga-eji mma agha, ụnwụ, na ọrịa na-efe efe na-achụ ha ọsọ, m ga-eme ka ha ghọọrọ alaeze niile nke ụwa ihe na-akpata ịma jijiji,+ mee ka ha ghọọ ihe a bụrụ ọnụ na ihe ijuanya na ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị na ihe nkọcha n’etiti mba niile m ga-achụga ha,+ 19  n’ihi na ha egeghị ntị n’okwu m,’ ka Jehova kwuru, ‘bụ́ nke m gwara ha site n’ọnụ ndị ohu m bụ́ ndị amụma m, na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezite ha.’+ “‘Ma unu egeghị ntị,’+ ka Jehova kwuru. 20  “Nụrụnụ okwu Jehova, unu niile ndị a dọọrọ n’agha,+ ndị m si na Jeruselem chụga Babịlọn.+ 21  Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru banyere Ehab nwa Kolaya na Zedekaya nwa Measaya, bụ́ ndị na-eburu unu amụma ụgha n’aha m,+ ‘Lee, m ga-enyefe ha n’aka Nebukadreza bụ́ eze Babịlọn, ọ ga-egbukwa ha n’ihu unu.+ 22  Ndị niile e si na Juda dọrọ n’agha laa Babịlọn ga-eji ha na-abụ ọnụ, sị: “Ka Jehova mee ka ị dị ka Zedekaya na Ehab,+ bụ́ ndị eze Babịlọn gbara ọkụ!”+ 23  n’ihi na ha mere ihe nzuzu n’Izrel,+ ha na nwunye ndị enyi ha na-akwakwa iko,+ ha na-ekwu okwu ụgha n’aha m, bụ́ nke m na-enyeghị ha iwu ka ha kwuo.+ “‘“Mụ onwe m maara, abụkwa m onye akaebe,”+ ka Jehova kwuru.’” 24  “Gwa Shemaya+ onye Nehelam, sị, 25  ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Ebe ọ bụ na i zigaara ndị niile nọ na Jeruselem na Zefanaya+ nwa Measaya, bụ́ onye nchụàjà, na ndị nchụàjà niile, akwụkwọ ozi n’aha gị,+ sị, 26  ‘Jehova emewo gị onye nchụàjà ka ị nọchie Jehoyada onye nchụàjà, ka i wee ghọọ nnukwu onye nlekọta nke ụlọ Jehova+ ijide nwoke ọ bụla ara na-agba+ nke na-eme ka onye amụma, ị ga-etinye ya n’ọtọsị;*+ 27  gịnịzi mere na ị babereghị Jeremaya onye Anatọt mba,+ bụ́ onye na-eme ka onye amụma n’ihu unu?+ 28  N’ihi na ọ bụ ya mere o ji zitere anyị ozi na Babịlọn, sị: “Ọ ka dị anya! Wuonụ ụlọ, biri n’ime ha, kọọnụ ubi, rie mkpụrụ ha,+—”’”’” 29  Zefanaya+ onye nchụàjà wee gụọ akwụkwọ ozi a ná ntị Jeremaya onye amụma. 30  Okwu Jehova wee ruo Jeremaya ntị, sị: 31  “Zigara ndị niile a dọọrọ n’agha ozi,+ sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru banyere Shemaya onye Nehelam: “Ebe ọ bụ na Shemaya ebuworo unu amụma, ma ọ bụghị m dunyere ya, ọ gbalịkwara ime ka unu tụkwasị obi n’okwu ụgha,+ 32  ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-elebara Shemaya+ onye Nehelam na ụmụ ya+ anya.’ “‘“‘Ọ dịghị onye si n’ụlọ ya nke ga-ebi n’etiti ndị a;+ ọ gaghịkwa ahụ ihe ọma m ga-emere ndị m,’+ ka Jehova kwuru, ‘n’ihi na o jiriwo oké nnupụisi kwuo okwu megide Jehova.’”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Okwu Hibru a sụgharịrị n’ebe a dị abụọ, o yiri ka otu n’ime ha ọ̀ bụ ‘ọtọsị a na-atụ mmadụ n’ụkwụ,’ nke ọzọ abụrụ ‘ọtọsị a na-atụ mmadụ n’aka nakwa n’olu.’